5 N’ihi ya, unu ekpela ihe ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, ruo mgbe Onyenwe anyị ga-abịa,+ bụ́ onye ga-eme ka ihe nzuzo dị iche iche nke ọchịchịrị pụta ìhè,+ meekwa ka ihe e bu n’obi pụta ìhè,+ mgbe ahụkwa ka onye ọ bụla ga-enweta otuto ya site n’aka Chineke.+