Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Enyi
È NWETỤLA mgbe nsogbu bịaara gị, ya adị gị ka e nweghị onye ọ bụla na-enyere gị aka? Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, taakwa akpụ.’ Ihe a nwere ike ime ka obi na-ada anyị mbà, ya adịkwa anyị ka ànyị nọ naanị anyị. (2 Tim. 3:1) Ma, anyị nwee nsogbu, ndị ọzọ nwere ike inyere anyị aka. Baịbụl kwuru na ezigbo ndị enyi nwere ike inyere anyị aka “n’oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
OTÚ EZIGBO NDỊ ENYI NWERE IKE ISI NYERE ANYỊ AKA
N’agbanyeghị na a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya, ndị enyi ya nyeere ya aka ya ejezuo ozi ya
E nwere ụfọdụ ezigbo ndị enyi Pọl onyeozi so ya mee njem. Ha nyekwaara ya aka. (Kọl. 4:7-11) Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ndị enyi ya nyeere ya aka, meere ya ihe ndị ọ na-agaghị emeliri onwe ya. Dị ka ihe atụ, Epafrọdaịtọs buteere Pọl onyinye ụmụnna nọ na Filipaị zitere. (Fil. 4:18) Tikikọs nyere aka kesaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi Pọl dere. (Kọl. 4:7) Otú ndị enyi Pọl si nyere ya aka mere ka o nwee ike ịna-eje ozi ya, ma mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya ma mgbe e mechara kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ. Olee otú i nwere ike isi abụ ezigbo enyi taa?
Ụmụnna anyị taa egosila na inwe ezigbo enyi bara ezigbo uru. Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị ghọọrọ Nwanna Nwaanyị Elisabet ezigbo enyi. Nwanna Nwaanyị Elisabet bụ ọsụ ụzọ oge niile na Spen. Mgbe a chọpụtara na mama ya na-arịa ọrịa kansa ga-egbu ya, nwanna nwaanyị ahụ ziteere Nwanna Nwaanyị Elisabet ọtụtụ amaokwu Baịbụl ndị ga-agba ya ume n’ekwentị ya. Nwanna Nwaanyị Elisabet sịrị: “Mgbe m hụrụ ozi ndị ọ na-ezitere m, obi tọrọ m ezigbo ụtọ n’ihi na m ma na e nwere onye na-eche gbasara m. O mekwara ka m nwee ike ịna-eme ihe ndị dịịrị m.”—Ilu 18:24.
Anyị nwekwara ike ime ka anyị na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma ma anyị na-eso ha eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike iwepụta onwe gị buru nwanna mere agadi gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma? I mee otú ahụ, gị na ya nwere ike ịgba ibe unu ume. (Rom 1:12) Ma, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst na-anaghị apụli apụ n’ụlọ ha. Olee otú anyị nwere ike isi bụụrụ ụdị ndị a ezigbo enyi?
BỤRỤ EZIGBO ENYI NDỊ NA-ANAGHỊ APỤLI N’ỤLỌ HA
Ụfọdụ ụmụnna anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ mere ka ha ghara ịna-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka anyị kwuo gbasara Nwanna David. A chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa kansa. Ruo ihe karịrị ọnwa isii, a nọ na-agwọ ya ọrịa kansa ahụ. N’oge ahụ, ya na nwunye ya Lidia na-esi n’Ịntanet egere ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe.
Olee otú ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ si nyere ha aka? A gbasaa ọmụmụ ihe ụbọchị ọ bụla, ụfọdụ ụmụnna na-agba mbọ ka ha na ha si n’Ịntanet kwurịta okwu. Ọ bụrụkwa na Nwanna David na nwunye ya azaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ha na-emecha zitere ha ozi na-agba ha ume n’ekwentị ha. Olee otú o mere ka obi dịrị Nwanna David na nwunye ya? O mere ka ọ ghara ịdị ha ka hà nọ naanị ha.
Gị na ụmụnna ndị na-enweghị ike ịpụ n’ụlọ ha rụọ n’ozi ọma
Ànyị nwere ike ịhazi ka anyị na ụmụnna na-anaghị apụli n’ụlọ ha rụọ n’ozi ọma? Anyị nwere ike ịgbanwetụ ihe ụfọdụ n’ihe anyị na-eme ka anyị na ha nwee ike ịrụ n’ozi ọma. Anyị ga-esi otú a eme ka ha mara na anyị echefubeghị ha. (Ilu 3:27) Gị na ha nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ akwụkwọ ozi zie ozi ọma. Ndị na-anaghị apụli n’ụlọ ha nwere ike isi n’Ịntanet gere nzukọ ozi ubi. Obi tọgburu Nwanna David na nwunye ya atọgbu mgbe ndị ọgbakọ ha mere ụdị ihe a. Nwanna David sịrị: “Anyị na ndị nọ n’ìgwè anyị izukọta kwurịta okwu ma kpee ekpere gbara anyị ezigbo ume.” Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike ịjụ nwanna na-anaghị apụtali èzí ma ọ̀ ga-achọ anyị nọtụ anyị akpọta onye anyị na-amụrụ Baịbụl n’ụlọ ya ka anyị nọrọ ebe ahụ mụọrọ ya Baịbụl.
Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna ndị a arụkọọ n’ozi ọma, anyị achọpụtakwa àgwà ndị magburu onwe ha ha nwere, anyị na ha ga-adịkwu ná mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na ha anọrọ n’ozi ọma, gị achọpụta otú ha si eji Okwu Chineke akụzi ihe ya eruo mmadụ n’obi, o nwere ike ime ka gị na ha bụrụkwuo enyi. Ọ bụrụ na ị na-enyere ụmụnna aka ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma, ọ ga-eme ka i nwetakwuo ndị enyi.—2 Kọr. 6:13.
Mgbe ihe na-esiri Pọl ike, enyi ya bụ́ Taịtọs gara leta ya ma nyere ya aka. Ihe a gbara ya ume. (2 Kọr. 7:5-7) Akụkọ a na-echetara anyị na otú anyị ga-esi akasi ndị mmadụ obi abụghị naanị ikwu n’ọnụ na anyị na-emetere ha ebere. Anyị kwesịkwara ịga nọnyere ha, meekwara ha ihe ndị anyị ga-emere ha iji nyere ha aka.—1 Jọn 3:18.
NYERE NDỊ ENYI GỊ AKA MGBE A NA-AKPAGBU HA
Ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa egosila otú magburu onwe ya anyị ga-esi na-enyere ibe anyị aka ma a na-akpagbu anyị. Ka anyị kwuo gbasara Nwanna Sergey na nwunye ya Tatyana. Mgbe ndị uwe ojii kwaghasịchara ụlọ ha ka ha na-achọ ihe, ha kpụụrụ ha gawa n’ụlọ ọrụ ha ka ha gbaa ha ajụjụ. E bu ụzọ hapụ Nwanna Nwaanyị Tatyana ya alaa ụlọ. Nwanna Sergey sịrị: “Ozugbo nwunye m Tatyana na-erute ụlọ, otu nwanna nwaanyị katara obi bịa n’ụlọ anyị. Ụmụnna anyị ndị ọzọ bịakwara nyere anyị aka dozie ụlọ anyị a kwaghasịchara.”
Nwanna Sergey kwukwara, sị: “Ihe e kwuru n’Ilu 17:17 na-atọgbu m atọgbu. Ebe ahụ sịrị: ‘Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.’ N’oge ahụ a na-akpagbu m, achọsiri m ike ka ndị enyi m nyere m aka. Achọpụtala m na ihe e kwuru n’Ilu 17:17 bụ eziokwu. Jehova enyela m ndị enyi kwụ m n’azụ ụjọ na-anaghị atụ.”a
Ka ihe na-esikwuru anyị ike na-aga, enyemaka ndị enyi anyị dị anyị mkpa. Enyemaka ha ga-adịkwu anyị mkpa n’oge oké mkpagbu. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-enyere ndị enyi anyị aka ugbu a.—1 Pita 4:7, 8.
a Gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Enyela M Ndị Enyi Kwụ M n’Azụ Ụjọ Na-anaghị Atụ.”