24 Ya mere, ha gwarịtara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị kpebie site n’ife nza onye ọ ga-abụ nke ya.” Nke a bụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe elu m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.”+ Otú a kwa ka ndị agha ahụ mere ihe ndị a n’ezie.