Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 140
  • Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime Ka A Zọpụta Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Baịbụl Ọ̀ Na-akụzi na ‘A Zọpụtahaala Mmadụ, A Zọpụtachaala Ya’?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 140
Ebe ndị agbụrụ dị iche iche gbara Jizọs gburu gburu

Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?

Ihe Baịbụl kwuru

Jizọs zọpụtara ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà. (Matiu 20:28) Ma, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Onye Nzọpụta nke ụwa.” (1 Jọn 4:14) O kwukwara, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.”—Ọrụ Ndịozi 4:12.

Jizọs ‘detụrụ ọnwụ ire maka mmadụ niile’ nwere okwukwe na ya. (Ndị Hibru 2:9; Jọn 3:16) N’ihi ya, “Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya,” ya alaghachi n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke. (Ọrụ Ndịozi 3:15) Mgbe Jizọs ruru ebe ahụ, o nweziri ike “ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.”—Ndị Hibru 7:25.

Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ka Jizọs rịọchitere anyị arịrịọ?

Anyị niile bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 3:23) Mmehie mere ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma, na-akpatakwara anyị ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ma, Jizọs bụ ‘onye na-ekwu ọnụ ndị niile nwere okwukwe na ya.’ (1 Jọn 2:1, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ na-ekwuchite ọnụ ha, na-arịọ Chineke ka ọ nụ ekpere ha ma gbaghara ha n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Matiu 1:21; Ndị Rom 8:34) Chineke na-eme ihe ahụ Jizọs rịọchiteere anyị n’ihi na ha kwekọrọ n’uche Ya. Chineke zitere Jizọs n’ụwa “ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.”—Jọn 3:17.

Ọ̀ bụ onye kwerehaala na Jizọs a zọpụta ya?

Mba. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ibu ụzọ kwere na Jizọs tupu enwewe ike ịzọpụta anyị. Ma, e nwere ihe ọzọ dị mkpa. (Ọrụ Ndịozi 16:30, 31) Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ ihe nwụrụ anwụ, otú ahụkwa, okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) Ka e nwee ike ịzọpụta anyị, anyị kwesịrị:

  • Ịmụta gbasara Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova.—Jọn 17:3.

  • Inwe okwukwe na ha.—Jọn 12:44; 14:1.

  • Irubere ha isi iji gosi na anyị nwere okwukwe na ha. (Luk 6:46; 1 Jọn 2:17) Jizọs kwuru na ọ bụghị onye ọ bụla na-akpọ ya “Onyenwe anyị” ka a ga-azọpụta, kama ọ bụ naanị ndị “na-eme uche Nna [ya] nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.”—Matiu 7:21.

  • Ịnọgide na-egosi na anyị nwere okwukwe n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe. Jizọs mere ka nke a doo anya mgbe o kwuru, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya