Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 111
  • Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee ụfọdụ amụma dị na Baịbụl gbasara “oge ikpeazụ”?
  • Ànyị bi “n’oge ikpeazụ”?
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Otú Anyị Si Mara na Anyị Nọ na “Mgbe Ikpeazụ”
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 111
Foto dị iche iche na-egosi ihe ndị e ji ama “oge ikpeazụ.” 1. Ụkọchukwu na-ekwu okwu chukwu. 2. Ụgbọala e ji alụ agha. 3. Onye ahụ́ na-adịghị dina n’àkwà. 4. Ebe nwatakịrị agụụ ji ji efere ihe na-adịghị n’ime. 5. Ndị na-eme ngagharị iwe. 6. Ebe mmadụ na-achọ ịgba égbè.

Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru ihe ndị ga na-eme n’ụwa, otú ihe ga-adị, nakwa otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà, bụ ihe ndị na-egosi na anyị bi ‘n’ọgwụgwụ oge.’ (Matiu 24:3) Baịbụl kpọkwara oge a “oge ikpeazụ.”—2 Timoti 3:1; Daniel 8:19.

Olee ụfọdụ amụma dị na Baịbụl gbasara “oge ikpeazụ”?

Baịbụl kwuru na ọtụtụ ihe ga na-eme n’otu mgbe, nke ga-abụ “ihe àmà” na-egosi na a nọ n’oge ikpeazụ. (Luk 21:7) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ:

A ga na-alụ agha ebe dị iche iche n’ụwa. Jizọs buru amụma, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:7) Akwụkwọ Mkpughe 6:4 kwukwara na onye na-agba ịnyịnya, onye nọchiri anya agha, ‘ga-ewepụ udo n’ụwa.’

Ụkọ nri. Jizọs kwuru, sị: “A ga-enwekwa ụkọ nri.” (Matiu 24:7) Akwụkwọ Mkpughe kwukwara gbasara onye ọzọ na-agba ịnyịnya. Onye a nke nwere ihe ọ nọchịrị anya ya ga-eme ka nri dị ụkọ ebe dị iche iche n’ụwa.—Mkpughe 6:5, 6.

Oké ala ọma jijiji. Jizọs kwuru na a ga-enwe “ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:7; Luk 21:11) Oké ala ọma jijiji a nke ga na-eme ebe dị iche iche n’ụwa ga-akpatara ndị mmadụ ahụhụ, taakwa isi imirikitiimi ndị mmadụ.

Ọrịa. Jizọs kwukwara na ọrịa na-efe efe ga-adị ebe dị iche iche.—Luk 21:11.

Mpụ. Ọ bụ eziokwu na mpụ dị kemgbe ọtụtụ narị afọ, ma Jizọs kwuru na ‘mmebi iwu ga-eju ebe niile’ n’oge ikpeazụ.—Matiu 24:12.

Imebisi ụwa. Akwụkwọ Mkpughe 11:18 kwuru na a ga-enwe ndị “na-ebibi ụwa.” E nwere ọtụtụ ụzọ ha ga-esi na-ebibi ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ tigbuo zọgbuo, nrụrụ aka, na imetọsị ebe dị iche iche.

Àgwà ọjọọ. N’akwụkwọ 2 Timoti 3:1-4, Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị, ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi.” N’ihi otú àgwà ndị a si ju ebe niile, ihe Baịbụl kwuru gbasara oge anyị a dabara adaba. Ọ sịrị na oge anyị a dị “oké egwu, taakwa akpụ.”

Nsogbu ezinụlọ. N’akwụkwọ 2 Timoti 3:2, 3, Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị ga-egosi ndị ezinụlọ ha na ha enweghị “obi mmadụ” nakwa na ụmụaka ga “na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.”

Ndị na-ahụghịzi Chineke n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) Ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara bụ na ọtụtụ ndị agaghịzi ahụ Chineke n’anya. Akwụkwọ 2 Timoti 3:4 kwukwara na n’oge ikpeazụ, ihe ga-abụ mkpa ụdị ndị ahụ bụ “ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya.”

Ndị okwu ọzọ eme ọzọ nọ n’okpukpe. N’akwụkwọ 2 Timoti 3:5, Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha agaghị na-eme ihe o kwuru.

Ọtụtụ ndị ga-aghọta amụma ndị dị na Baịbụl. Akwụkwọ Daniel kwuru na “n’oge ọgwụgwụ,” eziokwu dị na Baịbụl ọtụtụ ndị ga-ama ga-ehi nne. Ịghọta ihe amụma ndị a anyị na-ekwu gbasara ha n’isiokwu a pụtara so n’eziokwu ndị ahụ ha ga-ama.—Daniel 12:4.

A ga na-ekwusa ozi oma ebe niile n’ụwa. Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.”—Matiu 24:14.

Ndị na-achọghị ịma gbasara Baịbụl na ndị na-akwa emo ga-eju ebe niile. Jizọs kwuru na e nweghị ihe ọtụtụ ndị ga-eji ihe ndị doro anya na-egosi na ọgwụgwụ adịla nso kpọrọ. (Matiu 24:37-39) Ma, nke kadị njọ bụ na 2 Pita 3:3, 4 kwuru na ụfọdụ ndị ga-eji ihe ndị ahụ na-eme ihe ọchị, na-ekwu na e nweghị ihe ha na-egosi.

Amụma niile dị na Baịbụl ga-emezu. Jizọs kwuru na otú a ga-esi ama na anyị nọ n’oge ikpeazụ bụ na amụma a niile dị na Baịbụl ndị na-egosi na anyị nọ n’oge ikpeazụ ga na-emezu otu mgbe, ọ bụghị ụfọdụ n’ime ha ma ọ bụdị ọtụtụ n’ime ha.—Matiu 24:33.

Ànyị bi “n’oge ikpeazụ”?

N’eziokwu, anyị bi n’oge ikpeazụ. Ihe ndị na-eme n’ụwa na mgbakọ na mwepụ e ji oge ndị dị na Baịbụl mee na-egosi na oge ikpeazụ malitere n’afọ 1914. Ọ bụ n’afọ ahụ ka a malitere ịlụ Agha Ụwa nke Mbụ. Ị chọọ ịhụ otú ihe ndị na-eme n’ụwa si egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, lee vidio a:

Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Otu n’ime ike ndị mbụ ọ kpara bụ isi n’eluigwe chụpụ Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ, ha anọrọzie n’ụwa na-akpa arụ. (Mkpughe 12:7-12) Otú ndị mmadụ si akpa àgwà na ihe na-adịghị mma ndị ha na-eme na-egosi na Setan na-akpa ha aka ọjọọ. Ọ bụkwa ihe ndị a mere ka oge ikpeazụ dịrị “oké egwu, taakwa akpụ.”—2 Timoti 3:1.

Ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha n’ihi otú oge a si dị oké egwu. Otú ụwa si bụrụ chi bọọ anụ ọzọ na-echu ha ụra. Ụfọdụ na-echedị na ọ bụrụ na a maghị nke e mere na ndị mmadụ nwere ike ịla ibe ha n’iyi.

E nwekwara ndị ihe ndị na-eme n’ụwa na-enye nsogbu n’obi, ma, ha nwere olileanya na ihe ga-emecha dị mma. Obi siri ha ike na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu niile na-echi anyị ọnụ n’ala kwụsị. (Daniel 2:44; Mkpughe 21:3, 4) Ha nwere ndidi, na-eche mgbe Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere anyị. Ihe Jizọs kwuru na-akasi ha obi. Ọ sịrị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13; Maịka 7:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya