Gịnị Mere Anyị Ga-eji Gawa n’Egbughị Oge?
Anyị na ụmụnna anyị zukọọ ịga ozi ọma, anyị nwere ike ịchọ ka anyị na ha kpawa nkata. Ma e kechaa ozi ọma, anyị kwesịrị ịgba mbọ gawa n’ókèala anyị ozugbo. Anyị ekwesịghị ịna-eme anya ụrụ ma anyị pụta ozi ọma. (2 Tim. 4:2) Ọ bụrụ na anyị egbuo oge, anyị agaghị enwe oge hiri nne anyị ga-eji zie ozi ọma. Anyị ekwesịghị ịnọrọ otu ebe na-akpa nkata ebe ọ bụ na anyị na ụmụnna anyị ka ga na-agbarịta ibe anyị ume ma anyị nọrọ n’ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị agawa n’ókèala anyị ozugbo e kechara ozi ọma, ọ na-egosi na anyị ejighị ozi anyị na-ejere Jehova na Ọkpara ya egwu egwu.—Rom 12:11.