Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Ọgọst 1
“Anyị bịara na nke unu ka anyị na gị kwuo otú anyị ga-esi na-edi otu ihe na-enye anyị niile nsogbu. Obi na-agbawa anyị ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ. Gịnị ka i chere ga-agụgụ anyị ma ihe dị otú a mee? [Chere ka ọ zaa.] Ka anyị gụọ nkwa Chineke kwere anyị na Baịbụl nke ga-akasi anyị obi. [Gụọ Mkpughe 21:3, 4.] Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ụlọ Nche a kwuru otú Chineke ga-esi eme ya.”
Teta! Julaị–Ọgọst
“Ịkụziri ụmụaka ka ha na-erube isi n’oge anyị a abụghị obere ọrụ. Ị̀ ma ihe kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gwara anyị ihe mere ụmụaka ji kwesị ịna-erubere nne na nna ha isi. [Gụọ Ilu 29:15.] Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime ka ụmụ ha na-erube isi? Gịnịkwa ka ha na-ekwesịghị ime? A zara ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu dị na peeji nke asatọ na Teta! a. Ihe e kwuru n’isiokwu ahụ ga-enyere ndị nne na nna aka ịzụlite ụmụ ha ka ha baa uru.”