Ndị Okenye—Na-ekenyenụ Ọrụ!
ỌBỤ nwoke nwere ndidi, dị umeala n’obi, nwee echiche dị nkọ nke ikpe ziri ezi, bụ́ nke e ji ahụmahụ ndị o nweworo ná ndụ tụgwaa. Otú a, ihe karịrị nde atọ nke ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị ji ntụkwasị obi lega anya n’ebe ọ nọ maka inweta ndụmọdụ. Ọ gbalịrị ịghara imechu ha ihu. Site n’ụtụtụ ruo n’uhuruchi, o gere ntị ná nsogbu ha ma jiri ndidi nyere ha aka ịhụ otú iwu dị iche iche nke Chineke si metụta ọnọdụ ha. Ee, ruo nwa oge nta, ihe dị ka 3,500 afọ gara aga, otu nwoke—Mosis—kpere ebo 12 nke Israel ikpe nanị ya.
Otú ọ dị, o metụrụ Jetro, bụ́ ọgọ Mosis, n’obi. Olee nnọọ otú Mosis si chee na ya ga-enwe ike irutezu ihe a chọrọ? Ya mere Jetro kwuru, sị: “Ọ dịghị mma, bụ́ ihe gị onwe gị na-eme. Ị ghaghị ịkpọnwụ akpọnwụ dị ka akwụkwọ, ma gị onwe gị ma ndị nke a gị na ha nọ: n’ihi na ọ dị arọ karị gị, bụ́ ihe a; ị pụghị ime ya nanị gị iche.” (Ọpụpụ 18:17, 18) Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Jetro tụụrụ Mosis aro ka o na-ekenye ndị ọzọ ụfọdụ n’ime ibu ọrụ ndị o nwere. (Ọpụpụ 18:19-23) Nke ahụ bụ aro dị mma!
N’ime ọgbakọ ndị Kraịst taa, e nwere ọtụtụ ndị okenye bụ́ ndị, dị ka Mosis, na-agbalị ilekọta ihe karịrị ihe ha pụrụ ịrụzu nanị ha. Ha na-ahazi nzukọ, kwadebekwa n’otu mgbe ahụ ma mee akụkụ dị iche iche nke usoro ihe omume ahụ n’ụzọ dị n’usoro ma dị irè. (1 Ndị Kọrint 14:26, 33, 40; 1 Timoti 4:13) Ndị okenye na-ahụkwa maka mkpa nke ndị nọ n’ọgbakọ n’otu n’otu. (Ndị Galetia 6:1; 1 Tesalọnaịka 5:14; Jemes 5:14) Ha na-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ kasị mkpa nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. (Matiu 24:14; Ndị Hibru 13:7) Ha na-emekwa ndokwa ka ọgbakọ nwee akwụkwọ dị iche iche maka ikesara ọha mmadụ.
Tụkwasịkwa, a na-ekenye ndị okenye ụfọdụ òkè n’usoro ihe omume nke mgbakọ sekit na mgbakọ distrikti. Ha na-eje ozi ná nhazi nke mgbakọ ma na-ejekwa ozi na kọmitii nke na-ahụ maka inwe ezi mmekọrịta n’etiti ụmụnna na ndị ụlọ ọgwụ. Ụfọdụ na-enye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe ndị a nile bụkwa tụkwasị n’ibu ọrụ ndị ha nwere n’ezinụlọ na mkpa ọ dị ha inye onwe ha nri ime mmụọ. (Tụlee Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 110:3; 1 Timoti 3:4, 5; 4:15, 16.) Olee otú ndị ikom ndị a bụ ndị Kraịst si emezu ha nile? Dị ka Mosis, ha aghaghị inwe enyemaka. Ha aghaghị ịmụta ikenye ọrụ. N’ezie, onye na-adịghị ekenye ọrụ abụghị ezi onye nhazi.
Uru nke Izụ Ndị Ọzọ
E nwekwara ihe ndị ọzọ mere a ga-eji na-ekenye ndị ọzọ ibu ọrụ. N’ilu Jisọs nke talent, tupu onye ahụ nwe ụlọ apụọ gawa njem dị anya, ọ kpọrọ ndị ohu ya ma kenye ha ibu ọrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche. (Matiu 25:14, 15) Site n’ime otú ahụ, onye ahụ nwe ụlọ nwetara ihe mgbaru ọsọ dị iche iche. Nke mbụ, mgbe ọ na-anọghị ya, ndị ohu ya mere ihe ndị o kwesịrị ịdị na-eme, a kwụsịghịkwa ọrụ ndị dị mkpa mgbe ọ na-anọghị ya. Nke abụọ, ebe ọ bụ na ihe mmadụ na-eme na-egosi ụdị onye ọ bụ karịa ihe ọ na-ekwu, onye ahụ nwe ụlọ pụrụ ịhụ ikike na nguzosi ike n’ihe nke ndị ohu ya. Nke atọ, onye ahụ nwe ụlọ nyere ndị ohu ya ohere nke inweta ahụmahụ dị oké mkpa.
Ilu nke a nwere ihe ọ pụtara nye anyị taa. Mgbe Jisọs hapụrụ ụwa, o nyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ibu ọrụ. Ihe fọdụrụ n’ime ndị a ka na-ahụkwa maka ọdịmma nke Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Luk 12:42) N’oge ọrụ ịchị ezinụlọ nke ndị ahụ e tere mmanụ nke oge a, ngọzi Jehova apụtawo nnọọ ìhè ná nzukọ ya. Dị ka ihe si na nke a pụta, ọ bawo ụba n’ụzọ dị ịtụnanya. Leenụ, nanị n’ime afọ ise gara aga, ihe karịrị otu nde ndị ọhụrụ egosipụtawo nraranye ha site n’ịbụ ndị e mere baptism! Nke a emewo ka e nwee ọtụtụ puku ọgbakọ ọhụrụ na ọtụtụ narị sekit ọhụrụ.
Dị nnọọ ka Jisọs Kraịst kenyere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ibu ọrụ, ha, n’otu aka ahụkwa, ekenyewo ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nke “atụrụ ọzọ” ahụ ibu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. (Matiu 24:45-47; Jọn 10:16) Otú o sina dị, a ka chọkwara ndị ikom ndị ọzọ raara onwe ha nye ịhụ maka uto ahụ dị ukwuu nke a na-enwe. Ebee ka ha ga-esi bịa? Ndị okenye aghaghị ịzụ ha. Ma olee otú ndị okenye ga-esi zụọ ndị ikom dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ha adịghị ekenye ndị na-enye ihe àmà nke iru eru ibu ọrụ dị iche iche? Olee ụzọ ọzọ ndị okenye si enwe ohere ikiri iru eru na iguzosi ike n’ihe nke ndị ikom ka na-etolite etolite?
Gịnị Ka Ikenye Ọrụ Pụtara
Nye ụfọdụ, “ikenye ọrụ” pụtara ibupụ, izere, ileghara anya, ma ọ bụ ịgbahapụ ibu ọrụ ndị ha nwere. Otú ọ dị, mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, “ikenye ọrụ” bụ n’ezie, ụzọ e si arụzu ibu ọrụ dị iche iche. Ngwaa Bekee ahụ bụ “ikenye ọrụ” bụ nke a kọwara dị ka, “itinye n’aka onye ọzọ; ịhọpụta dị ka onye nnọchianya nke mmadụ; inye ibu ọrụ ma ọ bụ ike.” Otú o sina dị, onye ahụ kenyere ọrụ ka bụkwa onye ihe nile e mere dị n’ubu ya.
Ụfọdụ ndị pụrụ ịla azụ n’ikenye ọrụ n’ihi na ha na-atụ egwu na ike ga-apụ ha n’aka. Ma, ikenye ọrụ adịghị apụta ike mmadụ nwere ịpụ n’aka ya. Ọ bụ ezie na a dịghị ahụ ya anya, na ọ na-achịkwa achị site n’eluigwe, ike ka dịkwa Kraịst Jisọs n’aka nke ọma n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị. Ya onwe ya, n’otu aka ahụ, tinyere ọgbakọ ahụ n’aka ndị ikom nweworo ahụmahụ, ilekọta ya.—Ndị Efesọs 5:23-27; Ndị Kọlọsi 1:13.
Ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị obi ha na-adịghị aga n’ikenye ọrụ n’ihi na ha chere na ha pụrụ ịrụ ọrụ ahụ ngwa ngwa karị n’onwe ha. Otu ọ dị, Jisọs hụrụ uru nke ịzụ ndị ọzọ. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ụwa nke kụziri ihe n’ụzọ dị irè karịa Jisọs. (Jọn 7:46) Ma, mgbe o nyesịrị 70 ndị ahụ na-eso ụzọ ya ntụziaka, o zipụrụ ha ịga ọrụ nkwusa ahụ. Ọ bụ ezie na ha enweghị ike ịharu ka Jisọs n’ikike izi ihe, ha ji ọṅụ dị ukwuu lọghachi n’ihi ihe ịga nke ọma ndị ha nwere. Jisọs so ha ṅụrịa ma jaa ha mma, n’ihi na ọ maara na ha ga-aga n’ihu n’ọrụ ahụ ogologo oge mgbe ọ laghachisịrị, na ha ga-emesịkwa rụzuo ihe karịrị ihe ọ bụla ọ pụrụ ịrụzuworị nanị ya.—Luk 10:1-24; Jọn 14:12.
Ikenye ọrụ pụtakwara inweta enyemaka n’akụkụ nile ndị dị mkpa. Ụbọchị na-eso ụbọchị Jisọs ga-anwụ, o nyere Pita na Jọn ọrụ ime ndokwa ndị dị mkpa maka oriri Ngabiga ikpeazụ ya. (Luk 22:7-13) Ọ dịghị Jisọs mkpa ịga nyewe onwe ya nsogbu banyere ịzụta atụrụ, mmanya, achịcha na-ekoghị eko, akwụkwọ nri ndị na-elu ilu; ọ dịghịkwa ya mkpa ịga chịkọtawa arịa dị iche iche, nkụ, na ihe ndị yiri ha. Pita na Jọn hụrụ maka ihe ndị ahụ nile.
Ndị okenye nke taa pụrụ irite uru yiri ndị a ma ọ bụrụ na ha eṅomie ihe nlereanya Jisọs. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịgwa onye na-ahụ maka akwụkwọ ka o tinye ọda akwụkwọ ndị dị mkpa maka ime mkpọsa nke na-abịa n’ihu. A pụrụ ịtụziri ya aka ka o nyochaa ihe ndekọ ya ma mata otú e si jiri akwụkwọ ndị dị otú ahụ mee ihe ná mkpọsa ndị e mere na mbụ. Ọ pụkwara icheba echiche n’ihe ndị e ji mara ókèala nke ọgbakọ ahụ tupu ọ kwadebe fọm nke kwesịrị ekwesị maka itinye ọda. Mgbe ahụ ọ ga-ewegara odeakwụkwọ ọgbakọ fọm ahụ maka ilegharị anya na ya. Ozugbo onye nlekọta akwụkwọ mụtara ọrụ ya, ọ gaghị adị mkpa ka odeakwụkwọ ọgbakọ lebaghachi anya nke ugbo abụọ n’ihe ndekọ ndị ochie ma ọ bụrụhaala na ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ihe ndị dị na fọm ahụ e ji tinye ọda kwere nghọta. N’ụzọ doro anya, ihe omume nke a dị mfe nke ikenye ọrụ ga-eme ka itinye ọda maka akwụkwọ kara mfe nye ndị nile o metụtara.
N’ihi uru ndị dị otú ahụ a pụrụ inweta, olee otú mmadụ pụrụ isi kenye ọrụ n’ụzọ dị irè?
Otú E Si Ekenye Ọrụ
Kọwaa ọrụ ahụ nke ọma. Nke mbụ, mee ka ihe ndị a na-atụ anya ga-esi na ya pụta, doo anya. “Zụọnụ ahịa ruo mgbe m ga-abịa” bụ ihe “nwoke a mazuuru aha ya” nke dị n’ilu Jisọs banyere pound, gwara ndị ohu ya iri. (Luk 19:12, 13) Onye ahụ nwe ụlọ lere ndị ahụ anya n’aka iji pound ya zụọ ahịa n’ụzọ uru ga-adị na ya ma nyekwa akụkọ ozi banyere uru ha zụpụtara mgbe ọ lọtara. Ha maara ihe kwesịrị ha ime. Olee otú a pụrụ isi tinye ụkpụrụ nke a n’ọrụ n’owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke oge a? Dị ka ihe atụ, o doro anya na a ga-agwa nwanna e nyere ọrụ ịrụzi elu ụlọ ụdị ngwa ọrụ ndị ọ ga-eji mee ihe, ebe ọ ga-enweta ha, na mgbe ọ ga-amalite ọrụ ahụ, ma ọ bụrụ na ọnọdụ ihu eluigwe kwere ka ọ rụọ ọrụ ahụ. Ụdị inye nduzi kpọmkwem n’ụzọ dị otú ahụ na-eme ka e nwee ezi nhazi.
Ọ dị mkpa ka a kọwaa, ọ bụghị nanị otú ọrụ ahụ hàruru, kamakwa, mkpebi ndị e kwere ka mmadụ mee na okwu ndị e kwesịrị ime ka onye ọzọ mara banyere ha. Mosis gwara ndị ọ họpụtara na ha ga-ekpe ikpe n’okwu ndị dị nta, ma okwu ndị siri ike ka a ga-ewetara ya.—Ọpụpụ 18:22.
Mgbe ị na-enye ndị ọzọ ibu ọrụ, lezie anya ka ị ghara inye onye ọzọ ọrụ i nyeworo mmadụ. Mgbe e weere otu ọrụ nye ihe karịrị otu onye, mgbagwoju anya na-ebilite. Cheedị echiche ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ná mgbakọ ukwu nke Ndịàmà Jehova, e nyere ma Ngalaba Na-ahụ Maka Ịdị Ọcha ma Ngalaba Ije Ozi Ihe Oriri ọrụ nke idebe ebe a na-ere nri ọcha, ma ọ bụ, ya bụrụ na e nyere ma Ngalaba Atendantị ma Ngalaba Imikpu ná Mmiri ọrụ nke iduzi ndị nkiri mgbe a na-eme baptism.
Họpụta ndị ikom ruru eru. Jetro tụụrụ Mosis aro, sị: “Ị ghaghị ịhọpụta n’onwe gị, ndị ruru eru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke n’etiti ndị ahụ nile, ndị ikom na-eme ihe n’eziokwu na ndị a na-emerụghị emerụ, doo ha n’ọrụ n’ebe ndị mmadụ ahụ nọ.” (Ọpụpụ 18:21, The New English Bible) O doro anya na onye bụ nwoke aghaghị ibu ụzọ nwee iru eru ime mmụọ dị iche iche. Iji kpebie ma mmadụ ò “ruru eru” n’ịrụ ọrụ ndị e nwere, aghaghị icheba echiche n’ihe ndị dị ka àgwà ndị e ji mara onye ahụ, ahụmahụ, ọzụzụ, na onyinye ndị o nwere. Otú a, onye Kraịst nke nwekarịrị àgwà ịbụ enyi, nke na-amasị ndị ọzọ, ma na-enye aka, yiri ka ọ ga-arụ ọrụ nke ọma n’ebe a na-ere magazin ma ọ bụ dị ka onye atendantị. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe a na-ahọrọ onye ga na-enyere odeakwụkwọ ọgbakọ aka, n’ụzọ ezi uche dị na ya, e kwesịrị ileba anya n’otú o si bụrụ onye na-eme ihe n’ụzọ a haziri ahaziri. Ọ̀ na-eleba anya n’ihe nile dị mkpa, à pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ, ya na ma ọ̀ pụrụ izobe ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara? (Luk 16:10) Ichebara ihe ndị dị otú ahụ echiche tụkwasị n’iru eru ime mmụọ ndị dị mkpa, ga-enye aka n’itinye onye kwesịrị ekwesị n’ọrụ ahụ.
Nye ihe ndị a chọrọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu. Onye ahụ na-eje ozi ga-achọ inwe ihe ụfọdụ ndị dị mkpa n’ebe aka ya ga-eru ha iji wee rụzuo ọrụ e nyere ya. Eleghị anya ígwè ọrụ, ego, ma ọ bụ enyemaka pụrụ ịdị ya mkpa. Nye ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu nke ihe ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịgwa nwanna nwoke ka ọ rụọ ọrụ idozi ihe ndị dị mkpa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O doro anya na a ga-agwa ya ihe ndị dị mkpa ka e mee, ma ọ pụkwara ịchọ nwa obere ego iji zụta ihe ndị dị mkpa pụrụ ịdapụta mgbe a na-arụ ọrụ. Eleghị anya enyemaka pụrụ ịdị ya mkpa. Ya mere ndị okenye pụrụ ịrịọ ndị ọzọ ka ha nyere ya aka ma ọ bụ maara ọgbakọ ọkwa dị otú a, ‘Nwanna Dị otú a ga-arụ ụdị ọrụ dị otú a n’ụlọ nzukọ, ọ pụkwara ịbịakwute ụfọdụ n’ime unu ịrịọ maka enyemaka.’ Ụdị ibu ụzọ chee echiche dị otú ahụ ga-egbochi mmadụ inye ọrụ n’enyezughị ihe ndị dị mkpa. “Ekenyela ọrụ na-ezughị ezu” bụ ụzọ otu onye ọkà n’ihe banyere ilekọta ọrụ si kwuo ya.
Mgbe a na-ekenye ibu ọrụ dị iche iche, gwa ndị ọzọ na onye ahụ na-anọchi anya gị. Ikike nke ịnọchi anya gị sokwa n’ihe dị mkpa. E guzobere Joshua dị ka onye ndú ọhụrụ nke Israel n’ihu “nzukọ nile” ahụ. A gwara Mosis na ọ “ga-atụkwasịkwa ya ụfọdụ n’ime ebube [ya].” (Ọnụ Ọgụgụ 27:18-23) N’ime ọgbakọ, a pụkwara ịrụzu otu ihe ahụ site n’ịmapanye ndepụta nke ndị nwere ọrụ dị iche iche e nyere ha na bọọdụ ịma ọkwa.
Kwadoo mkpebi ha. Ugbu a, onye ahụ e nyere ọrụ pụrụ ịga n’ihu n’ọrụ e ji n’aka. Otú ọ dị, cheta na ị pụrụ ịbụ ezi ihe agbamume nye ya ma ọ bụrụ na ị kwadoo mkpebi ndị dị mma ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, gị, dị ka okenye, pụrụ inwe otú ọ na-amasị gị ka e si debe ígwè okwu na oche ndị dị n’elu ikpó okwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, eleghị anya ọ dịtụ iche n’otú nwanna ahụ e nyere ọrụ si edebe ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nye nwanna ahụ na-elekọta ebe ikpó okwu ohere ụfọdụ n’ọrụ ya, o yiri ka ọ ga-enweta obi ike na ahụmahụ. E wezụga nke ahụ, ọ pụrụ ọbụna ime ka ihe kawanye mma. Otu onye ọkà n’ihe banyere iji ego achụ ego kwuru, sị: “Kenye ọrụ ahụ, ọ bụghị otú a ga-esi rụọ ya. . . . Mgbe mgbe, a na-ewepụta onyinye nke imepụta ihe.”
Ọzọkwa, nwanna ahụ nke na-arụ ọrụ ahụ n’onwe ya, na-aghọtakarị ọnọdụ ụfọdụ karị ma si otú a nwee ike ịghọta nsogbu ndị dị na ya nke ọma karị. O yiri ka ọ ga-eme ihe banyere nsogbu ndị e nwere site n’iweta ihe ngwọta ndị na-arụ ọrụ. Ọ pụkwara ịdị na-eme ihe banyere ihe ndị na-akpata nsogbu, bụ́ ndị ndị ọzọ na-ahụ ihe na-aganụ, na-adịghị ahụchazi nke ọma. Ya mere, otu onye Kraịst bụ onye nlekọta kwuru banyere onye na-enyere ya aka, bụ́ onye nweworo ahụmahụ, sị: “Ọ bụrụ na o kwuo na e nwere nsogbu ụfọdụ, m na-ekwere n’ihe o kwuru.”
Ee, ihe ọrụ kasị baa uru nke ndị okenye ndị Kraịst nwere bụ ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye, bụ́ ndị dị njikere ma nwee ike inye aka n’ụzọ ọ bụla a gwara ha. Ndị okenye, ritenụ uru n’ihe nke a bara oké uru! Ikenye ọrụ bụ ihe àmà nke ịdị obi umeala, ọ pụkwara ibelata ndọlị na ịda mba n’obi. Ọ bụghị nanị na ị ga-esi n’ụzọ dị otú a nwee ike ime ihe ka ukwuu, kama ị ga-enyekwa ndị ọzọ ohere nke inweta ahụmahụ nke dị mkpa.