Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Taa

Tọzdee, Ọktoba 23

Ka unu kwụsie ike, gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike na ntọala okwukwe unu.​—Efe. 3:17.

Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, ihe anyị kwesịrị ịghọta abụghị naanị ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi. Anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ka anyị mụta “ọbụnadị amamihe Chineke nke dị omimi.” (1 Kọr. 2:9, 10) I nwere ike ime ezigbo nchọnchọ ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova nso. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmụ otú Jehova si gosi ndị fere ya n’oge ochie na ọ hụrụ ha n’anya na otú akụkọ ahụ si egosi na Jehova hụkwara gị n’anya. I nwekwara ike ịmụ gbasara otú Jehova si hazie ka e si na-efe ya n’Izrel oge ochie nakwa otú o si yie otú Ndị Kraịst si efe ya taa. I nwekwara ike imekwu nchọnchọ gbasara amụma ndị Jizọs mezuru mgbe ọ nọ n’ụwa. Ịmụ gbasara isiokwu ndị ahụ ga-atọgbu gị atọgbu. Ihe ga-enyere gị aka ịmụ ha bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Ịmụ Baịbụl nke ọma nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike, nyekwara gị aka ‘ịmụta banyere Chineke.’​—Ilu 2:4, 5. w23.10 18-19 ¶3-5

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Fraịdee, Ọktoba 24

Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya, n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya. ​—1 Pita 4:8.

Okwu Grik Pita onyeozi ji kọwaa ‘iji obi anyị niile’ pụtara “ịgbasa ihe.” Ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ kọwara ihe ga-eme ma anyị jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Ọ ga-ekpuchi mmehie ụmụnna anyị. Anyị nwere ike iji ihe atụ a kọwaa ya. Ka e were ya na ihe kawasịchara elu tebụl anyị. Anyị nwere ike were ákwà gbasaa n’elu tebụl ahụ. Ákwà ahụ ga-ekpuchi ọtụtụ ihe na-adịghị mma na tebụl ahụ, ọ bụghị ihe ole na ole. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị ga-adị njikere ịgbaghara ha ma ha mejọọ anyị. Otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya kwesịrị isi ike nke na anyị ga na-agbaghara ha mmehie ha ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike mgbe ụfọdụ. (Kọl. 3:13) Anyị gbaghara ndị ọzọ, ọ na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya nakwa na anyị chọrọ ime Jehova obi ụtọ. w23.11 11-12 ¶13-15

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Satọdee, Ọktoba 25

Shefan maliteziri ịgụrụ ya eze. ​—2 Ihe 34:18.

Mgbe Eze Josaya gbara afọ iri abụọ na isii, ọ malitere ịrụzi ụlọ nsọ. Ka a na-arụ ọrụ ahụ, a hụrụ “akwụkwọ e dere Iwu Jehova si n’aka Mosis nye.” Mgbe Josaya nụrụ ihe e kwuru na ya, ọ malitere ozugbo ịgbanwe ihe iji mee ihe e dere na ya. (2 Ihe 34:14, 19-21) Ị̀ ga-achọ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? Ọ bụrụ na ị malitela ịgụ ya, ọ̀ na-atọ gị ụtọ? Ị̀ na-ede amaokwu Baịbụl ndị i chere ga-abara gị uru? Mgbe Josaya dị ihe dị ka afọ iri atọ na itoolu, o mejọrọ ihe tara isi ya. Ọ tụkwasịrị onwe ya obi kama ịrịọ Jehova ka o duzie ya. (2 Ihe 35:20-25) E nwere ihe anyị ga-amụta na ya. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ afọ ole anyị mụrụla Baịbụl, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịchọ Jehova. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ekpe ekpere mgbe niile na-arịọ Jehova ka o duzie anyị, na-amụ Baịbụl, na-egekwa ntị na ndụmọdụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ na-enye anyị. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe dị oké njọ, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ.​—Jems 1:25. w23.09 12 ¶15-16

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya