“Okwu Ndị A . . . Ga-adị n’Obi Gị”
Ndị nne na nna yiri ndị ọzụzụ atụrụ. Ha kwesịrị ịna-elekọta ụmụ ha nke ọma. Ma ọ́ bụghị ya, ha nwere ike ịkpafu ma banye ná nsogbu. (Ilu 27:23) Gịnị ka ndị nne na nna ga-eme ka anya ha nwee ike ịna-eru n’ebe ụmụ ha nọ? Ha kwesịrị ịna-ewepụta oge kwa ụbọchị ka ha na ụmụ ha na-anọrị n’ihi na ọ ga-enyere ha aka ịmata ihe dị ha n’obi. (Ilu 20:5) Ihe ọzọ ndị nne na nna ga na-eme bụ ịkụziri ụmụ ha Okwu Chineke ka okwukwe ha sie ezigbo ike. (1 Kọr. 3:10-15) Vidio bụ́ “Okwu Ndị A . . . Ga-adị n’Obi Gị” gosiri uru inwechi ofufe ezinụlọ anya bara. Ọ ga-adị mma ka ezinụlọ ọ bụla kirie ya. Ha kirichaa ya, ha atụlee ajụjụ ndị a:
(1) Gịnị mere Nwanna Romanus na ndị ezinụlọ ya ji na-ala azụ n’ofufe Chineke? (2) Gịnị mere mbọ ọ gbara ka ha maliteghachi inwe ofufe ezinụlọ ji kụọ afọ n’ala? (3) Olee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma? (Diut. 6:6, 7) (4) Olee ihe ndị nwere ike inyere mmadụ niile nọ́ n’ezinụlọ aka ịna-ekwurịta okwu nke ọma? (5) Gịnị ka ụmụaka kacha achọ ka nne ha na nna ha na-emere ha? (6) Olee otú Nwanna Martin na nwunye ya si nyere Nwanna Romanus na ezinụlọ ya aka? (Ilu 27:17) (7) Gịnị ka onyeisi ezinụlọ ọ bụla kwesịrị ime tupu ha enwewe ofufe ezinụlọ ka onye ọ bụla nwee ike ịmụta ihe na ya? (8) Gịnị ka Nwanna Romanus mere ka ihe dị mma n’ezinụlọ ya? (9) Gịnị mere inwechi ofufe ezinụlọ anya ji dị mma? (Efe. 6:4) (10) Olee ihe ndị e nwere ike ịmụ n’ofufe ezinụlọ? (11) Olee otú Nwanna Romanus si jide onwe ya, gharakwa ime ọnụ mmiri mmiri mgbe ọ na-enyere Marcus aka ịghọta uru dị n’ime ihe dị mma? (Jere. 17:9) (12) Olee otú Nwanna Romanus na nwunye ya si nyere nwa ha nwaanyị aka ka ọ ghọta na ya na Justin ekwesịghị ịna-akpa? (Mak 12:30; 2 Tim. 2:22) (13) Olee otú Nwanna Romanus na nwunye ya si gosi na ha nwere okwukwe na Jehova n’otú ha si kpebie iselatatụ aka n’ịchụ akụnụba? (Mat. 6:33) (14) Olee otú vidio a si gosi na ndị isi ezinụlọ kwesịrị ịna-akụziri ndị ezinụlọ ha gbasara Chineke? (1 Tim. 5:8) (15) Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, gịnị ka i kpebiri ime ugbu a?
OKWU A NA-AGWA NDỊ ISI EZINỤLỌ: Ihe dị na vidio a bụ ihe nkiri e gosiri ná mgbakọ ukwu e nwere n’afọ 2011. Mgbe e mechara ya n’afọ ahụ, è nwere ihe ụfọdụ ị mụtara ị ga-eme ka ofufe ezinụlọ unu dịkwuo mma? Ihe ọ̀ katụla mma ugbu a? Ọ bụrụ na a ka nwere ebe i chere unu na-anaghị eme nke ọma, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhazi ihe ụfọdụ n’ezinụlọ unu ka gị na ndị ezinụlọ gị na-efe ya nke ọma.—Efe. 5:15-17.