7 Ụmụ Bila bụ Ezbọn, Ọzaị, Ọziel, Jerimọt, na Aịraị. Ha dị ise. Ha bụ ndị isi n’ọnụmara ha dị iche iche, bụrụkwa ndị dike n’agha. E debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ dị iche iche. Ha dị puku mmadụ iri abụọ na abụọ na mmadụ iri atọ na anọ (22,034).+