AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ HIBRU 12-13
Ịdọ Aka ná Ntị Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
Ịdọ aka ná ntị pụtara ịgbazi mmadụ, ịbara ya mba, inye ntụziaka na ịkụziri mmadụ ihe. Otú ahụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya si adọ ụmụ ya aka ná ntị ka Jehova si adọ anyị aka ná ntị. Anyị na-enweta ịdọ aka ná ntị ma . . .
Anyị na-agụ Baịbụl, na-amụ ihe, na-aga ọmụmụ ihe ma na-atụgharị uche
Onye Kraịst ibe anyị nye anyị ndụmọdụ ma ọ bụ gbazie anyị
Anyị taa ahụhụ ihe anyị mejọrọ
A dọọ anyị aka ná ntị n’ọgbakọ ma ọ bụ chụọ anyị n’ọgbakọ
Ọnwụnwa na mkpagbu ndị Jehova kwere bịara anyị.—w15 9/15 21 ¶13; it-1 629