AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 17-18
Ndị Dị Umeala n’Obi Na-azụ Ndị Ọzọ ma Na-enye Ha Ọrụ
Ụmụnna nwoke ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na-azụ ndị na-eto eto, na-enyekwa ha ọrụ ha ga na-arụ. Ihe a ha na-eme na-egosi na ha ma ebe ike ha ruru, na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya, nakwa na ha na-eche maka ọdịmma ọgbakọ Jehova n’ọdịnihu. Olee otú i nwere ike isi mee ụdị ihe a?
Chọpụta ndị nwere ike ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ n’ozi Jehova
Kọwaara ha hoo haa otú ha ga-esi arụ ọrụ a chọrọ ka ha rụọ
Nye ha ego, ngwá ọrụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ha mkpa iji rụọ ọrụ ahụ
Na-achọpụta otú ha si arụ ọrụ i nyere ha, na-agwakwa ha na obi siri gị ike na ha ga-arụli ya
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ọrụ ndị m nwere ike inye ndị ọzọ ka ha rụọ?’