Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Septemba 1
“Ị̀ ma ebe Ndịàmà Jehova si nweta aha a ha na-aza? [Chere ka ọ zaa.] Ọ dị na Baịbụl. N’ebe ahụ, Chineke mere ka a mata ihe bụ́ aha ya. [Gụọ Abụ Ọma 83:18.] Anyị na-aza Ndịàmà Jehova n’ihi na anyị na-agwa ndị mmadụ gbasara Jehova na ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu ihe dị iche iche gbasara Ndịàmà Jehova, ma Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịma nke bụ́ eziokwu.”
Teta! Septemba–Ọktoba
“Otú ihe si dịrị ọtụtụ ndị taa na-echu ha ụra. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na otú obi dị anyị mgbe nsogbu bịara anyị nwere ike inyere anyị aka idi ya. [Gụọ Ilu 24:10.] Teta! a kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ọ kọkwara ihe na-enyere ụfọdụ ndị aka ịna-edi nsogbu ndị ha nwere.”