Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 1 p. 8-9
  • Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Niile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Niile?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 1 p. 8-9

Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Niile?

Ọ na-agụsi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, agụụ ike ịnụ ekpere anyị si n’ala ala obi anyị kpee, ọ na-emekwa ya obi ụtọ. Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka ọ ghara ịnụ ekpere anyị. Gịnị ka ha bụ, gịnịkwa ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị kpewe ekpere? Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.

Ebe ndị nọ na chọọchị na-agụpụta ekpere e dere n’akwụkwọ ekpere.

“Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.”​—Matiu 6:7.

Jehova achọghị ka anyị na-ekpe ekpere anyị bu n’isi ma ọ bụ si n’akwụkwọ na-agụpụta ya. Kama, ọ chọrọ ka anyị si n’obi anyị na-agwa ya okwu. Chegodị otú obi ga-adị gị ma enyi gị na-abịa agwa gị otu ihe mgbe niile. Ndị bụ́ ezigbo enyi na-esi n’ala ala obi ha agwa ibe ha okwu. Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere, ọ pụtara na anyị weere Nna anyị nke eluigwe ka enyi anyị.

Ebe otu nwoke na-eleli anya elu, na-akpụchasị akwụkwọ o ji agba chaa chaa.

“Ọ bụrụkwa na unu arịọ, unu anaghị arịọta n’ihi na ihe unu na-arịọ maka ya bụ . . . ihe unu ga-eji mee ihe ọjọọ.”​—Jems 4:3.

Anyị agaghị atụ anya ka Chineke nụ ekpere anyị ma anyị rịọ ya ihe anyị ma na ọ chọghị ka anyị mee ma ọ bụ ka anyị nweta. Dị ka ihe atụ, onye na-agba chaa chaa rịọ Jehova ka o mee ka o nwee ihu ọma, Jehova ọ̀ ga-aza ekpere ya ebe ọ bụ na ọ dọọla anyị aka ná ntị gbasara inwe anyaukwu na ikwere nkwenkwe ụgha, dị ka inwe ihu ọma? (Aịzaya 65:11; Luk 12:15) Anyị ekwesịghị iche na Jehova ga-aza ụdị ekpere ahụ. Anyị chọọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị ga-ejiderịrị n’aka na ihe anyị na-arịọ ya dabara n’ihe ọ na-agwa anyị na Baịbụl.

Ebe onye ụkọchukwu na-ekpere ndị soja ekpere.

“Onye na-ekweghị eme ihe iwu kwuru, Chineke ga-eweredị ekpere ya ka ihe rụrụ arụ.”​—Ilu 28:9.

N’oge Baịbụl, Chineke azaghị ndị na-enupụrụ ya isi ekpere ha. (Aịzaya 1:15, 16) Chineke agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza ekpere anyị, anyị ga-emerịrị ike anyị niile iji na-erubere iwu ya isi. Ma, ọ bụrụkwanụ na anyị mere ihe ndị na-adịghị mma n’oge gara aga? Ọ̀ pụtara na Jehova emekataghị nụ ekpere anyị? Mbanụ! Ọ bụrụ na anyị echegharịa ma gbalịa ike anyị niile na-eme ihe dị Chineke mma, ọ ga-agbaghara anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya.​—Ọrụ Ndịozi 3:19.

“Onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”​—Ndị Hibru 11:6.

Ebe otu nwaanyị na-agụ Baịbụl.

Ihe mere anyị ji ekpe ekpere abụghị ka obi dị anyị mma mgbe ike gwụrụ anyị ma ọ bụ mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. Ekpere so n’otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe na Chineke nakwa otú anyị si efe ya. Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs, kwuru na ọ bụrụ na anyị enweghị ‘okwukwe mgbe anyị na-arịọ ihe,’ anyị ‘ekwesịghị iche na anyị ga-anata ihe ọ bụla n’aka Jehova.’ (Jems 1:6, 7) Ka anyị nwee ike inwe okwukwe na Chineke, anyị ga-agba mbọ wepụta oge mata ya nke ọma. Anyị ga-amata ya nke ọma ma anyị na-amụ Baịbụl. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmata uche ya na ịtụkwasị ya obi na ọ na-anụ ekpere anyị.

IKE AGWỤLA GỊ IKPE EKPERE

N’agbanyeghị na Chineke anaghị aza ekpere niile, ọ na-anụ ma na-aza ekpere ọtụtụ nde mmadụ si n’obi ha na-ekpe. Baịbụl kwuru ihe ndị i nwere ike ime ka ekpere gị na-eme Chineke obi ụtọ. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya