Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • T-20 p. 2-6
  • Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
  • Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enyemaka nke Dị Ha Mkpa
  • Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Ga-ada Mbà n’Obi Ọzọ
  • Ụzọ A Ga-esi Nyere Ndị Dara Mba n’Obi Aka Inwetaghachị Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka
    Teta!—2001
  • Imeri n’agha a na-ebuso obi ịda mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi
T-20 p. 2-6

Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi

“Ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Nhụjuanya nke mmadụ dị ukwuu mgbe e dere ihe ahụ n’ihe karịrị afọ 1,900 gara aga. Ọtụtụ ndị dara mbà n’obi. N’ihi ya, a gbara ndị Kraịst ume, sị: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.

Taa, ahụhụ nke mmadụ dị ukwuu ọbụna karị, ọtụtụ ndị na-adakwa mbà n’obi karịa otú ha datụworo. Ma nke ahụ ò kwesịrị iju anyị anya? O kwesịghị n’ezie, n’ihi na Bible na-akọwa oge ndị a dị ka “mgbe ikpeazụ,” na-akpọkwa ha “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5) Jisọs Kraịst buru amụma na ná mgbe ikpeazụ, a ga-enwe “ihe di egwu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ n’ụdị dị iche.)—Luk 21:7-11; Matiu 24:3-14.

Mgbe ndị mmadụ nọ ná nchegbu, egwu, iru újú, ma ọ bụ n’ọnọdụ mmetụta uche ndị ọzọ na-adịghị mma ruo ogologo oge, ọtụtụ mgbe ha na-ada mbà n’obi. Ihe na-akpata ịda mbà n’obi ma ọ bụ oké mwute pụrụ ịbụ ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, ịgba alụkwaghịm, ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ, ma ọ bụ ọrịa na-adịghị akwụsị akwụsị. Ndị mmadụ na-adakwa mbà n’obi mgbe ha nwere echiche nke ịbụ ndị na-abakwaghị uru, mgbe ha nwere echiche nke na ha emezughị ihe a tụrụ anya n’aka ha wee mechuo mmadụ nile ihu. Ọnọdụ na-eweta oké nchekasị pụrụ ịkpa onye ọ bụla aka ọjọọ, ma mgbe mmadụ na-adịkwaghị enwe olileanya, na-adịkwaghị ahụ ụzọ ọ bụla ọ ga-esi pụọ n’ọnọdụ ọjọọ, ọ pụrụ ịkpata oké ịda mbà n’obi.

Ndị mmadụ n’oge ochie nwere ụdị mmetụta ndị ahụ. Job rịara ọrịa ma nwee ihe ndabara ọjọọ. O chere na Chineke agbahapụwo ya, n’ihi ya o kwupụtara oké ịkpọasị o nwere n’ebe ndụ dị. (Job 10:1; 29:2, 4, 5) Jekọb dara mbà n’obi n’ihi na o yiri ka nwa ya ọ̀ nwụwo, ọ jụrụ ịbụ onye a kasiri obi ma nwee ọchịchọ ịnwụ. (Jenesis 37:33-35) N’inwe obi amamikpe n’ihi mmehie dị oké njọ, Eze Devid kwara ákwá, sị: “Ogologo ụbọchị nile ka m jegharịworo na-eyi uwe mkpe [“m jegharịworo n’iwe,” NW]. Ahụ m esinwụwo.”—Abụ Ọma 38:6, 8; 2 Ndị Kọrint 7:5, 6.

Taa, ọtụtụ mmadụ adawo mbà n’obi n’ihi ịdọli ndọlị, na-anwa ịgbaso usoro ime ihe kwa ụbọchị nke karịrị ike echiche, mmetụta, na ọkpụkpụ aka ha. O doro anya na nchekasị, tinyere echiche na mmetụta na-ezighị ezi, pụrụ ịkpa ahụ mmadụ aka ọjọọ ma mee ka onye ahụ ghara inwe ịha nhata nke mmiri ahụ dị n’ụbụrụ, si otú a na-akpata ịda mbà n’obi.—Tụlee Ilu 14:30.

Enyemaka nke Dị Ha Mkpa

Epafrọdaịtọs, onye Kraịst nke narị afọ mbụ bụ́ onye si Filipaị, “[dara mbà n’obi, NW] n’ihi na [ndị enyi ya] nụrụ na ahụ ya adịghị ike.” Epafrọdaịtọs, onye dara ọrịa mgbe ndị enyi ya zigasịrị ya Rom iwegara Pọl onyeozi ihe, ma eleghị anya chere na ya emechuwo ndị enyi ya ihu, na ha ewerewo ya dị ka onye na-emezughị ihe a tụrụ anya n’aka ya. (Ndị Filipaị 2:25-27; 4:18) Olee otú Pọl onyeozi si nye aka?

O zilara Epafrọdaịtọs ụlọ, nyekwa ya akwụkwọ ozi maka ụmụnna ndị Filipaị, nke sịrị: “Werenụ ọṅụ nile nara [Epafrọdaịtọs] nke ọma n’ime Onyenwe anyị; na-asọpụrụkwanụ ndị dị otú a.” (Ndị Filipaị 2:28-30) Eziokwu ahụ bụ́ na Pọl kwuru okwu ọma banyere ya nakwa na ndị Filipaị jiri obi ụtọ na ịhụnanya nabata ya, aghaghị n’ezie ịgụgụworịị Epafrọdaịtọs ma nye aka n’ime ka ịda mbà n’obi ya belata.

N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ndụmọdụ Bible nyere ka a ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi’ bụ nke kasị nnọọ mma. “Ọ dị gị mkpa ịmara na ihe banyere gị kpọmkwem na-emetụ ndị ọzọ n’obi,” ka otu nwanyị daburu mbà n’obi kwuru. “Ọ dị gị mkpa ịnụ ka mmadụ sịrị, ‘Aghọtara m; ahụ ga-adịcha gị mma.’”

Ọ dị mkpa ọtụtụ mgbe ka onye ahụ dara mbà n’obi bute ụzọ n’ime ihe site n’ịchọpụta onye nwere ọmịiko, onye ọ ga na-akọrọ ihe banyere onwe ya. Onye a kwesịrị ịbụ onye na-ege ntị nke ọma na onye nwere nnọọ ndidi. O kwesịrị izere ịgwa onye dara mbà n’obi ọtụtụ okwu ma ọ bụ ikwu okwu amamikpe, dị ka, ‘I kwesịghị ịdị na-enwe mmetụta dị otú ahụ’ ma ọ bụ, ‘Nke ahụ bụ àgwà na-adịghị mma.’ Ihe na-emetụta onye dara mbà n’obi ngwa ngwa, nanị ihe okwu nkatọ ndị dị otú ahụ ga-emekwa bụ ime ka echiche ya banyere onwe ya dịkwuo njọ.

Onye dara mbà n’obi pụrụ iche na ya abaghị uru. (Jona 4:3) Ma, mmadụ kwesịrị icheta na ihe dị mkpa n’ezie bụ ụzọ Chineke si were mmadụ dị ka onye bara uru. Ụmụ mmadụ ‘ledara,’ Jisọs Kraịst ‘anya’ ma nke a agbanweghị uru ọ baara Chineke n’ezie. (Aịsaịa 53:3) Jide n’aka na dị nnọọ ka Chineke si hụ Ọkpara ọma ya n’anya, ọ hụkwara gị n’anya.—Jọn 3:16.

Jisọs nwere ọmịiko n’ahụ ndị dara mbà n’obi ma gbalịa inyere ha aka ịhụ uru ha bara n’otu n’otu. (Matiu 9:36; 11:28-30; 14:14) Ọ kọwara na Chineke na-agụ ọbụna obere nnụnụ egwele na-adịghị otú ọ hà n’ihe bara uru. “A dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke,” ka o kwuru. Lee ka ọ ga-esi were ụmụ mmadụ ndị na-agbalị ime uche ya dị ka ndị bara nnọọ uru karị! Banyere ndị a, Jisọs kwuru, sị: “Ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo.”—Luk 12:6, 7.

N’ezie, ọ pụrụ isiri onye nwere oké ịda mbà n’obi ike, bụ́ onye adịghị ike na mmehie ya rikpuworọ, ikwere na Chineke na-agụ ya n’onye bara uru nke ukwuu. Ọ pụrụ iche n’ezie na o kwesịghị inweta ịhụnanya na nlekọta Chineke. “Obi anyị na-ama anyị ikpe,” ka Okwu Chineke na-ekweta. Ma nke ahụ ọ̀ bụ ya na-ekpebi ihe? Ee e, ọ bụghị. Chineke maara na ụmụ mmadụ na-emehie emehie pụrụ iche echiche na-ezighị ezi, ọbụnakwa maa onwe ha ikpe. Ya mere Okwu ya na-akasi ha obi, sị: “Chineke ka obi anyị ukwuu, ọ makwaara ihe nile.”—1 Jọn 3:19, 20.

Ee, Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-ahụ gabiga mmehie na ihie ụzọ anyị. Ọ maara banyere ọnọdụ ndị anyị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha, ụzọ ndụ anyị dum, ebumnuche na nzube anyị dị iche iche. Ọ maara na anyị ketara mmehie, ọrịa, na ọnwụ, n’ihi ya kwa nwee ọtụtụ ihe mgbochi. Eziokwu ahụ bụ́ na anyị na-enwe mwute ma na-ewesa onwe anyị iwe bụ ihe na-egosi n’onwe ya na anyị achọghị ime mmehie, na anyị agamibeghị nke ukwuu. Bible sịrị na “n’okpuru ihe efu” ka e doro anyị megide uche anyị. Ya mere Chineke na-egosi obi ebere n’ihi ọnọdụ nhụjuanya anyị, ọ na-ejikwa ọmịiko na-echebara adịghị ike anyị echiche.—Ndị Rom 5:12; 8:20.

E mesiri anyị obi ike na “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara. Dị ka ihu anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ, otú a ka o meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:8, 12, 14) N’ezie, Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

Enyemaka nke dị ndị dara mbà n’obi mkpa karịsịa bụ ha ịbịa Chineke ha nke obi ebere nso na ịnara òkù ọ na-akpọ ha ‘ịtụkwasị ya ibu ha.’ N’ezie ọ pụrụ “ime ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.” (Abụ Ọma 55:22; Aịsaịa 57:15) Ya mere Okwu Chineke na-agba ume ka a na-ekpe ekpere, sị: “Na-atụkwasị [Jehova] nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ee, site n’ekpere na ịrịọ arịrịọ, ndị mmadụ pụrụ ịbịa Chineke nso ma nwee “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile.”—Ndị Filipaị 4:6, 7; Abụ Ọma 16:8, 9.

Ime mgbanwe ndị bara uru n’otú o si ebi ndụ pụkwara inyere mmadụ aka imeri mmetụta nke ịda mbà n’obi. Mmega ahụ, iri nri na-edozi ahụ, ịnara ikuku ndụ na inwe ezumike dị otú o kwesịrị, na izere ikiribiga TV ókè dịcha mkpa. Otu nwanyị enyeworo ndị dara mbà n’obi aka site n’ime ka ha gasie ije ike. Mgbe otu nwaada nwere ịda mbà n’obi sịrị: “Achọghị m ịgagharị,” nwanyị ahụ jiri ụzọ dị nwayọọ, n’ejighị egwuregwu zaghachi, sị: “Ee, ị ga-agagharị.” Nwanyị ahụ kọrọ, sị: ‘Anyị gara ije ruo kilomita isii. Mgbe anyị lọtara, ike gwụsịrị ya, ma ahụ dị ya mma karị. Ị pụghị ịma ụzọ mmega ahụ siri ike pụrụ isi bụrụ ihe inye aka ruo mgbe ị nwalere ya.’

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ọ bụ ihe na-apụghị ikwe mee imericha ịda mbà n’obi, ọbụna mgbe a nwalesịrị ihe nile, tinyere usoro ọgwụgwọ ọrịa. “Anwalewo m ihe nile,” ka otu nne nwanyị kwuru, “ma ịda mbà n’obi ahụ ka dị.” N’otu aka ahụ, ọ bụ ihe na-adịghị ekwekebe omume ugbu a ịgwọta ndị ìsì, ndị ntị chiri, ma ọ bụ ndị ngwụrọ. Otú ọ dị, ndị dara mbà n’obi pụrụ inweta nkasi obi na olileanya site n’ịgụ Okwu Chineke mgbe nile, bụ́ nke na-enye olileanya e ji n’aka maka nnwere onwe na-adịgide adịgide pụọ n’ahụhụ nile nke mmadụ.—Ndị Rom 12:12; 15:4.

Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Ga-ada Mbà n’Obi Ọzọ

Mgbe Jisọs kọwara ihe ndị dị egwu ga-abịakwasị elu ala na mgbe ikpeazụ, o kwukwara, sị: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Jisọs na-ekwu banyere mgbapụta baa n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, bụ́ ebe “a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21.

Lee ihe ahụ efe ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ndị e mere ka ha nwere onwe ha pụọ n’ibu dị iche iche nke oge gara aga na iteta kwa ụbọchị na-enwe uche dị ezigbo ọcha, dịrị njikere ịrụ ọrụ dịịrị ụbọchị ahụ! Ọ dịkwaghị onye oké ịda mbà n’obi ga na-emebiri ụbọchị. Nkwa e ji n’aka nke e kwere ihe a kpọrọ mmadụ bụ na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile e mere sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya