15 Johenan nwa Kariya nọkwa na Mizpa gwa Gedalaya na nzuzo, sị: “Achọrọ m ịga gbuo Ishmel nwa Netanaya. E nweghị onye ga-ama ma m gbuo ya. Gịnị mere ọ ga-eji gbuo gị? Gịnịkwa mere ndị Juda niile bụ́ ndị na-alọghachikwute gị ga-eji gbasasịa, ndị fọrọ na Juda alaakwa n’iyi?”