Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Taa

Mọnde, Ọktoba 13

Jehova na-ahụ ihe dị n’obi. ​—1 Sam. 16:7.

Ọ bụrụ na e nwere mgbe ụfọdụ anyị na-eche na anyị abaghị uru, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova n’onwe ya dọtara anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ọ hụrụ àgwà ọma anyị nwere, nke o nwere ike ịbụ na anyị anaghị ahụ. Ọ makwa obi anyị. (2 Ihe 6:30) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi mgbe ọ sịrị na anyị bara ezigbo uru n’anya ya. (1 Jọn 3:19, 20) Tupu anyị amụta eziokwu, ụfọdụ n’ime anyị mere ihe ndị nwere ike ime ka akọnuche anyị na-ama anyị ikpe ruo ugbu a. (1 Pita 4:3) E nwedịrị Ndị Kraịst ji obi ha niile na-efe Jehova na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ime ihe na-adịghị mma. Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na Jehova agaghị agbagharali gị? Ọ bụrụ otú ahụ, icheta na e nweela ndị ji obi ha niile fee Jehova chere otú ahụ ga-akasi gị obi. Dị ka ihe atụ, obi anaghị adị Pọl onyeozi mma ma o cheta ihe ndị ọ na-anaghị emeta. (Rom 7:24) Ma, n’eziokwu, Pọl echegharịala ná mmehie ya ma mee baptizim. N’agbanyeghị ya, ọ kpọrọ onwe ya onye “kacha nta” n’ime ndịozi nakwa ‘onye kacha bụrụ onye mmehie.’​—1 Kọr. 15:9; 1 Tim. 1:15. w24.03 27 ¶5-6

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Tuzdee, Ọktoba 14

Ha hapụrụ ụlọ Jehova.​—2 Ihe 24:18.

Otu ihe anyị na-amụta n’ihe na-adịghị mma Eze Jehoash mere bụ na ndị anyị kwesịrị imeta enyi bụ ndị ezigbo mmadụ hụrụ Jehova n’anya, nakwa ndị chọrọ ịna-eme ya obi ụtọ. Ọ bụghị naanị ndị ọgbọ anyị ka anyị kwesịrị ịna-emeta enyi. Cheta na Jehoyada tọgburu Jehoash bụ́ enyi ya atọgbu. A bịa n’ihe gbasara ndị ị na-emeta enyi, jụọ onwe gị, sị: ‘Hà na-enyere m aka ka okwukwe m nwere na Jehova sikwuo ike? Hà na-agba m ume ịna-eme ihe Jehova chọrọ? Hà na-ekwu gbasara Jehova na eziokwu ndị ọ na-akụziri anyị? Hà ji iwu Jehova kpọrọ ihe? Hà na-agwa m ihe m chọrọ ịnụ, ka hà na-akata obi gbazie m ma m mewe ihe na-adịghị mma?’ (Ilu 27:5, 6, 17) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị enyi gị ahụghị Jehova n’anya, gị na ha ekwesịghị ịbụ enyi. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya, jisie ha ike. Ha ga na-enyere gị aka.​—Ilu 13:20. w23.09 9-10 ¶6-7

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Wenezdee, Ọktoba 15

Abụ m Alfa na Omega.​—Mkpu. 1:8.

Ihe bidoro abịịdịị ndị Grik bụ alfa, nke ikpeazụ ya abụrụ omega. Mgbe Jehova kwuru “Alfa na Omega,” ihe ọ na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ọ malitere ime ihe, ọ na-emecharịrị ya. Mgbe Jehova kechara Adam na Iv, ọ sịrị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.” (Jen. 1:28) N’oge ahụ, e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa.” O mere ka nzube ya doo anya, ya bụ, na oge na-abịa mgbe ụmụ Adam na Iv na-erube isi ma zuo okè ga-eju n’ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova mezuchara nzube ya a, ọ ga-adị ka ebe ọ sịrị “Omega.” Mgbe o kechara “eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha,” o kwuru ihe gosiri na nzube ya ga-emezurịrị. Jehova mere ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Ọ ga-emezucha ya ná ngwụcha ụbọchị nke asaa ahụ.​—Jen. 2:1-3. w23.11 5 ¶13-14

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya