Jiri Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Bible Na-akụzi Na-enyere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Aka
Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ Baịbụl na-eme ihe ndị ọ na-amụta, ọ ga-abara ya uru. (Ọma 1:1-3) Ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ma anyị jiri ihe ndị dị n’ime akwụkwọ Bible Na-akụzi na-enyere ha aka.
Ajụjụ Ndị Dị ná Mmalite Isiokwu: Isiokwu nke ọ bụla nwere ajụjụ ndị a na-eji amalite ya. A zakwara ajụjụ ndị ahụ n’ime ya. I nwere ike ịgụpụta ajụjụ ndị ahụ ka onye ị na-amụrụ Baịbụl buru ha n’uche. I nwekwara ike inye ya ohere ka o kwutụ uche ya na nke ọ bụla n’ime ha. Ọ bụrụgodị na ọ zataghị ha, ejila oge ahụ gwawa ya azịza ha. Ihe ọ bụla ọ zara ga-enyere gị aka ịmara ihe ndị ị ga-emekwu ka ha doo ya anya ka unu na-amụ isiokwu ahụ.—Ilu 16:23; 18:13.
Ihe Odide Ntụkwasị: Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl kwetara ihe e kwuru n’isiokwu unu mụrụ, i nwere ike ịgwa ya ka ọ gaa n’ebe e dere “Ihe Odide Ntụkwasị” gụkwuo ihe gbasara isiokwu ahụ n’onwe ya. Ị bịa na nke ya ụbọchị ọzọ, i nwere ike iji nkeji ole na ole mara ma ọ̀ ghọtakwara ihe ọ gụrụ. Ma, ị chọpụta na ọ ga-aka abara ya uru ma gị na ya mụọ ya, unu nwere ike ịmụcha ya ma ọ bụkwanụ gị ahọrọ paragraf ụfọdụ dị na ya. A gụpụta paragraf nke ọ bụla gị ajụọ ya ajụjụ. I kwesịkwara ịkwado ajụjụ ndị ahụ tupu ị gaa na nke ya.
Ntụleghachi: E nwere igbe dị ná ngwụcha isiokwu nke ọ bụla. Ihe dị na ya bụ ihe zara ajụjụ ndị ahụ dị ná mmalite isiokwu ahụ. I nwere ike iji ihe dị n’igbe a mara ma onye ị na-amụrụ Baịbụl ọ̀ ghọtakwara ihe unu mụrụ n’isiokwu ahụ. Gụpụtanụ ahịrịokwu nke ọ bụla, gụọkwanụ amaokwu Baịbụl ya na ya so. Gwazie onye ahụ ka o jiri ihe dị n’amaokwu ahụ kọwaa ihe ahụ unu gụrụ n’ahịrịokwu ahụ.—Ọrụ 17:2, 3.