OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ihe Ị Na-amụ Bakwuoro Gị Uru
IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke n’onwe anyị, ọ ga-enyere anyị aka ‘ịghọta ihe bụ́ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi’ nke eziokwu Chineke. (Efe. 3:18) Ọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-abụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta, ndị na-enweghị mmerụ n’ụwa ọjọọ a, na ndị “na-ejidesi okwu nke ndụ ike.” (Fil. 2:15, 16) Ọ na-enyekwa onye ọ bụla n’ime anyị ohere ịhọrọ ihe ọ chọrọ ịmụ. Olee otú ị ga-esi mee ka ọmụmụ ihe gị bakwuoro gị uru?
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
Katụ ihe ma ọ bụ detuo ihe ụfọdụ na Baịbụl gị ma ọ̀ bụ nke akwụkwọ ma ọ̀ bụ nke dị n’ekwentị
Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a gbasara ihe ị na-agụ na Baịbụl: ‘Ònye ka a na-ekwu banyere ya? Gịnị ka a na-ekwu? Olee mgbe ihe a mere? Olee ebe ihe a mere? Gịnị mere ihe a ji mee? Olee otú o si mee?’
Chọpụta ihe ndị gbara ihe ị na-agụ gburugburu. Jiri ihe ndị e ji eme nchọnchọ matakwuo banyere ihe ị na-agụ. I mepee ihe i ji eme nchọnchọ, i nwere ike idenye amaokwu Baịbụl ma ọ bụ okwu ị na-agụ banyere ya
Tụgharịa uche n’ihe ị gụrụ iji mata otú o si gbasa gị
Na-eme ihe ị na-amụta kwa ụbọchị ná ndụ gị.—Luk 6:47, 48
LEE VIDIO BỤ́ NA-AMỤ IHE NKE ỌMA MA SI OTÚ AHỤ JIDESIE OKWU NKE NDỤ IKE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ụfọdụ ndị kwuru gbasara ịmụ ihe?
Gịnị mere anyị ji kwesị ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịmụ ihe?
Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịghọta amaokwu Baịbụl anyị gụrụ nke ọma?
Olee ụdị ụcha ndị anyị nwere ike iji tejie ihe na Baịbụl anyị ji amụ ihe?
Gịnị mere ịtụgharị uche ji dị ezigbo mkpa mgbe anyị na-amụ Okwu Chineke?
Gịnị ka anyị kwesịrị iji ihe anyị mụtara mee?
“Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.”—Ọma 119:97