7 N’oge Jeruselem nọ n’ahụhụ nakwa n’oge ọ na-enweghịzi ụlọ, o chetara
Ihe ya niile bara ezigbo uru ndị dịwara kemgbe ụwa.+
Mgbe ndị ya dabara n’aka onye iro ha, mgbe ọ na-enweghịkwa onye na-enyere ya aka,+
Ndị iro ya hụrụ ya mgbe ọ dara, chịwa ya ọchị.+