Na-ele Ndị Ọzọ Ọbịa Ka Ha Nweta “Ihe Ọma” (Mat. 12:35a)
‘Ile ọbịa’ so n’otú anyị si eme ka ndị mmadụ nweta “ihe ọma.” O doro anya na anyị niile chọrọ ịna-ele ọbịa. (Rom 12:13) A gwala ndị okenye ka ha hazie otú a ga-esi na-agbara ụmụnna ndị bịara ikwu okwu n’ọgbakọ ha ụgbọ nakwa otú a ga-esi na-ele ha ọbịa. Ma, anyị nwere ike ghara ile mmadụ ọbịa n’ihi na anyị dara ogbenye ma ọ bụ na anyị chere na ụlọ anyị adịghị mma. Iburu ihe Jizọs gwara Mata n’obi ga-enyere anyị aka ịna-ele ọbịa n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. (Luk 10:39-42) O kwuru na ihe ka mkpa ma anyị lewe ọbịa bụ okwu agbamume na mmekọrịta anyị na-enwe n’oge ahụ, ọ bụghị oké ihe oriri ma ọ bụ ụlọ mara mma. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe a Jizọs kwuru, anyị ga-eme ka ụmụnna anyị nweta “ihe ọma” otú ahụ Baịbụl kwuru.—3 Jọn 5-8.