Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 24
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 24
Abụ nke 21 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 29 ¶11-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 5-8 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ndị Eze 6:20-31 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Dị n’Akwụkwọ Dị Iche Iche E Nwere na Baịbụl?—igw p. 30 (Nkeji 5)
Nke 3: Na-akpa Ezi Àgwà Ka Jehova na Jizọs (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Mụ onwe m na ezinụlọ m ga-efe Jehova.’—Jọsh. 24:15.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Septemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, ụmụnna ekwuo ihe ha mụtara n’ihe ngosi nke ọ bụla.
Nkeji 10: Otú Anyị Ga-esi Na-amụtakwu Ihe n’Ofufe Ezinụlọ Anyị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ozi Alaeze Anyị nke Jenụwarị 2011, peeji nke isii. Kwuo gbasara ihe ndị dị na jw.org/ig, ndị anyị nwere ike iji nwee ofufe ezinụlọ. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịakwa ebe e dere ỤMỤAKA ka ị hụ ụfọdụ n’ime ha.) Kwuokwa na isiokwu ezinụlọ ọ bụla ga-atụle n’ofufe ezinụlọ kwesịrị ịbụ nke ga-abara ha uru nakwa nke ga-eme ka okwukwe ha nwere na Jehova ga-emezu nkwa ya sikwuo ike.
Abụ nke 130 na Ekpere