AKỤKỌ NDỤ
M Ghọrọ Onye Ozi Ala Ọzọ n’Agbanyeghị na M Bụ Onye Ihere
MGBE m dị obere, m na-eme ihere, na-atụkwa ndị mmadụ ụjọ. Ma, ka oge na-aga, Jehova nyeere m aka ịhụ ndị mmadụ n’anya nakwa ịbụ onye ozi ala ọzọ. Olee otú o si mee ya? Nke mbụ, Jehova ji papa m kụziere m ọtụtụ ihe ọma. O jikwa otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na isii nyere m aka. N’ikpeazụ, o ji okwu ọma bara uru di m na-agwa m mee ya. Ka m kọọrọ gị banyere onwe m.
A mụrụ m n’afọ 1951 na Viena dị n’Ọstria. Nne na nna m bụ ndị Katọlik. Abụ m onye ihere. Ma, m kweere na Chineke, na-ekpekwa ekpere ọtụtụ ugboro. Mgbe m dị afọ itoolu, papa m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, obere oge, mama m esonyere ya.
Mụ na nwanne m nwaanyị bụ́ Elisabeth (ọ bụ ya nọ n’aka ekpe)
N’oge na-adịghị anya, anyị sonyeere Ọgbakọ Döbling dị na Viena. Ezinụlọ anyị na-emekọ ọtụtụ ihe ọnụ, dị ka ịgụ Baịbụl na ịmụ ya, ịga ọmụmụ ihe, na iso na-arụ ọrụ ná mgbakọ. Mgbe m ka dị obere, papa m kụziiri m iji obi m niile hụ Jehova n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na papa m na-ekpe ekpere mgbe niile ka mụ na nwanne m nwaanyị ghọọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ma n’oge ahụ, ọ bụghị ihe m chọrọ ime.
OTÚ M SI MALITE OZI OGE NIILE
E mere m baptizim n’afọ 1965, mgbe m dị afọ iri na anọ. Ma, o siiri m ike ịgakwuru ndị m na-amaghị zie ha ozi ọma. M na-echekarị na ụmụaka ibe m ka mụ mma. M chọsikwara ike ka ihe m masị ha. N’ihi ya, obere oge m mechara baptizim, mụ na ndị na-anaghị efe Jehova malitere ịkpa. Ọ bụ eziokwu na obi na-atọ m ụtọ ma mụ na ha nọrọ, ma akọnuche m nọ na-enye m nsogbu n’ihi na mụ na ndị na-anaghị efe Jehova na-anọ ogologo oge. M chọrọ ịgbanwe. Ma, o kweghị m. Gịnị nyeere m aka?
Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka Dorothée (ọ bụ ya nọ n’aka ekpe)
N’oge ahụ, otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Dorothée batara n’ọgbakọ anyị. Otú o si nụwa ọkụ n’obi n’ozi ọma ụlọ n’ụlọ masịrị m. M ji obere ihe tọ ya. Ma, anaghị m ekwusa ozi ọma otú yanwa si ekwusa. M gwara onwe m, sị: ‘Nne na nna m bụ Ndịàmà Jehova. Ma, ọ bụ naanị Dorothée bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha. Ya na mama ya ahụ́ na-esighị ike bi. N’agbanyeghị ya, ọ na-apụta ozi ọma mgbe niile.’ Otú o si anụ ọkụ n’obi mere ka m chọọ ịgbakwu mbọ n’ozi Jehova. N’oge na-adịghị anya, mụ na Dorothée bidoro ịsụkọ ụzọ ọnụ. Anyị bu ụzọ bido ịsụ ụzọ inyeaka, mechaa sụwa ụzọ oge niile. Otú ahụ ozi ọma si atọgbu ya atọgbu mekwara ka ozi ọma tọwa m ezigbo ụtọ. O nyeere m aka inweta onye mbụ m mụwaara Baịbụl. Ka oge na-aga, obi ruwaziri m ala ịgakwuru ndị mmadụ zie ha ozi ọma n’ụlọ ha, n’okporo ámá, nakwa n’ebe ndị ọzọ.
N’afọ mbụ m sụwara ụzọ, e nwere otu nwanna bụ́ onye Ọstria batara n’ọgbakọ anyị. Aha ya bụ Heinz. Ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova na Kanada mgbe ọ gara ileta nwanne ya nwoke bụ́ Onyeàmà Jehova. E zitere Nwanna Heinz n’ọgbakọ anyị dị na Viena ka ọ bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ihe ya masịrị m malite n’oge mbụ m hụrụ ya. Ma, ọ chọrọ ịbụ onye ozi ala ọzọ. Mụnwa achọghịkwanụ ịbụ onye ozi ala ọzọ. N’ihi ya, ná mmalite, ekweghị m eme ka ọ mata na ihe ya masịrị m. Ma, mụ na ya malitere ịkpa, mechaa lụọ, bidokwa ịsụkọ ụzọ ọnụ n’Ọstria.
OTÚ OZI ALA ỌZỌ SI GỤWA M AGỤỤ
Di m Heinz na-agwakarị m otú o si agụsi ya agụụ ike ịbụ onye ozi ala ọzọ. Ọ bụ eziokwu na e nweghị mgbe o nyewere m nsogbu ịbụ onye ozi ala ọzọ, ma ọ na-ajụ m ajụjụ ga-enyere m aka ichebara ya echiche, ajụjụ ndị dị ka, “Ebe ọ bụ na anyị enweghị ụmụ, ọ̀ bụ na anyị agaghị agbakwu mbọ n’ozi Jehova?” Ebe ọ bụ na m bụ onye ihere, ụjọ nọ na-atụ m ịbụ onye ozi ala ọzọ. Ọ bụ eziokwu na abụ m ọsụ ụzọ n’agbanyeghị na m bụ onye ihere, ma m chere na ije ozi ala ọzọ ga-esiri m ezigbo ike. Ma, di m weturu obi na-enyere m aka ichebara ya echiche. Ọ gbara m ume ilekwasị anya n’otú m ga-esi nyere ndị mmadụ aka karịa iche banyere onwe m. Ihe ahụ ọ gwara m nyeere m ezigbo aka.
Ebe di m Heinz na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’obere ọgbakọ na-eji asụsụ Sabo-Kroeshan amụ ihe na Sazbọg dị n’Ọstria n’afọ 1974
Ije ozi ala ọzọ ji nwayọọ nwayọọ masịwa m. N’ihi ya, anyị tinyere akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, nwanna na-elekọta alaka ụlọ ọrụ n’oge ahụ tụụrụ anyị aro ka m buru ụzọ mụkwuo Bekee. M mere ihe ahụ o kwuru. M gbalịrị mụọ Bekee. Mgbe afọ atọ gachara, ọ tụrụ anyị n’anya na e zigara anyị n’ọgbakọ na-eji asụsụ Sabo-Kroeshan amụ ihe na Sazbọg, dị n’Ọstria. Anyị jere ozi afọ asaa n’ebe a na-asụ asụsụ ahụ, rụọkwa ọrụ sekit otu afọ. Asụsụ ahụ siri ike. Ma, e nwere ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl.
N’afọ 1979, a gwara anyị ka anyị gaa nọọ obere oge na Bọlgeria. Ebe ọ bụ na a machiri ozi ọma anyị iwu n’ebe ahụ, a gwara anyị ka anyị nọrọ ebe ahụ ka ndị gara ezumike. A gwara anyị ka anyị ghara ikwusa ozi ọma, kama ka anyị na-ezoro ezoro ewebata akwụkwọ anyị ndị e mere ka ha dị obere ma wegara ha ụmụnna nwaanyị ise bi na Sofia bụ́ isi obodo Bọlgeria. Ezigbo ụjọ tụrụ m. Ma, Jehova nyeere m aka ịrụ ọrụ ahụ. Mgbe m hụrụ otú ụmụnna nwaanyị ndị ahụ si kata obi ma na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na e nwere ike ịtụ ha mkpọrọ, obi bịara sie m ike ịna-eme ike m niile n’ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara m mee.
Mgbe oge ụfọdụ gara, anyị tinyere akwụkwọ ọzọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Na nke ugbu a, a kpọrọ anyị. Anyị chere na anyị ga-aga ụlọ akwụkwọ ahụ n’Amerịka, bụ́ ebe a ga-eji Bekee kụzie ya. Ma, n’ọnwa Nọvemba afọ 1981, a malitere inwe Ngalaba Ụlọ Akwụkwọ Gilied na Visbadin dị na Jamanị. N’ihi ya, anyị gara ụlọ akwụkwọ ahụ n’ebe ahụ. E jikwa asụsụ Jaman kụzie ya. Asụsụ nke a kaara m mfe. Ebee ka a ga-eziga anyị?
IJE OZI N’EBE A LỤRỤ AGHA UGBORO UGBORO
Ebe e zigara anyị bụ Kenya. Ma, alaka ụlọ ọrụ dị na Kenya jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ịga jewe ozi na Yuganda, bụ́ obodo dị nso na Kenya. Ihe karịrị afọ iri tupu oge ahụ, otu onye agha aha ya bụ Idi Amin weghaara ọchịchị na Yuganda. N’afọ ndị sochiri ya, e gburu ọtụtụ puku mmadụ, ihe ana-esikwara ọtụtụ nde mmadụ ezigbo ike n’obodo ahụ. N’afọ 1979, a kwaturu ọchịchị ya. Ihe a niile mere ka ụjọ tụwa m ịga jewe ozi n’ụdị obodo ahụ a lụrụla agha na ya ugboro ugboro. Ma, Ụlọ Akwụkwọ Gilied akụzielara anyị ịtụkwasị Jehova obi. N’ihi ya, anyị kwetara ịga.
Ibi na Yuganda siri ezigbo ike. Di m kwuru gbasara ya n’Akwụkwọ Mgbaafọ Bekee nke afọ 2010, sị: “Ndị ọchịchị enweghị ike inye ndị mmadụ mmiri, ọkụ eletrik, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Telefon anaghịkwa arụ ọrụ. A na-agba ndị mmadụ égbè, na-ezurukwa ihe ha, karịchaa n’abalị. N’ihi ya, chi jihaala, onye ọ bụla na-anọ n’ụlọ na-ekpe ekpere ka mmadụ ghara ịbịa zuru ihe ha ma ọ bụ gbuo ha.” N’agbanyeghị nsogbu ahụ niile, ụmụnna nọ ebe ahụ ka jikwa obi ụtọ na-efe Jehova.
Ebe anyị na-esi nri n’ụlọ Nwanna Waiswa
N’afọ 1982, mụ na di m rutere Kampala bụ́ isi obodo Yuganda. Ruo ọnwa ise, anyị nọrọ n’ụlọ otu nwanna aha ya bụ Sam Waiswa na Christina nwunye ya. Ha nwere ụmụ ise, nweekwa mmadụ anọ bụ́ ndị ikwu ha ha na ha bi. Nwanna Waiswa na nwunye ya na ụmụ ha na-erikarị naanị otu ugboro nri n’ụbọchị. N’ihi ya, otú ha si emesapụ aka tọgburu anyị atọgbu. N’oge anyị bi n’ụlọ ha, mụ na di m mụtara ọtụtụ ihe baara anyị uru n’ozi ala ọzọ anyị jere. Dị ka ihe atụ, anyị mụtara iji obere mmiri asa ahụ́ nakwa iji mmiri anyị ji saa ahụ́ gaa mposi. N’afọ 1983, mụ na di m chọtara ụlọ n’ebe ọgba aghara na-adịchaghị na Kampala.
Ikwusa ozi ọma tọrọ anyị ụtọ n’ebe ahụ. M chetara na n’ime otu ọnwa, anyị nyere ndị mmadụ magazin karịrị puku anọ (4,000). Ma, ihe kacha tọọ anyị ụtọ bụ ịhụ otú ndị mmadụ si ege ntị n’ozi ọma. Ha na-akwanyere Chineke ùgwù. Ha na ndị ọzọ ikwu gbasara Baịbụl na-amasịkwa ha. Mụ na di m na-enwekarị ihe dị ka mmadụ iri ruo mmadụ iri na ise onye nke ọ bụla n’ime anyị na-amụrụ Baịbụl. Anyị sikwa n’aka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl mụta ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ha na-eji ụkwụ aga ọmụmụ ihe ndị a na-enwe n’izu ọ bụla, e nweghị mgbe ọ bụla ha mere mkpesa. Ọnụ na-abụ ha ọchị ọchị mgbe niile.
N’afọ 1985 na 1986, a lụrụ agha abụọ ọzọ na Yuganda. Anyị na-ahụkarị ụmụaka e ji mere ndị agha. Ha na-ebu égbè nọchie ụzọ na-eche nche. N’oge ahụ, anyị na-ekpe ekpere ka Jehova nye anyị amamihe, meekwa ka obi ruo anyị ala ma anyị nọrọ n’ozi ọma. Jehova zara ekpere anyị. Anyị na-echefudị na ụjọ na-atụ anyị mgbe ọ bụla anyị hụrụ onye chọrọ ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa.
Mụ na di m Heinz na Tatjana (Tatjana nọ n’etiti)
Obi dịkwa anyị ụtọ izi ndị si esi bịa Yuganda ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị ziri otu nwoke aha ya bụ Murat Ibatullin na Dilbar nwunye ya ozi ọma, mụọkwara ha Baịbụl. Ha si n’obodo Tatastan dị na Rọshịa bịa Yuganda. Murat bụ dọkịta. Ya na nwunye ya mechara mee baptizim. Ha ka na-efekwa Jehova. Mgbe e mechara, e nwekwara otu nwaanyị si Yukren m ziri ozi ọma. Aha ya bụ Tatjana Vileyska. N’oge ahụ, obi nọ na-ajọ ya njọ nke na o chewere echiche igbu onwe ya. Mgbe o mechara baptizim, ọ laghachiri Yukren, mechaakwa soro na-asụgharị akwụkwọ anyị.a
EBE ỌZỌ E ZIGARA ANYỊ
N’afọ 1991, mgbe mụ na di m gara ezumike n’Ọstria, alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstria detaara anyị akwụkwọ ozi na a gbanweerela anyị ọrụ, na e zigala anyị Bọlgeria. Ruo ọtụtụ afọ, a machiri ozi ọma anyị iwu n’ụfọdụ obodo dị na Yurop. Ma, ihe gbanwere. A hapụla Ndịàmà Jehova ka ha kwusawa ozi ọma n’obodo ndị ahụ, ma na Bọlgeria. Dị ka m kwuburu, e nwere mgbe mụ na di m zooro ezoro webata akwụkwọ anyị na Bọlgeria mgbe a machiri ozi ọma anyị. Ma, ugbu a, e zigaziri anyị ebe ahụ ịga kwusaa ozi ọma.
Alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị ghara ịlaghachi Yuganda kama ka anyị gawa Bọlgeria ozugbo. N’ihi ya, anyị agaghị kwara ngwongwo anyị n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Yuganda ma ọ bụ sị ndị enyi anyị ka e mesịa. Anyị gara Betel dị na Jamanị, e bunye anyị ụgbọala, anyị ejirizie ya gawa Bọlgeria. E zigara anyị ka anyị sonyere obere ìgwè nwere ihe dị ka ndị nkwusa iri abụọ na Sofia.
E nwere ihe ndị siiri anyị ike na Bọlgeria. Nke mbụ bụ na anyị amaghị asụsụ ha. Nke abụọ bụ na naanị akwụkwọ anyị abụọ e nwere n’asụsụ Bọlgerian bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi na Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Nke atọ bụ na o siiri anyị ike ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. N’agbanyeghị ihe ndị a siiri anyị ike, obere ìgwè anyị ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma. Ndị Chọọchị Ọtọdọks matara, obi adịghịkwa ha mma maka ya. N’ihi ya, ha malitere ịkpagbu anyị.
N’afọ 1994, ndị ọchịchị wepụrụ aha Ndịàmà Jehova n’okpukpe ndị iwu kwadoro n’obodo ahụ. A nwụchiri ụfọdụ ụmụnna anyị. Ndị na-agbasa ozi nọkwa na-agbasa ụgha ndị jọgburu onwe ha banyere anyị, na-ekwu na Ndịàmà Jehova na-egbu ụmụ ha n’ihi na ha anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara, na ha na-agbakwa Ndịàmà Jehova ndị ọzọ ume ka ha gbuo onwe ha. N’ihi ya, ọ bịara siwere mụ na di m ezigbo ike ikwusa ozi ọma. Anyị gawa ozi ọma, ndị mmadụ na-abara anyị mba, na-akpọrọ anyị ndị uwe ojii, na-atụkwa anyị ihe ọ bụla ruru ha aka. Iwebata akwụkwọ anyị n’obodo ahụ ekweghị omume. Ọ bịakwara sie ezigbo ike inweta ụlọ ezumezu anyị ga-anọ na-amụ ihe. E nwedịrị mgbe ndị uwe ojii bịara kwụsị otu mgbakọ anyị nọ na-enwe. Ụdị ihe ahụ amaraghị mụ na di m ahụ́. Ọ dị ezigbo iche n’ihe a na-eme na Yuganda, bụ́ ebe ndị mmadụ na-adị njikere ịmụ Baịbụl. Ma, gịnị nyeere anyị aka iji obi ụtọ na-efe Jehova n’agbanyeghị ihe ndị a siiri anyị ike?
Iwepụta oge anyị na ụmụnna anyị ji anọrị nyeere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ. Obi dị ha ụtọ na ha mụtara eziokwu nakwa na anyị na-enyere ha aka. Anyị niile nọ na-elekọta ibe anyị, na-enyekwara ibe anyị aka. Mụ na di m mụtara na anyị ka nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’ụdị ozi ọ bụla anyị na-eje ma ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ndị mmadụ, ọ bụghị banyere nsogbu ndị bịaara anyị.
Mgbe anyị nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Bọlgeria n’afọ 2007
Ma, ka oge na-aga, ihe gbanwere. N’afọ 1998, ndị ọchịchị debakwara aha Ndịàmà Jehova ọzọ n’okpukpe ndị iwu kwadoro. N’oge na-adịghị anya, a sụgharịkwara ọtụtụ akwụkwọ anyị n’asụsụ Bọlgerian. N’afọ 2004, e nyefere Jehova alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a rụrụ n’ebe ahụ. Taa, e nwere ọgbakọ iri ise na asaa na Bọlgeria. Ndị nkwusa nọ na ya dịkwa puku abụọ, narị itoolu na iri ise na atọ (2,953). N’afọ ije ozi gara aga, ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs dị puku isii, narị anọ na iri asaa na ise (6,475). Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe e nwere naanị ụmụnna nwaanyị ise na Sofia, ma ugbu a, e nweziri ọgbakọ itoolu n’ebe ahụ. Anyị ahụla n’eziokwu na ‘onye dị ntakịrị aghọọla otu puku mmadụ.’—Aịza. 60:22.
OTÚ M SI DIE NSOGBU NDỊ BỊAARA M
E nweela ọtụtụ ọrịa m rịara. Kemgbe ọtụtụ afọ, e nweela akpụ ndị gbapụtara m n’ebe dị iche iche, ma nke gbapụtara m n’ụbụrụ. E sikwala n’ụzọ ndị siri ike gwọọ ọrịa ahụ. M gakwara India, otu dọkịta ejiri awa iri na abụọ waa m ahụ́ iji wepụ akpụ ahụ dị m n’ụbụrụ. Ma, e wepụchaghị ya. Mgbe a wachara m ahụ́ ahụ, m nọrọ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’India ruo mgbe m nwetara onwe m, anyị alaghachizie Bọlgeria jewekwa ozi anyị na-eje.
Ma, di m malitere ịrịa otu ọrịa ọjọọ mere ka ọ na-esiri ya ike ịga ije na ikwu okwu. Aka na ụkwụ na-amakwa ya jijiji. Ka ọrịa ahụ na-akakwu njọ, ọ bụzi m na-emere ya ọtụtụ ihe. Mgbe ụfọdụ, ọrụ na-ezu m ahụ́, mụ ana-echegbukwa onwe m maka otú m ga-esi na-elekọta ya. Ma, e nwere otu nwanna nwoke ka bụ́ okorobịa aha ya bụ Bobi. Ọ na-akpọ di m aga ozi ọma. Ihere anaghị eme ya maka otú di m si ekwu okwu nakwa maka na ụkwụ na aka na-ama ya jijiji. Bobi na-abịa enyere m aka mgbe niile ilekọta di m. Ọ bụ eziokwu na mụ na di m amụghị ụmụ n’ihi na anyị chọrọ ijekwuru Jehova ozi, ma obi dị anyị ụtọ na Jehova ji Bobi gọzie anyị. O weere anyị ka nne na nna ya.—Mak 10:29, 30.
Di m rịakwara kansa. Ọ dị mwute na ọ nwụrụ n’afọ 2015. Ọnwụ ya wuteruru m n’ọkpụkpụ. Ọ bụ ya na-enyeburu m aka ka m ghara ịna-echegbu onwe m. Ugbu a ọ na-anọghịzi ya, o siiri m ike. Ma, n’ime obi m, ọ dị m ka ọ̀ ka dị ndụ n’ihi na m na-eche banyere ya mgbe niile. (Luk 20:38) M na-echetakarị okwu ọma ndị ọ na-agwa m nakwa ndụmọdụ ndị ọ na-enye m mgbe ọ nọ ndụ. Obi dị m ezigbo ụtọ maka afọ ndị mụ na ya fekọrọ Jehova.
OBI DỊ M ỤTỌ NA JEHOVA NA-ENYERE M AKA
N’eziokwu, Jehova enyerela m aka idi ụdị nsogbu dị iche iche. O nyekwarala m aka ịkwụsị ime ihere, mụ aghọọ onye ozi ala ọzọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. (2 Tim. 1:7) Jehova nyeere mụ na nwanne m nwaanyị aka ịna-eje ozi oge niile ugbu a. Taa, nwanne m nwaanyị na di ya na-arụ ọrụ sekit na Yurop. Ha na-eleta ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ Sebian. Jehova azala ekpere papa m kpere mgbe anyị ka bụ ụmụaka.
Ịmụ Baịbụl na-eme ka obi ruo m ala. Amụtala m ‘ịna-ekpesi ekpere ike’ mgbe ihe siiri m ike otú ahụ Jizọs mere. (Luk 22:44) Anọ m n’ọgbakọ dị na Nadezda, dị na Sofia. Otú ụmụnna nọ na ya si hụ m n’anya ma na-emere m ihe ọma bụ otu ụzọ Jehova si aza ekpere m. Ha na-akpọ m ka mụ na ha nọrịa, na-agwakarịkwa m otú ha si jiri m kpọrọ ihe. Ọ na-eme m ezigbo obi ụtọ.
M na-echekarị banyere mbilite n’ọnwụ. M na-eji uche m ahụ nne na nna m n’ihu ụlọ anyị ka ha mara mma otú ha mara n’oge ha lụrụ. M na-ahụ ka nwanne m nwaanyị na-esi nri. M na-ahụkwa ka di m guzo n’akụkụ ịnyịnya ya. Iche ụdị ihe ndị a na-eme ka uche m pụọ n’ihe ndị na-adịchaghị mma, meekwa ka obi dị m ụtọ maka ihe Jehova na-emere m.
M chee banyere ihe ndị mere ná ndụ m nakwa banyere ọdịnihu, m na-eji obi m niile ekweta ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 27:13, 14. Ọ sịrị: “Ebee ka m gaara anọ ma a sị na enweghị m okwukwe na m ga-anọ ndụ hụ otú Jehova si dị mma? Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ. Nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike. Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.”
a Gụọ akụkọ Nwanna Nwaanyị Tatjana Vileyska na Teta! Bekee nke December 22, 2000, peeji nke 20 ruo 24.