Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Ọgọst p. 14-19
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Agbagharala Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Agbagharala Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ IKWETA NA JEHOVA AGBAGHARALA ANYỊ?
  • GỊNỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA AGBAGHARALA ANYỊ?
  • ECHEFULA IHE JEHOVA NA-ECHETA
  • NA-EME KA OBI NA-ESIKWU GỊ IKE NA JEHOVA AGBAGHARALA GỊ
  • Uru Mgbaghara Jehova Na-abara Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Ọgọst p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Agbagharala Gị

“Ị gbaghaara m mmehie m niile.”​—ỌMA 32:5.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị nakwa otú Baịbụl si eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-agbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị.

1-2. Gịnị ka Jehova na-eme ma anyị chegharịa ná mmehie anyị? (Kọwaakwa foto)

E NWERE mgbe obi nọ na-ama Eze Devid ikpe maka mmehie ndị o mere n’oge gara aga. (Ọma 40:12; 51:3; okwu mmeghe) O mere ụfọdụ mmehie dị oké njọ ná ndụ ya. N’agbanyeghị ya, o ji obi ya niile chegharịa, Jehova agbaghara ya. (2 Sam. 12:13) Ihe a mere ka Devid ghọta otú obi si eru mmadụ ala ma ọ chọpụta na Jehova agbagharala ya.​—Ọma 32:1.

2 Dịkwa ka Devid, obi ga-atọ anyị ụtọ ma anyị chọpụta na Jehova emeerela anyị ebere ma gbaghara anyị mmehie anyị. Obi na-eru anyị ala ma anyị mata na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị, ọ bụrụgodị mmehie dị oké njọ, ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa, kwupụta mmehie anyị, gbasiekwa mbọ ike ka anyị ghara ime ya ọzọ. (Ilu 28:13; Ọrụ 26:20; 1 Jọn 1:9) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ịmata na Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, ọ na-agbaghara ya kpamkpam, ya adị ka anyị emedịghị mmehie ahụ.​—Ezik. 33:16.

Ebe Eze Devid nọ na varanda ya na-akpọ ụbọ, na-abụkwa abụ.

Eze Devid dere ọtụtụ abụ ọma kọwara otú Jehova si agbaghara mmehie (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)


3-4. Olee otú obi dị otu nwanna nwaanyị mgbe o mechara baptizim? Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Ma, mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike ikweta na Jehova agbagharala ha. Ka anyị kwuo banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jennifer. Nne na nna ya kụziiri ya eziokwu Baịbụl mgbe ọ dị obere. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ malitere ibi ndụ ọjọọ ma na-ezochiri ya ndị mụrụ ya. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ọ lọghachikwutere Jehova, ruokwa eruo ime baptizim. Ọ sịrị: “N’oge mbụ, m na-achụ ego ọnwụ ọnwụ, na-eme omume rụrụ arụ, na-aṅụ oké mmanya, na-ewekwa iwe ọkụ. N’ime obi m, ama m na mgbe m rịọchara Jehova ka ọ gbaghara m mmehie m ma chegharịa, àjà Jizọs chụrụ mere ka m dị ọcha. Ma obi esilighị m ike na Jehova agbagharala m.”

4 Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ikweta na Jehova agbagharala gị mmehie ndị i mere n’oge gara aga? Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ọ bụ Chineke na-eme ebere otú ahụ o siri Devid. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe mere anyị ji kwesị ikweta na Jehova agbagharala anyị mmehie anyị nakwa ihe ga-enyere anyị aka ikweta.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ IKWETA NA JEHOVA AGBAGHARALA ANYỊ?

5. Gịnị ka Setan chọrọ ka anyị kweta? Nye ihe atụ.

5 Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, ọ ga-eme ka ọnyà Setan ghara ịma anyị. Cheta na Ekwensu ga-eme ihe niile ọ ga-emeli ka anyị kwụsị ife Jehova. Iji mezuo ihe a o bu n’obi, o nwere ike ime ka anyị kweta na Jehova emekataghị gbaghara anyị mmehie anyị. Chegodị banyere nwoke ahụ e kewapụrụ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt n’ihi na ọ kwara iko. (1 Kọr. 5:1, 5, 13) Mgbe o mechara chegharịa, Setan chọrọ ka ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ghara ịgbaghara ya. Ọ chọrọ ka ha kpọchie obi nke na a gaghị anabata nwoke ahụ n’ọgbakọ. Setan chọkwara ka o chee na Chineke emekataghị gbaghara ya mmehie ya, “ka otú ọnọdụ ya si ewute ya” mee “ka ọ daa mbà,” kwụsizie ife Jehova. Setan agbanwebeghị ihe o bu n’obi ma ọ bụ aghụghọ ya. Ma, “anyị ma otú o si anwata ndị mmadụ.”​—2 Kọr. 2:5-11.

6. Gịnị ka anyị ga-eme ka obi kwụsị ịma anyị ikpe maka mmehie anyị mere?

6 Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, ọ ga-eme ka obi kwụsị ịna-ama anyị ikpe. Anyị mee mmehie, obi na-ajọ anyị njọ maka ihe anyị mejọrọ. (Ọma 51:17) Ọ dịghịkwa njọ. Akọnuche anyị nwere ike ime ka anyị mee ihe anyị kwesịrị ime iji mezie ihe anyị mejọrọ. (2 Kọr. 7:10, 11) Ma, ọ bụrụ na obi ka na-ama anyị ikpe ogologo oge anyị chegharịchara ná mmehie anyị, o nwere ike ime ka anyị daa mbà ma kwụsị ife Jehova. Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, ọ ga-eme ka obi kwụsị ịma anyị ikpe, anyị efewezie Jehova otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya, ya bụ, iji akọnuche dị ọcha na obi ụtọ na-efe ya. (Kọl. 1:10, 11; 2 Tim. 1:3) Ma, olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi sie anyị ike na Jehova agbagharala anyị?

GỊNỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA AGBAGHARALA ANYỊ?

7-8. Olee otú Jehova si kọwaara Mosis onwe ya? Oleekwa ihe ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ya? (Ọpụpụ 34:6, 7)

7 Na-eche ihe Jehova kwuru banyere onwe ya. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe Jehova gwara Mosis n’Ugwu Saịnaị.a (Gụọ Ọpụpụ 34:6, 7.) Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ọtụtụ àgwà magburu onwe ha, ma ọ họọrọ ịgwa Mosis na ya bụ “Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere.” Ụdị Chineke ahụ ọ̀ ga-ahapụ ịgbaghara onye na-efe ya mere mmehie ma jiri obi ya niile chegharịa? Ọ gatụdịghị eme otú ahụ. Ime otú ahụ pụtara na ọ naghị eme ebere, na obi takwara ya mmiri. Anyị makwa na Jehova agaghị akpa ụdị àgwà ahụ.

8 Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emere anyị ebere otú o kwuru. Ọ naghị agha ụgha. (Ọma 31:5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikweta ihe o kwuru. Ọ bụrụ na o siere gị ike ikweta na Jehova agbagharala gị mmehie ndị i mere n’oge gara aga, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kwetara na Jehova na-eme ebere n’eziokwu, nweekwa ọmịiko, nakwa na ọ gaghị ahapụ ịgbaghara onye mmehie ọ bụla chegharịrị echegharị? Ọ bụrụ na m kwetara, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ikweta na ọ gbagharala mụnwa?’

9. Gịnị ka Abụ Ọma 32:5 na-akụziri anyị gbasara otú Jehova si agbaghara mmehie anyị?

9 Chee gbasara ihe Jehova mere ka ndị dere Baịbụl dee banyere otú o si agbaghara anyị. Dị ka ihe atụ, legodị otú Devid bụ́ onye so dee Baịbụl si kọwaa otú Jehova si agbaghara mmehie. (Gụọ Abụ Ọma 32:5.) Devid sịrị: “Ị gbaghaara m mmehie m niile.” Okwu Hibru a sụgharịrị “gbaghaara” nwere ike ịpụta “ibuli,” “ibupụ,” ma ọ bụ “iburu.” Mgbe Jehova na-agbaghara Devid, e nwere ike ikwu na o bulitere mmehie ya ma bupụ ya. Ihe a mere ka Devid nwere onwe ya n’obi ahụ nọ na-ama ya ikpe. (Ọma 32:2-4) O nwekwara ike ịdị anyị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa ná mmehie anyị, anyị ekwesịghị ikwe ka akọnuche anyị na-ama anyị ikpe maka mmehie Jehova buliri ma bupụ.

10-11. Gịnị ka okwu bụ́ ‘dị njikere ịgbaghara’ na-akụziri anyị banyere Jehova? (Abụ Ọma 86:5)

10 Gụọ Abụ Ọma 86:5. N’ebe a, Devid kwuru na Jehova ‘dị njikere ịgbaghara mmehie.’ Ihe a pụtara na Jehova anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ ma anyị mee mmehie. Ọ na-achọkwa mgbe niile ịgbaghara ndị chegharịrịnụ. Gịnị mere o ji eme otú ahụ? Ihe nke abụọ amaokwu ahụ kwuru bụ: “Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.” Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere na-eme ka ya na ndị ji obi ha niile na-efe ya dị n’ezigbo mma nke na ọ gaghị ahapụ ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na ha emehie ma chegharịa, ịhụnanya a pụrụ iche na-eme ka ‘ọ gbaghara ha kpamkpam.’ (Aịza. 55:7) Ọ bụrụ na o siere gị ike ikweta na Jehova agbagharala gị, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ kwetara na Jehova na-agbaghara mmehie nakwa na ọ na-adị njikere ịgbaghara ndị mmehie niile chegharịrịnụ ma na-arịọ ya ka o meere ha ebere? Ọ bụrụ na m kwetara, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ikweta na ọ gbagharala mụnwa mgbe m rịọsiri ya arịrịọ ike ka o meere m ebere?’

11 Baịbụl gwakwara anyị na Jehova ma nke ọma na anyị bụ ndị na-ezughị okè. Ihe a na-akasi anyị obi. (Ọma 139:1, 2) Anyị ga-aghọtakwu ya n’abụ ọma ọzọ Devid dere. Ọ ga-enyere anyị aka ikweta na Jehova chọrọ ịgbaghara anyị mmehie anyị.

ECHEFULA IHE JEHOVA NA-ECHETA

12-13. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 103:14, gịnị ka Jehova na-echeta banyere anyị? Gịnịkwa ka ọ na-eme ka o mee?

12 Gụọ Abụ Ọma 103:14. Devid kwuru na Jehova “na-echeta na anyị bụ ájá.” Devid ji okwu a kọwaa otu ihe mere Jehova ji adị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị. Ọ na-echeta mgbe niile na anyị bụ ndị mmehie. Iji ghọtakwuo ihe a nke ọma, ka anyị lebakwuo anya n’ihe ahụ Devid kwuru.

13 Devid sịrị na Jehova “ma nnọọ otú e si kee anyị.” Jehova ‘ji ájá si n’ala kpụọ’ Adam. Ọ makwa na e nwere ihe ụfọdụ mmadụ zuru okè kwesịrị ịna-eme iji dịrị ndụ, dị ka iri nri, ihi ụra, na iku ume. (Jen. 2:7) Ma, mgbe Adam na Iv mehiere, e nweziri ihe ọzọ ọ pụtara ma e kwuo na mmadụ bụ ájá. Ebe anyị bụ ụmụ ha, anyị ketara ezughị okè n’aka ha, nke na-eme ka ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Ọ bụghị naanị na Jehova ma na anyị bụ ndị na-ezughị okè, Devid kwuru na “ọ na-echeta” ya. Okwu Hibru a sụgharịrị “na-echeta” ebe a nwere ike ịpụta icheta ihe ma mee ihe banyere ya. Anyị nwere ike ikwu na ihe Devid na-ekwu bụ: Jehova ghọtara na anyị ga-emejọ ihe mgbe ụfọdụ. Anyị mejọọ, ọ na-agbaghara anyị ma meere anyị ebere ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa.​—Ọma 78:38, 39.

14. (a) Olee otú Devid si kọwaa otú Jehova si agbaghara anyị? (Abụ Ọma 103:12) (b) Olee otú ihe Devid kwuru si egosi na Jehova na-agbaghara anyị kpamkpam? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Otú Jehova Si Agbaghara ma Na-echefu.”)

14 Olee ihe ọzọ ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova agbagharala anyị? (Gụọ Abụ Ọma 103:12.) Devid kwuru na Jehova gbaghara anyị, ọ na-ewepụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ “otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ.” Ọ bụ ọdịda anyanwụ kacha dịrị anya ma e si n’ọwụwa anyanwụ gawa ya. Ha abụọ emekataghị dịrị n’otu ebe. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị banyere mmehie Jehova gbaghaara? Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl sịrị: “Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, ọ na-ewepụ ya ebe dị ezigbo anya. A gaghị ahụtụdị ihe ọ bụla gbasara mmehie ahụ, ma ịnụ ísì ya ma icheta ya. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ gaghị eche banyere mmehie ahụ ma ọ bụ chetara anyị ya ọzọ.” Chegodị echiche. Mmadụ nụ ísì nri ma ọ bụ ihe ọzọ, o nwere ike ime ka o cheta ihe mere n’oge gara aga. Ma, Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, mmehie ahụ na-adị n’ebe dị ezigbo anya nke na ọ gaghịdị anụ ísì ya. Ọ pụtara na ọ gaghị eche banyere mmehie ahụ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ maka ya.​—Ezik. 18:21, 22; Ọrụ 3:19.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe Eze Devid nọ n’elu ụlọ na-ele Bat-shiba ka ọ na-asa ahụ́. 2. Ebe ọ na-ekpesi ekpere ike. 3. Ebe ọ na-echebara ihe ọ na-ede echiche.

Otú Jehova Si Agbaghara ma Na-echefu

Jehova gbaghara anyị, ọ na-echefu mmehie anyị. Ihe ọ pụtara bụ na ọ gaghị eji maka ya taa anyị ahụhụ ọzọ. (Aịza. 43:25) Weregodị Eze Devid dị ka ihe atụ. Akụkọ ya na-egosi na anyị na Jehova ka ga-abụli ezigbo enyi ọ bụrụgodị na anyị mere mmehie dị oké njọ.

Devid mere mmehie dị oké njọ. Ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ. Ma, mgbe o ji obi ya niile chegharịa, Jehova gbaghaara ya. Devid nabatara aka ná ntị a dọrọ ya, gbanwee omume ya. E nweghị mgbe ọzọ ọ hapụrụ iji obi ya niile fee Jehova.​—2 Sam. 11:1-27; 12:13.

Jehova mechara gwa Solomọn, sị: “Jiri obi gị niile jeere m ozi otú Devid nna gị jere, kwụwa aka gị ọtọ.” (1 Eze 9:4, 5) Jehova ekwughịdị banyere mmehie ndị ahụ Devid mere. Kama, o kwuru na Devid bụ nwoke ji obi ya niile fee ya ma na-akwụwa aka ọtọ. Jehova ‘ji ọtụtụ ihe ọma kwụọ ya ụgwọ’ maka otú o si kwesị ntụkwasị obi.​—Ọma 13:6.

Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, ọ naghị elekwasị anya ná mmehie ahụ ọ gbaghaara, kama ọ na-elekwasị anya n’ihe ọma ndị anyị mere ọ ga-eji maka ha kwụọ anyị ụgwọ. (Hib. 11:6) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-echeta mmehie anyị mere n’oge gara aga Jehova kpebirila ichefu.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na obi ka na-ama anyị ikpe maka mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga?

15 Olee otú ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma nke 103 si enyere anyị aka ikweta na Jehova agbagharala anyị? Ọ bụrụ na obi ka na-ama anyị ikpe maka mmehie anyị mere n’oge gara aga, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-echefu ihe Jehova na-echeta, ya bụ, m̀ na-echefu na Jehova ma na mụ ezughị okè nakwa na ọ na-agbaghara onye mmehie chegharịrị echegharị dị ka m? M̀ na-echeta ihe Jehova kpebiri ichefu, ya bụ, m̀ na-echeta mmehie Jehova gbaghaara m ma chefuo?’ Jehova anaghị eche banyere mmehie anyị mere n’oge gara aga. Anyịnwa ekwesịghịkwa ịna-eche banyere ya. (Ọma 130:3) Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, anyị ga-enwezi ike ịgbaghara onwe anyị ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga ma jiri obi ụtọ fere Jehova na-aga.

16. Mee ihe atụ gosiri na ọ dịghị mma ka obi na-ama mmadụ ikpe maka mmehie ndị o mere n’oge gara aga. (Kọwaakwa foto.)

16 Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ. Onye obi na-ama ikpe maka mmehie o mere n’oge gara aga dị ka onye kwọ ụgbọala na-aga, ma ya elegide anya n’enyo o ji ahụ ihe na-eme n’azụ. Ọ dị mma iletụ enyo ahụ anya mgbe ụfọdụ. O nwere ike ime ka onye ahụ hụ ihe ndị o kwesịrị izere n’azụ ya. Ma, ọ bụrụ na ọ chọrọ iru ebe ọ na-aga n’udo, o kwesịrị ilekwasị anya n’ihu ka ọ hụ ebe ọ na-aga. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. O nwere ike ịbara anyị uru mgbe ụfọdụ ka anyị cheta ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga ka anyị si na ya mụta ihe ma kpebisie ike na anyị agaghị eme ya ọzọ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụzi ihe anyị na-eche mgbe niile, obi nwere ike ịna-ama anyị ikpe nke na anyị agaghịzi emeli ihe ndị anyị kwesịrị ime n’ozi Jehova. Kama ime otú ahụ, ka anyị lekwasị anya n’ụzọ anyị nọ na ya. Anyị nọ n’ụzọ na-eduba n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa, bụ́ ebe ‘a na-agaghịzi echeta’ ihe ọjọọ ọ bụla.​—Aịza. 65:17; Ilu 4:25.

Ebe otu nwoke na-ele anya n’enyo o ji ahụ ihe na-eme n’azụ mgbe ọ na-anya ụgbọala n’ụzọ gbagọrọ agbagọ.

Otú ahụ onye na-akwọ ụgbọala kwesịrị ịna-elekwasị anya n’ụzọ ọ na-agba na ya kama ilekwasị anya n’enyo o ji ahụ ihe na-eme n’azụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya ná ngọzi ndị Jehova ga-agọzi anyị n’ọdịnihu kama ilekwasị anya n’ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


NA-EME KA OBI NA-ESIKWU GỊ IKE NA JEHOVA AGBAGHARALA GỊ

17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ka obi na-esikwu anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ dị njikere ịgbaghara anyị?

17 Anyị kwesịrị ime ka obi na-esikwu anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ dị njikere ịgbaghara anyị. (1 Jọn 3:19) Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ike agaghị agwụ Setan ịgbalị ime ka anyị kweta na Chineke agaghị ahụli anyị n’anya nakwa na ọ gaghị agbagharali anyị. Nke ọ bụla ọ chọrọ ime ka anyị kweta, ọ bụ otu ihe ahụ ka ọ chọrọ ka anyị mee, ya bụ, ka anyị kwụsị ife Jehova. Anyị kwesịrị ịtụ anya na Setan ga na-agbasikwu mbọ ike ime ihe a n’ihi na ọ ma na oge ya fọrọ ntakịrị. (Mkpu. 12:12) Anyị ekwesịghị ikwe ka o merie.

18. Gịnị ka ị ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ dị njikere ịgbaghara gị mmehie gị?

18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka obi na-esikwu gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, mee ihe e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka obi sie gị ike na Jehova na-agbaghara anyị mmehie, tụgharịa uche n’otú o si kọwaa onwe ya. Cheekwa banyere ihe ndị dere Baịbụl kwuru gbasara otú o si agbaghara mmehie. Echefukwala na ọ ma na i zughị okè nakwa na ọ ga-emere gị ebere. Chetakwa na mgbe ọ bụla ọ gbaghaara gị, ọ na-agbaghara gị kpamkpam. Ihe a ga-eme ka obi sie gị ike na ọ ga-emere gị ebere otú obi siri Devid, gị asị, “Jehova, i meela ‘gbaghara m mmehie m niile.’”​—Ọma 32:5.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ikweta na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị?

  • Olee ihe ga-enyere gị aka ikweta na Jehova agbagharala gị mmehie gị?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ka obi na-esi anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị?

ABỤ NKE 1 Àgwà Jehova

a Gụọ isiokwu bụ́ “Bịaruo Chineke Nso​—Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya,” nke gbara n’Ụlọ Nche May 1, 2009.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya