Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 32
  • Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ihe Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi
  • Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
    Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
  • Imeri n’agha a na-ebuso obi ịda mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ụzọ A Ga-esi Nyere Ndị Dara Mba n’Obi Aka Inwetaghachị Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 32

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee, o nwere ike inyere gị aka, n’ihi na onye ga-akacha enyere gị aka bụ Chineke. Baịbụl kwuru na Chineke bụ “onye nkasiobi nke ndị obi dara mba.”​—2 Ndị Kọrịnt 7:6, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi

  • Ike. Otú Chineke ga-esi akasi gị obi abụghị iwepụ nsogbu gị niile. Kama, ihe Chineke ga-emere gị bụ ịza ekpere i kpegaara ya ka o nye gị ike ị ga-eji die nsogbu ndị bịaara gị. (Ndị Filipaị 4:13) Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-aza ekpere gị n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Chineke nwedịrị ike ịnụ mkpu ị na-eti ka o nyere gị aka, a sịgodị na ị maghị otú ị ga-esi kọwaa ihe bụ́ nsogbu gị.​—Ndị Rom 8:26, 27.

  • Ndị anyị ga-amụta ihe n’aka ha. Otu onye so dee Baịbụl kpegaara Chineke ekpere, sị: “Anọ m n’ime ogbu mmiri kpọkuo gị.” Ihe nyeere onye a so dee Baịbụl aka ka ọ kwụsị ịda mbà n’obi bụ na o chetara na Chineke na-agbaghara anyị mmehie. O kwuru, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo? N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị, ka e wee na-atụ egwu gị.”​—Abụ Ọma 130:1, 3, 4.

  • Olileanya. Ọ bụ eziokwu na Chineke na-akasi anyị obi ugbu a, o kwekwara anyị nkwa na ya ga-ewepụ nsogbu niile na-akpatara anyị ịda mbà n’obi. Mgbe ọ ga-emezu nkwa a, “a gaghị echeta ihe mbụ niile [ma ịda mbà n’obi], ha agaghị abatakwa n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

Ihe ị ga-eburu n’obi: N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova ma na Chineke na-enyere ndị dara mbà n’obi aka, ha chọpụta na ịda mbà n’obi ha aghọọla ọrịa, ha na-aga ụlọ ọgwụ. (Mak 2:17) Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa onye nwere ụdị ịda mbà n’obi a otú a ga-esi agwọ ya. Ọ bụ onye ahụ ka ọ dịịrị ikpebi otú a ga-esi agwọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya