Otú E Si Eji Akwụkwọ Anyị Ezi Ozi Ọma n’Ebe Na-ekwo Ekwo
N’ebe ụfọdụ na-ekwo ekwo, a na-edosa akwụkwọ anyị n’elu tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị. E sila otú a zie ọtụtụ ndị ozi ọma. (Jọn 6:44) N’ihi ya, a gwala ndị okenye ka ha mee ndokwa ka a na-ezi ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo n’ókèala ha. Ebe ọ bụ na a na-akwagharị ihe ahụ a na-edosa akwụkwọ akwagharị, anyị ekwesịghị ịga nata ndị ọchịchị ike tupu anyị edowe ya. Olee ndị kwesịrị iji akwụkwọ anyị na-anọ n’ụdị ebe ahụ? Ọ bụ ndị nkwusa anya ruru ala, ndị na-eji ejiji dị mma, na ndị ma otú e si ekwu okwu ya eruo mmadụ n’obi. Ka anyị lee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ime na ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo.