Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb17 Ọktoba p. 7
  • Jiri Ndụ Gị Niile Na-eto Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ndụ Gị Niile Na-eto Jehova
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ịpịazi Ego n’Ihi Ego Kraịst E Ji Mee Ihe
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ka Obi Na-atọ Gị Ụtọ n’Ihe Ndị I Nwere Ike Imere Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ilu nke Talent
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
mwb17 Ọktoba p. 7

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Ndụ Gị Niile Na-eto Jehova

Ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị. Ihe anyị ji onyinye a o nyere anyị eme kwa ụbọchị na-egosi ma ànyị jikwa ya kpọrọ ihe. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-agbasi mbọ ike iji ike anyị na nkà anyị na-eto Jehova bụ́ isi iyi nke ndụ. (Ọma 36:9; Mkpu. 4:11) Ma, nchegbu nke ụwa ọjọọ a nwere ike ime ka ihe ndị gbasara ofufe Chineke nyụwazie ka ọkụ. (Mak 4:​18, 19) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eji ike m niile e jere Jehova ozi? (Hos. 14:⁠2) Ọrụ m ọ̀ na-akpa ofufe m na-efe Chineke aka ọjọọ? Olee ihe ndị m chọrọ iji ndụ m mee n’ozi Jehova? Olee otú m nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?’ Ọ bụrụ na ị hụ ebe ọ dị mkpa ka i mezikwuo ihe, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ime mgbanwe ndị dị mkpa. N’eziokwu, ito Jehova ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju.​—⁠Ọma 61:⁠8.

Ebe Edgardo Franco nọ na-akụ egwú n’ihu ìgwè mmadụ; na ebe Edgardo Franco nọ n’ozi ọma

Ònye ka ị na-eji nkà ndị i nwere ejere ozi?

LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI NKÀ I NWERE JEERE JEHOVA OZI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere ọ ji bụrụ ihe nzuzu mmadụ iji nkà ya na-ejere ụwa Setan ozi? (1 Jọn 2:17)

  • Olee ngọzi ndị na-eji ike ha niile ejere Jehova ozi na-enweta?

  • Olee ebe ndị ị ga-achọ iji nkà ndị i nwere jekwuoro Jehova ozi?

IHE NDỊ UNU NWERE IKE IME N’OFUFE EZINỤLỌ UNU:

  • Gbaa otu onye nkwusa nọterela aka n’ọgbakọ ajụjụ ọnụ. O nwere ike ịbụ onye nọ n’ozi oge niile. Olee ihe ndị ọ hapụrụ iji nwee ike iji ike ya niile na-efe Jehova? Olee otú Jehova sirila gọzie ya?

  • Gaa na Tiivi Ndịàmà Jehova, pịa ebe e dere AJỤJỤ ỌNỤ, ka unu hụ ihe ụmụnna ndị jirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi kwuru gbasara obi ụtọ ndị ha na-eweta n’ijere Jehova ozi n’ụzọ dị iche iche

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya