Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 34
  • M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 34

M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee, Chineke ga-aza ekpere gị. Ma akụkọ a kọrọ na Baịbụl ma ihe ndị mere ndị mmadụ na-egosi na Chineke na-aza ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha. Ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.” (Abụ Ọma 145:19) Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke za ekpere gị, ị ga-ekpe ya otú ọ chọrọ ka i si kpee ya.

Ihe Chineke chọrọ ka ndị na-ekpegara ya ekpere mee

  • Chineke chọrọ ka anyị na-ekpegara naanị ya ekpere. Ọ chọghị ka anyị na-ekpegara Jizọs, Meri, ndị nsọ, ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ihe oyiyi ekpere. Naanị Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.”​—Abụ Ọma 65:2.

  • Na-ekpe ekpere kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme bụ́ ndị dị na Baịbụl.​—1 Jọn 5:14.

  • Na-ekpe ekpere n’aha Jizọs. Nke ahụ na-egosi na ị na-akwanyere Jizọs ùgwù. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”​—Jọn 14:6.

  • Ejila obi abụọ ekpe ekpere. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Chineke nyekwuo gị okwukwe, rịọ ya ka o nye gị ya.​—Matiu 21:22; Luk 17:5.

  • Dịrị obi umeala ma si n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị elu, ma ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.”​—Abụ Ọma 138:6.

  • Ike agwụla gị n’ikpe ekpere. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.”​—Luk 11:9.

Ihe ndị na-agaghị egbochi Chineke ịnụ ekpere gị

  • Obodo i si ma ọ bụ agbụrụ gị. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  • Otú i si nọrọ mgbe ị na-ekpe ekpere. I nwere ike ịnọ ọdụ, hulata isi, gbuo ikpere n’ala, ma ọ bụ guzoro ọtọ mgbe ị na-ekpe ekpere.​—1 Ihe E Mere 17:16; Nehemaya 8:6; Daniel 6:10; Mak 11:25.

  • Ikpepụta ekpere gị ekpepụta ma ọ bụ ikpe ya n’obi gị. Chineke na-azadị ekpere mmadụ kpere n’obi ya.​—Nehemaya 2:1-6.

  • Na mkpa gị buru ibu ma ọ bụ na o bughị ibu. Chineke gwara anyị ka anyị ‘na-atụkwasị ya nchegbu anyị niile, n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’​—1 Pita 5:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya