Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
Ịma Ọkwa
Asụsụ ndị ọhụrụ e tinyere: Betsileo
  • Taa

Sọnde, Ọktoba 26

Ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke, ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.​—Jems 4:6.

Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị hụrụ Jehova n’anya ma fee ya. Ha “na-emeru ihe n’ókè,” bụrụkwa “ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.” (1 Tim. 3:11) Ụmụnna nwaanyị nwekwara ike ịchọta ụmụnna nwaanyị tozuru etozu n’ọgbakọ ha ndị ha ga na-akpa àgwà ka ha. Ụmụnna nwaanyị na-eto eto, ọ ga-adị mma ka unu chọpụta ụfọdụ ụmụnna nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst tozuru etozu ndị unu ma unu nwere ike ịna-akpa àgwà ka ha. Chọpụta àgwà ọma ndị ha nwere. Chezie otú i nwere ike isi na-akpa àgwà ndị ahụ. Àgwà dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu bụ ịdị umeala n’obi. Ọ bụrụ na nwaanyị adịrị umeala n’obi, ya na Jehova na ndị ọzọ ga-adị ná mma. Dị ka ihe atụ, nwaanyị hụrụ Jehova n’anya na-adị umeala n’obi ma na-akwado ndokwa Nna ya nke eluigwe mere ka e nwee onyeisi. (1 Kọr. 11:3) Ihe a ga-abara ya uru ma n’ọgbakọ ma n’ezinụlọ. w23.12 18-19 ¶3-5

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Mọnde, Ọktoba 27

Ndị bụ́ di kwesịkwara isi otú ahụ hụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya.​—Efe. 5:28.

Jehova chọrọ ka di hụ nwunye ya n’anya, na-egboro ya mkpa ya, na-emekwa ka obi dị ya mma nakwa ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ịna-echebara ihe echiche nke ọma, ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, na ịbụ onye a ga-atụkwasịli obi, ga-enyere gị aka ịbụ ezigbo di. Ọ bụrụ na ị lụọ nwaanyị, i nwere ike ịghọ nna. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka Jehova gbasara ịbụ ezigbo nna? (Efe. 6:4) Jehova gwara Ọkpara ya Jizọs n’ebe ndị ọzọ nọ na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17) Ọ bụrụ na ị ghọọ nna, gbalịsie ike ka ị na-emesi ụmụ gị obi ike mgbe niile na ị hụrụ ha n’anya. Na-aja ha mma mgbe niile maka ihe ndị ha na-emeta. Ọ bụrụ na ndị nna ana-eme ka Jehova, ha ga-enwe ike inyere ụmụ ha aka ịghọ Ndị Kraịst tozuru etozu. Ị ga-enwekwa ike ibido ugbu a na-akwadebe maka ọrụ ahụ dị mkpa. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ iji obiọma na-elekọta ndị ezinụlọ gị na ndị nọ n’ọgbakọ, mụtakwa ịna-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya nakwa na i ji ha kpọrọ ihe.​—Jọn 15:9. w23.12 28-29 ¶17-18

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025

Tuzdee, Ọktoba 28

[Jehova] ga-eme . . . ka unu kwụrụ chịm.​—1 Pita 5:10.

Ọ bụ eziokwu na anyị na-efe Jehova, anyị na-enwekwa nsogbu ma na-arịa ọrịa otú ọ na-adị ndị ọzọ. Ndị kpọrọ ndị Chineke asị nwekwara ike ịna-emegide anyị. Ọ bụ eziokwu na Jehova anaghị ewepụrụ anyị ụdị nsogbu ndị a, ma o kwere nkwa na ọ ga-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10) O nwere ike inyere anyị aka anyị ana-enwe ọṅụ, na-eme mkpebi dị mma ma na-efe ya ọ bụrụgodị na nsogbu siri ezigbo ike abịara anyị. Jehova kwere nkwa inye anyị ihe Baịbụl kpọrọ “udo Chineke na-enye.” (Fil. 4:6, 7) Ụdị udo a na-ekwu okwu ya ebe a bụ otú obi si eru anyị ala ma anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Udo a “karịrị nghọta mmadụ.” Ọ na-akpa ezigbo ike karịa otú anyị nwere ike iche n’echiche. È nwetụla mgbe obi ruru gị ala otú ị na-atụghị anya ya mgbe i kpesiri ekpere ike? Ọ bụ ya bụ “udo Chineke na-enye.” w24.01 20 ¶2; 21 ¶4

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya