Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Eprel p. 2-7
  • “Họrọnụ . . . Onye Unu Ga-efe”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Họrọnụ . . . Onye Unu Ga-efe”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE JIZỌS JI HỌRỌ IFE JEHOVA
  • IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ IFE JEHOVA
  • IHE MERE ANYỊ JI KPEBIE IFE JEHOVA
  • AKWỤSỊLA IFE JEHOVA
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Eprel p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

“Họrọnụ . . . Onye Unu Ga-efe”

“Mụ na ezinụlọ m ga-efe Jehova.”​—JOSH. 24:15.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-echetara anyị ihe ndị mere anyị ji kpebie ife Jehova.

1. Gịnị ka anyị ga-eme iji na-enwe ezigbo obi ụtọ? Maka gịnị? (Aịzaya 48:17, 18)

NNA anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ ugbu a nakwa n’ọdịnihu. (Ekli. 3:12, 13) O kere anyị ma nye anyị nkà ndị pụrụ iche. Ma, o nyeghị anyị ikike ịchị onwe anyị ma ọ bụ iji aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ekli. 8:9; Jere. 10:23) Ọ ma na ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ezigbo obi ụtọ, anyị ga na-efe ya ma na-erubere ya isi.​—Gụọ Aịzaya 48:17, 18.

2. Gịnị ka Setan chọrọ ka anyị chee, gịnịkwa ka Jehova mere iji gosi na Setan bụ ezigbo onye ụgha?

2 Setan chọrọ ka anyị chee na anyị ga-enweli obi ụtọ ma Jehova enyereghị anyị aka, nakwa na ihe ga-agara ụmụ mmadụ nke ọma ma ha jiri aka ha na-achị onwe ha. (Jen. 3:4, 5) Iji gosi na Setan bụ onye ụgha, Jehova hapụrụ ndị mmadụ ka ha chịa onwe ha ruo oge ụfọdụ. O doro ewu na ọkụkọ anya na ọchịchị ụmụ mmadụ achịtaghị ájá. Ma, Baịbụl gwara anyị banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị obi dị ụtọ n’ihi na ha fere Jehova. Onye kacha nwee obi ụtọ n’ime ha niile bụ Jizọs Kraịst. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe mere Jizọs ji họrọ ife Jehova. Ihe ọzọ anyị ga-amụta bụ ihe mere anyị ji kwesị ife Nna anyị nke eluigwe. N’ikpeazụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ mere anyị ji kpebie ife Jehova.

IHE MERE JIZỌS JI HỌRỌ IFE JEHOVA

3. Gịnị ka Setan sị na ọ ga-enye Jizọs, ma gịnị ka Jizọs mere?

3 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwesịrị ikpebi onye ọ ga-efe. Obere oge o mechara baptizim, Setan kwuru na ọ ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma ọ bụrụ na ọ daa n’ala fee ya naanị otu ugboro. Jizọs sịrị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.’” (Mat. 4:8-10) Gịnị mere Jizọs ji kpebie ihe ahụ o kpebiri? Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere o ji kpebie ime ya.

4-5. Olee ihe ụfọdụ mere Jizọs ji kpebie ife Jehova?

4 Ihe kacha mkpa mere Jizọs ji kpebie ife Jehova bụ maka na o ji obi ya niile hụ ya n’anya. (Jọn 14:31) Ihe ọzọ bụ na Jizọs na-efe Jehova n’ihi na ọ bụ ihe o kwesịrị ime. (Jọn 8:28, 29; Mkpu. 4:11) Ọ ma na ọ bụ Jehova nyere ya ndụ nakwa na Jehova bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-emesapụkwa aka. (Ọma 33:4; 36:9; Jems 1:17) Jehova na-agwa Jizọs eziokwu kemgbe. Ọ bụkwa ya nyere ya ihe niile o nwere. (Jọn 1:14) Ma, Setan anaghị eme ka Jehova. Ọ bụ ya kpataara ndị mmadụ mmehie na ọnwụ. Ọ bụ onye ụgha, bụrụ onye anyaukwu, nakwa onye na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru. (Jọn 8:44) Ebe ọ bụ na Jizọs ma ihe ndị a, o nweghị mgbe o chetụwadịrị echiche ime ka Setan, nupụwara Jehova isi.​—Fil. 2:5-8.

5 Ihe ọzọ mere Jizọs ji kpebie ife Jehova bụ na ọ tụsiri anya ike uru ijere Jehova ozi ga-aba. (Hib. 12:2) Ọ ma na ọ bụrụ na o jiri obi ya niile fee Jehova, ọ ga-eme ka e doo aha Nna ya nsọ, si otú ahụ wepụ ahụhụ niile Ekwensu kpatara.

IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ IFE JEHOVA

6-7. Gịnị mere ọtụtụ ndị taa anaghị efe Jehova? Gịnị mere anyị ji kwesị ife ya?

6 Ọtụtụ ndị taa anaghị efe Jehova n’ihi na ha amaghị ọmarịcha àgwà ndị o nwere nakwa ihe ọma niile ọ na-emere ha. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ndị Pọl onyeozi ziri ozi ọma n’Atens.​—Ọrụ 17:19, 20, 30, 34.

7 Pọl gwara ndị Atens na ezi Chineke “na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” Ọ gwakwara ha, sị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije.” Ọ bụ Chineke kere ihe niile. Ọ bụkwa ya si “n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị.” N’ihi ya, ọ bụ ya ka anyị kwesịrị ịna-efe.​—Ọrụ 17:25, 26, 28.

8. Gịnị ka Jehova na-emekataghị mee? Kọwaa.

8 Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, bụrụkwa Ọkaakaa eluigwe na ụwa, a sị na ọ chọrọ, ọ gaara amanye ndị mmadụ ka ha na-efe ya. Ma, Jehova emekataghị mee otú ahụ. Kama ime otú ahụ, o mere ka e nwee ọtụtụ ihe gosiri na ọ dị adị nakwa na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya nke ukwuu. Ọ chọrọ ka ọtụtụ ndị bụrụ enyi ya ruo mgbe ebighị ebi. (1 Tim. 2:3, 4) Ọ bụ ya mere Jehova ji zụọ anyị ka anyị na-akụziri ndị ọzọ banyere nzube ya, na-agwakwa ha ihe ọma ndị ọ ga-emere ụmụ mmadụ. (Mat. 10:11-13; 28:19, 20) Ọ kpọbatara anyị n’ọgbakọ ya, haziekwa ka e nwee ndị okenye hụrụ anyị n’anya ga na-elekọta anyị.​—Ọrụ 20:28.

9. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si gosi na ọ hụrụ mmadụ niile n’anya?

9 Otu ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ịna-emere ndị na-achọghịdị ikweta na ọ dị adị ihe ọma. Chegodị banyere ihe a: Kemgbe ụwa, e nweela ọtụtụ ijeri mmadụ ndị kpebiri iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ọma na ihe ọjọọ. N’agbanyeghị ya, Jehova ji obiọma na-enye ha ihe ga-eme ka ha na-adị ndụ, ndụ ana-atọkwa ha ụtọ. (Mat. 5:44, 45; Ọrụ 14:16, 17) O mere ka ha nwee ike ịna-enwe ndị enyi na ezinụlọ hụrụ ha n’anya, ịna-amụ ụmụ, ịna-arụ ọrụ, nakwa ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ. (Ọma 127:3; Ekli. 2:24) Ihe niile Nna anyị nke eluigwe mere na-egosi n’eziokwu na ọ hụrụ mmadụ niile n’anya. (Ọpụ. 34:6) Ka anyị chetara onwe anyị ụfọdụ ihe mere anyị ji kpebie ife Jehova nakwa otú o si agọzi ndị na-efe ya.

IHE MERE ANYỊ JI KPEBIE IFE JEHOVA

10. (a) Gịnị bụ ihe kacha mkpa mere anyị ji na-efe Jehova? (Matiu 22:37) (b) Olee uru i riterela na ndidi Jehova na-enwere anyị? (Abụ Ọma 103:13, 14)

10 Dị ka Jizọs, ihe kacha mkpa mere anyị ji kpebie ife Jehova bụ na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. (Gụọ Matiu 22:37.) Ịmụta banyere àgwà Jehova dị iche iche na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otú Jehova si na-enwere anyị ndidi. Mgbe ndị Izrel nupụụrụ ya isi, ọ rịọrọ ha, sị: “Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme.” (Jere. 18:11) Jehova na-echeta na anyị bụ ndị na-ezughị okè nakwa na anyị bụ ájá. (Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.) Ọ bụrụ na ị tụgharịa uche n’otú Jehova si enwere anyị ndidi nakwa n’àgwà ọma ndị ọzọ o nwere, ọ̀ bụ na ọ naghị eme ka i kpebie ife ya ruo mgbe ebighị ebi?

11. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ji kpebie ife Nna anyị nke eluigwe?

11 Ihe ọzọ mere anyị ji kpebie ife Jehova bụ na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. (Mat. 4:10) Ihe ọzọ bụ na anyị ma uru irubere ya isi ga-aba. Anyị iji obi anyị niile na-efe ya na-eme ka e doo aha ya nsọ, gosi na Ekwensu bụ onye ụgha, meekwa ka obi Nna anyị ṅụrịa. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ịna-efe Jehova taa, anyị ga-enwe olileanya ife ya ruo mgbe ebighị ebi.​—Jọn 17:3.

12-13. Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ Jane na Pam?

12 Mgbe anyị dị obere, anyị nwere ike ịmụta ịhụ Jehova n’anya, na-ahụkwukwa ya n’anya ka anyị na-eme agadi. Chegodị banyere ụmụnne abụọ aha ha bụ Jane na Pam.a Jane dị afọ iri na otu, Pam adịrị afọ iri mgbe ha malitere ịmụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na mama ha na papa ha achọghị ịmụ Baịbụl, ha kwere ka Jane na Pam na-eso Ndịàmà Jehova ma ọ bụrụhaala na ha agaghị akwụsị iso ndị ezinụlọ ha na-aga chọọchị ná ngwụcha izu. Jane sịrị: “Ihe Ndịàmà Jehova si na Baịbụl kụziere m nyeere m aka imeri ọnwụnwa ndị ọgbọ m na-anwa m ịṅụ ọgwụ ike na ime omume rụrụ arụ.”

13 Ka afọ ole na ole gachara, ha abụọ ghọrọ ndị nkwusa. Ha mechara malite ịsụ ụzọ oge niile ka ha na-elekọta nne na nna ha merela agadi. Mgbe Jane chetara ihe merenụ, ọ sịrị: “M jirila anya m hụ ihe gosiri na Jehova na-elekọta ndị enyi ya nakwa na, dị ka e kwuru na 2 Timoti 2:19, ‘Jehova ma ndị bụ́ ndị ya.’” A naghị ajụ ajụ na Jehova na-elekọta ndị kpebiri ịhụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi.

14. Olee otú okwu anyị na omume anyị si eme ka a kwụsị ịkọcha aha Jehova? (Kọwaakwa foto.)

14 Anyị chọrọ inye aka mee ka a kwụsị ịkọcha aha Jehova. Chegodị banyere ihe atụ a. Ka e were ya na i nwere ezigbo enyi dị obiọma, na-emesapụ aka, na-agbagharakwa mmadụ. Otu ụbọchị, ị nụrụ ka mmadụ na-ebo ya ebubo, na-asị na obi tara ya mmiri nakwa na ọ dị aghụghọ. Gịnị ka ị ga-eme? Ị ga-agbachitere enyi gị ahụ. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Mgbe Setan na ndị òtù ya na-agbalị imebi aha Jehova, na-aghagidekwa ya ọtụtụ ụgha, anyị anaghị agbachi nkịtị. Anyị na-ekwu nke bụ́ eziokwu banyere Jehova, jiri ike anyị niile na-agbachitere aha ya. (Ọma 34:1; Aịza. 43:10) Anyị na-eji okwu anyị na omume anyị egosi na anyị chọrọ iji obi anyị niile na-efe Jehova.

Ebe otu onye Livaị guzo n’etiti ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ na ebe e si abata ụlọ nsọ.

Ị̀ ga-enye aka gbachitere aha Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)b


15. Olee uru ụfọdụ Pọl onyeozi ritere mgbe ọ gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ ya? (Ndị Filipaị 3:7, 8)

15 Anyị na-agbanwe ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime ná ndụ ka anyị nwee ike ijere Jehova ozi otú ọ chọrọ, wepụtakwuokwa oge jeere ya ozi. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kpebiri ịhapụ ịbụ onye a ma ama n’obodo ya ka o nwee ike iso ụzọ Kraịst ma fee Jehova. (Gal. 1:14) N’ihi ya, ọtụtụ ihe ọma meere ya n’ozi o jeere Jehova. Ọ ga-esokwa Jizọs chịa n’eluigwe. O nweghị mgbe ọ kwara mmakwaara maka mkpebi o mere ijere Jehova ozi. Anyịnwa agaghịkwa akwa mmakwaara.​—Gụọ Ndị Filipaị 3:7, 8.

16. Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ Julia? (Kọwaakwa foto.)

16 Ọ bụrụ na anyị emee ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, Jehova ga-agọzi anyị ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Julia. Tupu ya amụta eziokwu Baịbụl, o so ná ndị na-abụ abụ na chọọchị ha malite mgbe ọ dị obere. Otu onye bụ́ aka ochie n’ịbụ abụ chọpụtara na Julia nwere olu abụ. N’ihi ya, ọ malitere ịzụ ya. Ọ dịghị anya, a mara Julia ka onye olu ya bụ ogele, ya ana-agakwa ebe dị iche iche agụ egwú. Mgbe ọ nọ n’otu ụlọ akwụkwọ a ma ama nke na-akụzi ịgụ egwú, otu nwa akwụkwọ ibe ya malitere ịgwa ya banyere Chineke ma kọwaara ya na Chineke nwere aha nakwa na aha ya bụ Jehova. N’oge na-adịghị anya, Julia malitere ịmụ Baịbụl ugboro abụọ n’izu. Julia mechara kpebie iji ndụ ya niile jeere Jehova ozi kama iji ịgụ egwú mere aka ọrụ. Mkpebi ahụ adịghịrị ya mfe. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị gwara m na m chọrọ ịla onyinye Chineke nyere m n’iyi. Ma, m chọrọ iji ndụ m niile jeere Jehova ozi.” Olee otú obi dị ya taa maka mkpebi ahụ o mere kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ? Ọ sịrị: “Obi na-eru m ala. Obi sikwara m ike na Jehova ga-emere m ihe niile na-agụ m agụụ n’ọdịnihu.”​—Ọma 145:16.

Foto ndị na-egosi: E ji foto ndị a na-egosi ihe Julia họọrọ ime. 1. Ebe ọ nọ n’ihu ọtụtụ ndị na-abụ abụ. 2. Ebe ya na di ya na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe.

Ọ bụrụ na anyị emee ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, anyị ga-ebi ndụ kacha mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)c


AKWỤSỊLA IFE JEHOVA

17. Olee otú ịmata na oge na-akụzi kwarapụ kwarapụ kwesịrị isi agbasa ndị kpebirila ife Jehova na ndị na-ekpebibeghị ife ya?

17 Oge a anyị bi na-akụzi kwarapụ kwarapụ. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihi na ọ ka fọrọ ‘obere oge,’ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarute, ọ gaghịkwa egbu oge.’” (Hib. 10:37) Olee otú ihe a si gbasa anyị? Otú o si gbasa anyị bụ na oge fọọrọ ndị mmadụ ikpebi ma hà ga-efe Jehova ma ọ bụ na ha agaghị efe ya dịzi ntakịrị. (1 Kọr. 7:29) Ọ bụrụkwa na anyị ekpebiela ife Chineke, anyị ma na ọnwụnwa ga na-abịara anyị, mana, ọ ga-adị naanị “obere oge.”

18. Gịnị ka Jizọs na Jehova chọrọ ka anyị mee?

18 Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ọ bụghị naanị ka ha bido iso ya, kama ka ha na-eso ya. (Mat. 16:24) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ, ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị akwụsị ife ya. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị na-ebi ndụ gosiri na anyị kpebiri ịna-efe ya. O nwere ike ọ gaghị adịrị anyị mfe, ma Jehova ga-agọzi anyị, anyị enweekwa obi ụtọ, ma ugbu a.​—Ọma 35:27.

19. Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ Nwanna Gene?

19 Ụfọdụ ndị chere na ọ bụrụ na ha ebido ife Jehova, ha agaghịzi na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto, ì chere na e nwere ihe ọma ga-akwa gị ma ọ bụrụ na i bido ife Jehova? Otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Gene sịrị: “M cheburu na ịbụ Onyeàmà Jehova na-eke mmadụ agbụ. Ọ dị m ka ọtụtụ ụmụaka mụ na ha tokọrọ hà na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ha na-aga oriri na nkwari, ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ana-akpa, ha ana-agbakwa gem a na-eme tigbuo zọgbuo na ya, mụnwa ejiri oge m na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma.” Olee nsogbu iche ụdị ihe a kpataara Nwanna Gene? Ọ sịrị: “M malitere ịna-ebi ndụ ihu abụọ. Ruokwa oge ụfọdụ, m nọ na-ekpori ndụ. Mana o meghị ka m nwee ezigbo obi ụtọ. M malitere iche banyere uru irubere ihe Baịbụl kwuru isi ga-abara m ma kpebizie iji obi m niile fewe Jehova. Kemgbe ahụ, m ga-asị na Jehova azala ekpere ọ bụla m kpere.”

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Otu ọbụ abụ bụkuru Jehova abụ, sị: “Onye ị họọrọ ma kpọta nso ka o biri n’ogige ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 65:4) Ka anyị kpebie otu ihe ahụ Joshụa kpebiri. Ọ sịrị: “Mụ na ezinụlọ m ga-efe Jehova.”​—Josh. 24:15.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere Jizọs ji kpebie ife Jehova?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ife Jehova?

  • Gịnị mere i ji kpebie ife Jehova?

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b NKỌWA FOTO: Mgbe otu nwaanyị gechara ihe ndị na-agba nzukọ Jehova ụkwụ na-ekwu n’ebe dị nso n’ebe a nọ na-enwe mgbakọ, ọ bịara n’ebe e dowere ihe nkwagharị e ji ekwusa ozi ọma ma nụ nke bụ́ eziokwu.

c NKỌWA FOTO: Foto ndị a na-enyere anyị aka ịmata ihe ndị Julia gbanwere ná ndụ ya iji fee Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya