Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Febụwarị p. 30-31
  • Ajụjụ Dị Mfe Onye Ọ Bụla Ga-ajụli

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Dị Mfe Onye Ọ Bụla Ga-ajụli
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • O Diri Ọnwụ Nwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Febụwarị p. 30-31
Ebe otu nwanna nwaanyị na di ya si n’Ịntanet na-amụrụ otu nwaanyị ihe.

Ajụjụ Dị Mfe Onye Ọ Bụla Ga-ajụli

Nwanna Nwaanyị Mary na di ya bụ́ Johna bi n’obodo ọtụtụ ndị na-esi Filipinz abịa arụ ọrụ. Obi dịkwa ha ụtọ ịna-ezi ha ozi ọma. N’oge ọrịa koronavaịrọs, Nwanna Nwaanyị Mary maliteere ọtụtụ ndị ọmụmụ Baịbụl n’ebe o bi nakwa n’ebe ndị ọzọ n’ụwa. Olee otú o si mee ya?

Ọ na-ajụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl, sị: “È nwere onye ọzọ ị ma ga-achọ ka a mụwara ya Baịbụl?” Ọ bụrụ na onye ahụ asị ee, ọ na-agwa ya ka o nyere ya aka kpọtụrụ onye ahụ. Ịjụ ajụjụ a dị mfe arụpụtala ọtụtụ ihe ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị Okwu Chineke na-atọ ụtọ na-achọkarị ịkọrọ ndị ezinụlọ ha na ezigbo ndị enyi ha ihe ha mụtara. Olee ihe ọma ịjụ ajụjụ a rụpụtarala?

Otu onye Nwanna Nwaanyị Mary na-amụrụ Baịbụl aha ya bụ Jasmine gosiri ya mmadụ anọ chọrọ ịmụ Baịbụl. Aha otu n’ime ha bụ Kristine. Ịmụ Baịbụl tọwara ya ezigbo ụtọ nke na ọ gwara Mary ka ọ na-amụrụ ya ihe ugboro abụọ n’izu. Mgbe Mary jụrụ ya ma ọ̀ ma onye ọzọ chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl, ọ zara, sị: “Ee, m ga-egosi gị ndị enyi m.” N’ime izu ole na ole, Kristine gosiri Mary ndị enyi ya anọ chọrọ ịmụ Baịbụl. Kristine mechara gosikwa ya ndị enyi ya ọzọ. Ụfọdụ n’ime ha gosikwara Kristine ndị ọzọ chọrọ ịmụ Baịbụl.

Kristine chọkwara ka ndị ezinụlọ ya bi na Filipinz mụwa Baịbụl. N’ihi ya, ọ gwara nwa ya nwaanyị aha ya bụ Andrea banyere ya. Ná mbido, Andrea chere, sị: ‘Ndịàmà Jehova bụ òtù ọjọọ. Ha ekweghị na Jizọs. Naanị ebe ha na-agụ na Baịbụl bụ Àgbà Ochie.’ Ma, mgbe a mụchaara ya ihe otu ugboro, ọ kwụsịrị iche otú ahụ banyere Ndịàmà Jehova. N’oge a na-amụrụ ya Baịbụl, ọ na-eti mkpu, sị, “Ọ bụrụhaala na ihe a dị na Baịbụl, ọ ga-abụrịrị eziokwu!”

Ka oge na-aga, Andrea gosiri Nwanna Nwaanyị Mary ndị enyi ya abụọ nakwa otu onye ọrụ ibe ya chọrọ ịmụ Baịbụl. Nwanna Nwaanyị Mary amaghị na nwanne papa Andrea nke nwaanyị kpuru ìsì aha ya bụ Angela na-ege ntị ma ha mụwa ihe. Otu ụbọchị, nwaanyị ahụ gwara Andrea ka ọ gwa Nwanna Nwaanyị Mary na ya chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl. Ihe Angela na-amụta na Baịbụl masịrị ya. N’ime otu ọnwa, o butela ọtụtụ amaokwu Baịbụl n’isi, chọọkwa ka a na-amụrụ ya ihe ugboro anọ n’izu. Andrea nyeere ya aka ya esi n’Ịntanet na-egere ihe a na-amụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Mgbe Nwanna Nwaanyị Mary matara na di Kristine aha ya bụ Joshua na-ege ihe ya na Kristine na-amụ, ọ jụrụ ya ma ọ̀ ga-achọ isonyere ha n’ọmụmụ ihe ahụ. Joshua sịrị: “M ga-ege ntị. Mana, ajụkwala m ajụjụ ọ bụla. Ị jụọ m ajụjụ, m ga-apụ.” Mgbe ha mụrụ ihe ruo nkeji ise, ọ jụọla ọtụtụ ajụjụ karịa nwunye ya Kristine, chọọkwa ka a mụwara yanwa ihe.

Ajụjụ a dị mfe Nwanna Nwaanyị Mary na-ajụ emeela ka a malitere ọtụtụ ndị ọmụmụ Baịbụl. Ebe ọ bụ na ha dị ọtụtụ, ọ haziri ka ụmụnna ndị ọzọ nyewere ya aka na-amụrụ ụfọdụ n’ime ha ihe. Nwanna Nwaanyị Mary maliteere mmadụ iri abụọ na asatọ ọmụmụ Baịbụl ná mba anọ.

Jasmine, bụ́ onye mbụ a malitere ịmụrụ Baịbụl anyị kpọrọ aha ya n’isiokwu a, mere baptizim n’ọnwa Eprel afọ 2021. Kristine mere baptizim n’ọnwa Mee afọ 2022. Ọ lakwurula ndị ezinụlọ ya na Filipinz. Mmadụ abụọ ọzọ Kristine gosiri Nwanna Nwaanyị Mary emeekwala baptizim. Angela mekwara baptizim ọnwa ole na ole Kristine mechara. Ọ bụzi ọsụ ụzọ oge niile. Joshua bụ́ di Kristine na nwa ha nwaanyị aha ya bụ Andrea na ọtụtụ ndị ọzọ ka na-amụkwa Baịbụl, ha na Jehova ana-adịkwu ná mma.

Ebe nwanna nwaanyị ahụ e gosiri na foto bu ụzọ na onye ọ na-amụrụ Baịbụl na ndị enyi ya anọ ọzọ si n’Ịntanet na-ekwurịta okwu.

N’oge Jizọs na ndịozi ya, ọtụtụ ndị kọọrọ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha ihe ha mụtara gbasara Jizọs. (Jọn 1:41, 42a; Ọrụ 10:24, 27, 48; 16:25-33) Ọ ga-adị mma ma ị jụọ ndị ị na-amụrụ Baịbụl na ndị ọzọ nwere mmasị, sị: “È nwere onye ọzọ ị ma ga-achọ ka a mụwara ya Baịbụl?” Ị jụọ mmadụ ajụjụ a dị mfe onye ọ bụla ga-ajụli, i nwere ike ịchọta ndị ọzọ chọrọ ka a mụwara ha Baịbụl.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya