Fraịdee, Ọktoba 31
Nna m hụrụ unu n’anya maka na unu hụrụ m n’anya, unu ekwerekwala na m bịara ka onye nnọchiteanya Chineke.—Jọn 16:27.
Ọ na-amasị Jehova ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya na ihe ha masịrị ya. Baịbụl kwuru ugboro abụọ ọ gwara Jizọs na ọ bụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17; 17:5) Ị̀ ga-achọ ka Jehova gwa gị na ihe gị masịrị ya? Jehova anaghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu. Ma, ọ na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl agwa anyị okwu. Ọ bụrụ na anyị agụọ okwu Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, ọ ga-adị ka ànyị na-anụ ka Jehova na-agwa anyị okwu ndị ahụ. Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. N’ihi ya, anyị gụọ otú Jizọs si gwa ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ezughị okè na ihe ha masịrị ya, anyị ga-ewere ya na ọ bụ anyị ka Jehova na-agwa okwu ndị ahụ. (Jọn 15:9, 15) Anyị tawa ahụhụ, ọ pụtaghị na ihe anyị amasịghịzi Jehova. Kama, ọ bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya nakwa na anyị tụkwasịrị ya obi.—Jems 1:12. w24.03 28 ¶10-11
Satọdee, Nọvemba 1
I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị.—Mat. 21:16.
Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere ụmụ gị aka ịkwadebe azịza ha ga-aza nke ga-adaba n’afọ ole ha dị. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-amụ ihe ndị dị ezigbo mkpa n’ọmụmụ ihe, dị ka nsogbu di na nwunye ma ọ bụkwanụ otú anyị ga-esi zere omume rụrụ arụ. Ma, e nwekwara ike inwe otu paragraf ma ọ bụ abụọ ụmụaka nwere ike ịza ajụjụ na ha. I kwesịkwara inyere ụmụ gị aka ka ha ghọta ihe mere na ọ bụghị mgbe ọ bụla ha weliri aka ka e nwere ike ịkpọ ha ka ha zaa ajụjụ. Ịkọwara ha ihe a ga-eme ka iwe ghara iwe ha ma a kpọọ ndị ọzọ ka ha zaa ajụjụ kama ịkpọ hanwa. (1 Tim. 6:18) Anyị niile ga-enweli ike ịkwadebe ezigbo azịza ga-eme ka e too Jehova ma gbaa ụmụnna anyị ume. (Ilu 25:11) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkọ ihe ụfọdụ gbasara onwe anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-ekwukarị gbasara onwe anyị. (Ilu 27:2; 2 Kọr. 10:18) Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe kacha anyị mkpa bụrụ ikwu gbasara Jehova, Okwu ya, na ndị ya.—Mkpu. 4:11. w23.04 24-25 ¶17-18
Sọnde, Nọvemba 2
Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma.—1 Tesa. 5:6.
Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya ka anyị nwee ike ịmụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma. (Mat. 22:37-39) Ịhụ Chineke n’anya ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ozi ọma anyị na-ekwusa n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara anyị. (2 Tim. 1:7, 8) Ebe ọ bụ na anyị hụrụ ndị na-anaghị efe Jehova n’anya, anyị na-ezi ozi ọma ọ bụrụgodị iji akwụkwọ ozi na ekwentị ezi ya. Anyị nwekwara olileanya na otu ụbọchị, ndị mmadụ ga-agbanwe ma bido ime ihe dị mma. (Ezik. 18:27, 28) Anyị kwesịkwara ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ ‘ịna-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’ (1 Tesa. 5:11) Anyị na-agba ibe anyị ume otú ahụ ndị agha nọ n’ọgbọ agha na-emere ibe ha. Anyị anaghị akpachara anya eme ihe ga-ewute ụmụnna anyị ma ọ bụ jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọjọọ. (1 Tesa. 5:13, 15) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-asọpụrụ ụmụnna ndị na-eduzi ọgbakọ.—1 Tesa. 5:12. w23.06 9 ¶6; 11 ¶10-11