Isi nke 40
Ịzọpịa Isi Agwọ Ahụ
Ọhụụ 14—Mkpughe 20:1-10
Isiokwu: Ịtụba Setan n’abyss ahụ, Ọchịchị Puku Afọ ahụ, ule ikpeazụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, na mbibi Setan
Oge mmezu ya: Malite n’ọgwụgwụ nke mkpagbu ukwu ahụ ruo ná mbibi nke Setan
1. Olee ụzọ mmezu nke amụma mbụ dị na Bible siworo gaa n’ihu?
Ì CHETARA amụma mbụ ahụ dị na Bible? Ọ bụ Jehova Chineke buru ya mgbe ọ gwara Agwọ ahụ, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echipịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echipịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ugbu a, mmezu nke amụma ahụ na-eru ọgwụgwụ ya! Anyị agbasowo akụkọ ihe mere eme nke agha Setan lụrụ megide nzukọ eluigwe Jehova nke yiri nwanyị. (Mkpughe 12:1, 9) Mkpụrụ elu ala nke Agwọ ahụ, ya na okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na oké azụmahịa ya, ejiriwo obi ọjọọ kpagbuo mkpụrụ nke nwanyị ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst na 144,000 ndị e tere mmanụ na-eso ụzọ ya, ndị nọ n’elu ala ebe a. (Jọn 8:37, 44; Ndị Galetia 3:16, 29) Setan mere ka Jisọs nwụọ ọnwụ ihe mgbu. Ma nke a yiri nnọọ mmerụ ahụ ikiri ụkwụ, n’ihi na Chineke kpọlitere Ọkpara ya ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ.—Ọrụ 10:38-40.
2. Olee ụzọ e si chipịa Agwọ ahụ, gịnịkwa mere mkpụrụ Agwọ ahụ nke dị n’elu ala?
2 Gịnị banyere Agwọ ahụ na mkpụrụ ya? N’ihe dị ka 56 O.A. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Rom otu akwụkwọ ozi dị ogologo. N’imechi ya, ọ gbara ha ume site n’ịsị: “Ma Chineke nke udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu ọsọ ọsọ.” (Ndị Rom 16:20) Nke a karịrị mmerụ ahụ elu ahụ efu. A gaje ịzọpịa Setan! N’ebe a, Pọl jiri okwu Grik bụ, syn·triʹbo mee ihe, nke pụtara ịzọtọsị ihe azọtọsị, ịzọda ihe n’ala, ibibi kpam kpam site ná nzọpịa. N’ihe banyere mkpụrụ Agwọ ahụ nke bụ ụmụ mmadụ, mmezu nke a dị nso n’oké ihe otiti nke ga-ewere ọnọdụ n’ụbọchị Onyenwe anyị, na-ejedebe ná mkpagbu ukwu ahụ ná nzọpịa zuru ezu a ga-azọpịa Babilọn Ukwu ahụ na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke ụwa, ha na ndị na-akwado ha n’ụzọ ego na n’ụzọ ibu agha. (Mkpughe, isi nke 18 na 19) Otú a, Jehova na-eweta n’isi njedebe ọbụbụiro ahụ nke dị n’etiti mkpụrụ abụọ ahụ. Mkpụrụ nke nwanyị Chineke na-enwe mmeri n’ebe mkpụrụ elu ala nke Agwọ ahụ dị, mkpụrụ ahụ agaghị adịkwa ọzọ!
A Tụba Setan n’Abyss
3. Gịnị ka Jọn gwara anyị na ọ gaje ime Setan?
3 Ya mere, gịnị na-echere Setan n’onwe ya na ndị mmụọ ọjọọ ya? Jọn na-agwa anyị, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ, ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị: mgbe afọ ndị a gasịrị a ghaghị ịtọpụ ya nwa oge.”—Mkpughe 20:1-3.
4. Ònye bụ mmụọ ozi nke ji mkpịsị ugodi abyss ahụ, ànyị sikwa aṅaa mara?
4 Ònye bụ mmụọ ozi nke a? Ọ ghaghị inwe ike dị ukwuu iji nwee ike iwepụ onye iro kasị ukwuu nke Jehova. Ọ na-eji “mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ.” Nke a ọ́ dịghị echetara anyị otu ọhụụ bu nke a ụzọ? Ee, a kpọrọ eze igurube ndị ahụ “mmụọ ozi ahụ nke abyss ahụ”! (Mkpughe 9:11) Ya mere, n’ebe a ka anyị na-ahụkwa Onyeisi Na-ewepụ Jehova n’Ụta ọzọ, bụ́ Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube, ka ọ nọ n’ọrụ. Onyeisi ndị mmụọ ozi nke a nke chụpụrụ Setan site n’eluigwe, nke kpere Babilọn Ukwu ahụ ikpe, nke kpochapụkwara “ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha” n’Amagedọn agajeghị inye ohere ka mmụọ ozi dị ala karị weta oké ihe otiti ahụ nke ịtụba Setan n’abyss!—Mkpughe 12:7-9; 18:1, 2; 19:11-21.
5. Olee otú mmụọ ozi nke abyss ahụ si meso Setan bụ Ekwensu, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
5 Mgbe a tụdara oké dragọn ahụ na-acha ọkụ ọkụ site n’eluigwe, e kwuru okwu banyere ya dị ka “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:3, 9) Ugbu a, mgbe a na-akwado ijide ya ma tụba ya n’ime abyss, a na-akọwakwa ya ọzọ n’ụzọ zuru ezu dị ka “dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan.” A na-eke ajọ onye ndọgbu, onye nduhie, onye nkwutọ, na onye mmegide nke a agbụ wee tụba ya “n’ime abyss ahụ,” nke e mechiri wee kachisie ya akara ike, “ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ.” Ọnụnọ Setan ga-anọ n’abyss bụ ruo otu puku afọ, bụ́ mgbe mmetụta ọ na-enwe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ na-agaghị adịkwa ike dị ka nke onye mkpọrọ a tụbara n’ime olulu dị omimi. Mmụọ ozi nke abyss ahụ na-ewepụ Setan kpam kpam site ná mmekọrịta ọ bụla n’etiti ya na Alaeze nke ezi omume ahụ. Lee nnọọ ihe nnwere onwe nke a ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ!
6. (a) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ndị mmụọ ọjọọ ahụ ga-abanyekwa n’abyss ahụ? (b) Gịnị ga-enwe ike ịmalite ugbu a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
6 Gịnị ga-eme ndị mmụọ ọjọọ ahụ? ‘E debewokwa ha ka e wee kpee ha ikpe.’ (2 Pita 2:4) A kpọrọ Setan “Beelzebul onyeisi ndị mmụọ ọjọọ.” (Luk 11:15, 18; Matiu 10:25) N’ihi njikọ aka nọworo ogologo oge nke ha na Setan, ọ̀ bụ na e kwesịghị imezu otu ikpe ọmụma ahụ n’isi ha? Eri ogologo oge, abyss ahụ abụrụwo ihe egwu nye ndị mmụọ ọjọọ ndị ahụ; n’otu oge mgbe Jisọs chere ha ihu, ha ‘nọgidere na-arịọ ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha jee baa n’abyss.’ (Luk 8:31) Ma mgbe a tụbara Setan n’abyss, o doro anya na a ghaghị ịtụbakọ ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abyss ahụ. (Tụlee Aịsaịa 24:21, 22.) Mgbe a tụbasịrị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime abyss, Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst ga-enwe ike ịmalite.
7. (a) N’ọnọdụ dị aṅaa ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-anọ mgbe ha nọ n’ime abyss ahụ, ànyị sikwa aṅaa mara? (b) Hedis na abyss ahụ hà bụ otu ihe? (Lee nkọwa ala ala peji.)
7 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya hà ga-anọ na-arụ ọrụ n’oge ha nọ n’ime abyss ahụ? Ọ dị mma, cheta anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, nke nwere isi asaa, bụ́ nke “dịrị, ọ dịghịkwa ugbu a; ọ gajekwa isi n’abyss ahụ rịgopụta.” (Mkpughe 17:8) Mgbe ọ nọ n’ime abyss ahụ, ọ “dịghịkwa.” Ọ nọ n’ọnọdụ nke arụghị ọrụ, bụrụ nke a kụjisiworo ụkwụ na aka, bụrụkwa nke nwụrụ anwụ n’echiche na nzube nile. N’otu aka ahụ, n’ikwu okwu banyere Jisọs, Pọl onyeozi sịrị: “Ònye ga-arịda n’abyss ahụ? (nke ahụ bụ, isi ná ndị nwụrụ anwụ kugota Kraịst.)” (Ndị Rom 10:7) Mgbe ọ nọ n’ime abyss ahụ, Jisọs bụ onye nwụrụ anwụ.a Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya ikwubi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ga-anọ n’ọnọdụ arụghị ọrụ nke yiri ọnwụ ruo otu puku afọ ahụ ha ga-anọ n’ime abyss. Lee nnọọ ozi na-enye obi ụtọ nke a bụụrụ ndị hụrụ ezi omume n’anya!
Ndị Ikpe ruo Otu Puku Afọ
8, 9. Gịnị ka Jọn na-agwa anyị ugbu a banyere ndị na-anọkwasị n’ocheeze, olee ndị ka ndị dị otú ahụ bụkwa?
8 Mgbe otu puku afọ ahụ gasịrị, a ga-esite n’abyss ahụ tọhapụ Setan ruo nwa oge. Ọ bụ n’ihi gịnị? Tupu o nye azịza ya, Jọn na-adọrọ uche anyị gaghachi ná mmalite nke ogologo oge ahụ. Anyị na-agụ, sị: “M wee hụ ocheeze, ha wee nọkwasị ha, e wee nye ha ikpe.” (Mkpughe 20:4a) Olee ndị bụ ndị a na-anọkwasị n’ocheeze, ndị sokwa Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube na-achị achị n’eluigwe?
9 Ha bụ “ndị nsọ” ahụ Daniel kọwara na ha so Onye ahụ “nke dị ka nwa nke mmadụ” na-achị achị n’Alaeze ahụ. (Daniel 7:13, 14, 18) Ha na 24 ndị okenye ahụ ndị na-anọkwasị n’ocheeze dị iche iche n’ihu Jehova bụ otu ihe ahụ. (Mkpughe 4:4) Ha gụnyere ndị ozi 12 ahụ, ndị Jisọs kwere nkwa ahụ bụ: “Unu onwe unu ndị sooro m, n’ịmụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya, unu onwe unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Matiu 19:28) Ha gụnyekwara Pọl, gụnyekwa ndị Kraịst ahụ nọ na Kọrint bụ́ ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi. (1 Ndị Kọrint 4:8; 6:2, 3) Ha ga-agụnyekwa ndị nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Leọdisia, bụ́ ndị nwere mmeri.—Mkpughe 3:21.
10. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa 144,000 ndị eze ahụ ugbu a? (b) Site n’ihe Jọn gwaworo anyị tupu ugbu a, olee ndị 144,000 ndị eze ahụ gụnyere?
10 A na-akwadebe ocheeze dị iche iche—144,000 ocheeze—maka ndị ahụ e tere mmanụ nwere mmeri, bụ́ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ, ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.” (Mkpughe 14:1, 4) Jọn gara n’ihu ikwu, sị, “M wee hụ mkpụrụ obi nke ndị e [e ji anyụike gbuo, NW] n’ihi àmà Jisọs, na n’ihi okwu Chineke, ndị ahụ nọkwa, bụ́ ndị na-akpọghị isiala nye anụ ọhịa ahụ, ma ọ bụ ihe oyiyi ya, ndị na-anataghịkwa akara ya n’egedege ihu ha na n’aka ha.” (Mkpughe 20:4b) Ya mere, n’etiti ndị eze ahụ, e nwere ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha, bụ́ ndị jụwororị Jehova n’oge a na-emeghe akara nke ise ahụ, ogologo oge hà aṅaa ọ ga-echere tupu ọ bọọ ọ́bọ̀ ọbara ha. N’oge ahụ, e nyere ha uwe mwụda dị ọcha, gwakwa ha ka ha cheretụ nwa mgbe nta. Ma ugbu a, a bọwo ọ́bọ̀ ha site ná ntikpọsị nke Babilọn Ukwu ahụ, mbibi nke mba nile site n’aka Eze ahụ kachasị ndị eze na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, sitekwa n’ịtụba Setan n’abyss.—Mkpughe 6:9-11; 17:16; 19:15, 16.
11. (a) Olee ụzọ anyị kwesịrị isi ghọta okwu ahụ bụ “e ji anyụike gbuo”? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na 144,000 dum ahụ nwụrụ ọnwụ ọchụchụ àjà?
11 Ọ̀ bụ mmadụ nile so na 144,000 ndị eze ndị a bụkwa ndị ikpe ka “e ji anyụike gbuo” n’ụzọ nkịtị? O yiri ka ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha ka e mere otú ahụ n’ụzọ nkịtị. Ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na nzube nke okwu a bụ ijikọta ndị Kraịst nile e tere mmanụ, bụ́ ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha site n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.b (Matiu 10:22, 28) N’ezie, ọ gaara amasịworị Setan iji anyụike gbuo ha nile, ma, n’ezie, ọ bụghị ụmụnna Jisọs nile ndị e tere mmanụ ga-anwụ n’ihi okwukwe ha. Ọtụtụ n’ime ha nwụrụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ ịka nká. Otú ọ dị, ndị dị otú ahụ sokwa n’ìgwè ndị ahụ Jọn hụrụ ugbu a. N’otu ụzọ, ọnwụ ha nile bụ nke ọchụchụ àjà. (Ndị Rom 6:3-5) Ọzọkwa, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ akụkụ nke ụwa. N’ihi ya, ụwa akpọwo ha nile asị, ya mere, ha aghọwokwa ndị nwụrụ anwụ n’anya ya. (Jọn 15:19; 1 Ndị Kọrint 4:13) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha fere anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ihe oyiyi ya ofufe, mgbe ha nwụkwara, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bu akara nke anụ ọhịa ahụ. Ha nile nwụrụ dị ka ndị na-enwe mmeri.—1 Jọn 5:4; Mkpughe 2:7; 3:12; 12:11.
12. Gịnị ka Jọn kọrọ banyere 144,000 ndị eze ahụ, oleekwa mgbe ịdị ndụ ha weere ọnọdụ?
12 Ugbu a, ndị a nwere mmeri na-adị ndụ ọzọ! Jọn kọrọ, sị: “Ha wee dị ndụ, sookwa Kraịst bụrụ eze [otu puku afọ].” (Mkpughe 20:4ch) Nke a ọ̀ pụtara na a dịghị akpọlite ndị ikpe ndị a site n’ọnwụ ruokwa mgbe e bibisịrị mba nile, tụbakwa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abyss? Ee e. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha amaliteworị ịdị nnọọ ndụ, ebe ọ bụ na ha sooro Jisọs nwee ihe ịga nke ọma megide mba nile n’Amagedọn. (Mkpughe 2:26, 27; 19:14) N’eziokwu, Pọl gosiri na mbilite n’ọnwụ ha malitere n’oge na-adịghị anya mgbe mmalite nke ọnụnọ Jisọs gasịrị na 1914, na a na-ebukwa ụzọ kpọlite ndị ụfọdụ n’ọnwụ tupu ibe ha. (1 Ndị Kọrint 15:51-54; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17) Ya mere, ọ na-ewe otu ogologo oge ka ha wee bịazuo ná ndụ, bụ́ mgbe ha na-anata onyinye nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe n’otu n’otu.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7; 2 Pita 3:11-14.
13. (a) Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee otu puku afọ ahụ nke 144,000 ahụ chịrị ọchịchị n’ime ya anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú Papias onye Hierapolis si lee puku afọ ahụ anya? (Lee nkọwa ala ala peji.)
13 Ịchị achị na ikpe ikpe ha ga-abụ ruo otu puku afọ. Nke a ọ̀ ga-abụ puku afọ nkịtị, ka ànyị kwesịrị ile ya anya dị ka ihe atụ dị ka nke bụ ogologo oge a na-akaghị aka? “Otu puku” pụrụ ịpụta ọnụ ọgụgụ buru ibu nke a na-akaghị aka, dị ka ọ dị na 1 Samuel 21:11. Ma n’ebe a, “otu puku” bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị, ebe ọ bụ na ọ pụtara ugbo atọ ná Mkpughe 20:5-7 dị ka ‘otu puku afọ ahụ.’ Pọl kpọrọ oge ikpe ikpe nke a “otu ụbọchị” mgbe o kwuru, sị: ‘O [Chineke] debewo otu ụbọchị, nke ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya.’ (Ọrụ 17:31) Ebe ọ bụ na Pita na-agwa anyị na otu ụbọchị n’anya Jehova dị ka otu puku afọ, o kwesịrị ekwesị na Ụbọchị Ikpe nke a ga-abụ otu puku afọ nkịtị.c—2 Pita 3:8.
Ndị Fọdụrụ n’Etiti Ndị Nwụrụ Anwụ
14. (a) Okwu dị aṅaa ka Jọn denyere banyere “ndị fọdụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ”? (b) Olee ụzọ okwu ndị Pọl onyeozi kwuru si nye aka ịghọta okwu ahụ bụ ‘ịdị ndụ’?
14 Ma, olee ndị ka ndị eze ndị a ga-ekpe ikpe ma ọ bụrụ na, dị ka Jọn onyeozi denyere n’ebe a, “ndị fọdụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị”? (Mkpughe 20:5a) Ọzọkwa, okwu ahụ bụ ‘ịdị ndụ’ bụ nke a na-aghaghị ịghọta dị ka okwu gbara ya gburugburu si dị. Okwu nke a pụrụ inwe ihe dị iche iche ọ pụtara n’ọnọdụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru banyere ndị Kraịst e tere mmanụ ibe ya, sị: “Unu onwe unu ka O [Chineke] mekwara ka unu dị ndụ, mgbe unu nọ n’ọnwụ site ná ndahie nile unu na mmehie nile unu.” (Ndị Efesọs 2:1) Ee, ndị Kraịst e ji mmụọ tee mmanụ bụ ‘ndị e mere ka ha dị ndụ,’ ọbụna n’ime narị afọ mbụ ahụ, na-abụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume n’ihe ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà Jisọs.—Ndị Rom 3:23, 24.
15. (a) Ọnọdụ dị aṅaa ka ndịàmà Jehova ndị dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst nwere n’ihu Chineke? (b) Olee ụzọ atụrụ ọzọ ahụ ga-esi ‘dị ndụ,’ oleekwa mgbe ha ga-enweta ala n’ụzọ kasị zuo ezuo?
15 N’otu aka ahụkwa, ndịàmà Jehova ndị dịrị tupu oge ndị Kraịst bụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke; Abraham, Aịsak, na Jekọb, ka e kwukwara okwu ha dị ka “ndị dị ndụ,” ọ bụ ezie na ha bụ ndị nwụrụ anwụ n’anụ ahụ. (Matiu 22:31, 32; Jemes 2:21, 23) Otú ọ dị, ọ ka bụ ihe a na-aghaghị ime bụ iweta ha na ndị ọzọ nile a kpọlitere site n’ọnwụ, tinyekwara oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị dịrị ndụ gabiga Amagedọn na ụmụ ọ bụla ha pụrụ ịmụta n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, bịa n’izu okè nke mmadụ. Ọ bụ Kraịst na ndị eze na ndị nchụàjà ya na ha ga-arụkọ ọrụ ga-emezu nke a n’ime Ụbọchị Ikpe ahụ nke ga-adịru otu puku afọ, n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. N’ọgwụgwụ nke Ụbọchị ahụ, “ndị fọdụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ” ‘ga-adịwo ndụ’ n’echiche nke bụ na ha ga-abụ ụmụ mmadụ zuru okè. Dị ka anyị gaje ịhụ, ha aghaghị ịgabiga ule ikpeazụ mgbe ahụ, ma ha ga-eche ule ahụ ihu dị ka ụmụ mmadụ zuworo okè. Mgbe ha gafere ule ahụ, Chineke ga-agụ ha ná ndị kwesịrị ịdị ndụ ebighị ebi, na-abụ ndị ezi omume n’ụzọ kasị zuo ezu. Ha ga-enweta mmezu zuru ezu nke nkwa ahụ bụ: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Lee nnọọ ọdịnihu obi ụtọ na-echere ihe a kpọrọ mmadụ ndị na-erube isi!
Mbilite n’Ọnwụ Mbụ Ahụ
16. Olee ụzọ Jọn si kọwaa mbilite n’ọnwụ ahụ nke ndị ahụ ga-eso Kraịst chịa achị dị ka eze nwetara, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
16 N’ịlaghachi ugbu a ná ndị ahụ ‘dịrị ndụ, sorokwa Kraịst bụrụ eze,’ Jọn dere, sị: “Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ.” (Mkpughe 20:5b) Ò si aṅaa bụrụ nke mbụ? Ọ bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ” n’ihe banyere oge o ji mee, n’ihi na ndị nwetara ya ‘bụụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ.’ (Mkpughe 14:4) Ọ bụkwa nke mbụ n’ihe banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị mkpa ya, ebe ọ bụ na ndị na-ekere òkè na ya ga-aghọ ndị ha na Jisọs ga-achị achị n’Alaeze eluigwe ya, ndị ga-ekpekwa ihe nile ọzọ a kpọrọ mmadụ ikpe. Nke ikpeazụ, ọ bụ nke mbụ n’ọdịdị ya. E wezụga Jisọs Kraịst n’onwe ya, ọ bụ nanị ndị ahụ a kpọlitere ná mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ bụ ihe okike e kwuru okwu ha na Bible dị ka ndị nwetara ndụ anwụghị anwụ.—1 Ndị Kọrint 15:53; 1 Timoti 6:16.
17. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa olileanya ahụ a gọziri agọzi nke ndị Kraịst e tere mmanụ? (b) Gịnị bụ “ọnwụ nke abụọ ahụ,” ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ ‘na-enweghị ike’ n’ebe 144,000 ndị ahụ nwere mmeri nọ?
17 Lee nnọọ olileanya dị ngọzi na-echere ndị a e tere mmanụ! Dị ka Jọn kwupụtara: “Ngọzi na-adịrị ya, ọ dịkwa nsọ, bụ́ onye nwere òkè n’ime mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ: ọnwụ nke abụọ ahụ enweghị ike n’ebe ndị a nọ.” (Mkpughe 20:6a) Dị ka Jisọs kwere ndị Kraịst nọ na Smụana nkwa, ndị a nwere mmeri, ndị na-ekere òkè ná “mbilite n’ọnwụ mbụ” ahụ agaghị anọkwa n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị “ọnwụ nke abụọ ahụ” metụtara, bụ́ nke pụtara mkpochapụ, mbibi nke na-enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. (Mkpughe 2:11; 20:14) Ọnwụ nke abụọ ahụ “enweghị ike” n’ebe ndị dị otú a nwere mmeri nọ, n’ihi na ha ga-eyikwasịworị ereghị ure na anwụghị anwụ.—1 Ndị Kọrint 15:53.
18. Gịnị ka Jọn kwuru ugbu a banyere ndị ọhụrụ na-achị ụwa, gịnịkwa ka ha ga-emezu?
18 Lee nnọọ ka nke a si dị iche n’ihe banyere ndị eze elu ala n’oge Setan ka ji ike ọchịchị! Ya karịsịa, ndị a achịwo achị ruo ihe dị ka nanị 50 ma ọ bụ 60 afọ, ihe kakwa ọtụtụ n’ime ha bụ ruo nanị afọ ole na ole. Ọtụtụ n’ime ha emekpawo ihe a kpọrọ mmadụ ahụ. Otú o sina dị, olee ụzọ mba nile ga-esi rite uru na-adịgide adịgide n’okpuru ndị ọchịchị na-agbanwe mgbe mgbe, ndị nwekwara ụkpụrụ ndị na-agbanwegharị agbanwegharị? N’ụzọ na-eyighị nke ahụ, Jọn kwuru banyere ndị ọhụrụ ahụ ga-achị ụwa, sị: “Kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ.” (Mkpughe 20:6b) Ha ga-esoro Jisọs guzobe ọchịchị nke ọ bụ nanị ya ga-adị adị ruo otu puku afọ. Ọrụ ha dị ka ndị nchụàjà, n’iji uru nke àjà mmadụ zuru okè Jisọs chụrụ na-eme ihe, ga-ebuli ụmụ mmadụ na-erube isi elu gaa n’izu okè nke ime mmụọ, nke omume, na nke anụ ahụ. Ije ozi ha dị ka ndị eze ga-arụpụta iwulite òtù ụmụ mmadụ zuru ụwa ọnụ nke na-egosipụta ezi omume na ịdị nsọ nke Jehova. Dị ka ndị ikpe ruo otu puku afọ, ha na Jisọs ga-eji ịhụnanya duzie ụmụ mmadụ na-aṅa ntị gaa n’ihe mgbaru ọsọ nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.
Ule Ikpeazụ Ahụ
19. Gịnị ga-abụ ọnọdụ nke ụwa na nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ọgwụgwụ Ọchịchị Puku Afọ ahụ, gịnịkwa ka Jisọs ga-eme ugbu a?
19 N’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ, ụwa nile ga-abụworị ebe yiri Iden mbụ ahụ. Ọ ga-abụ paradaịs mara oké mma. Ọ gaghị adịkwa ihe a kpọrọ mmadụ ndị zuru okè mkpa inwe onyeisi nchụàjà ga-abụ onye ogbugbo n’etiti ha na Chineke, ebe ọ bụ na e wepụsịwo ihe nile sitere ná mmehie Adam, e mewokwa ka onye iro ikpeazụ ahụ, bụ́ ọnwụ, ghara ịdị irè. Alaeze Kraịst ga-emezuworị nzube Chineke nke inweta otu ụwa nke nwere otu ọchịchị. N’oge a, Jisọs “ga-arara Alaeze ya nye n’aka Chineke, onye bụkwa Nna.”—1 Ndị Kọrint 15:22-26; Ndị Rom 15:12.
20. Gịnị ka Jọn gwara anyị na ọ ga-eme mgbe oge ruru maka ule ikpeazụ ahụ?
20 Ugbu a, oge eruwo maka otu ule ikpeazụ. Ụwa ahụ zuru okè nke ihe a kpọrọ mmadụ hà ga-eguzosi ike n’ikwesị ntụkwasị obi ha, n’eyighị mmadụ ndị mbụ ahụ nọ n’Iden? Jọn na-agwa anyị ihe merenụ: “Ma mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị, a ga-atọpụ Setan n’ụlọ mkpọrọ ya, ọ ga-apụtakwa iduhie mba nile ndị dị na nkuku anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, ime ka ha zukọọ ibu agha ahụ: ndị ọnụ ọgụgu ha hà ka ájá nke oké osimiri. Ha wee rịgoo n’obodobo ụwa, nọgide ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ gburugburu, ya na obodo ahụ nke a hụworo n’anya.”—Mkpughe 20:7-9a.
21. Maka mgbalị ikpeazụ ya, olee ụzọ Setan si gaa n’ihu, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iju anyị anya na ụfọdụ ndị ga-agbaso Setan ọbụna mgbe Ọchịchị Puku Afọ ahụ gasịrị?
21 Olee otú mgbalị ikpeazụ nke Setan ga-esi gaa? Ọ na-eduhie “mba nile ndị dị na nkuku anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg,” ọ na-edurukwa ha gaa “ibu agha ahụ.” Olee onye pụrụ nnọọ ịdụnyere Setan úkwù mgbe otu puku afọ nke ọchịchị Chineke nke na-enye ọṅụ, na-ewulikwa elu, gasịrị? Ee, echefukwala na Setan nwere ihe ịga nke ọma n’iduhie Adam na Iv ahụ zuru okè mgbe ha nọ na-enweta ọṅụ site n’ịdị ndụ n’ime Paradaịs nke Iden. O nwekwara ihe ịga nke ọma n’iduhie ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe, bụ́ ndị hụworo ajọ ihe si ná nnupụisi mbụ ahụ pụta. (2 Pita 2:4; Jud 6) Ya mere, o kwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya na a ga-arara ụfọdụ n’ime ụmụ mmadụ ndị zuru okè gaa n’ịgbaso Setan ọbụna mgbe otu puku afọ nke obi ụtọ nke ọchịchị Alaeze Chineke gasịrị.
22. (a) Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ okwu ahụ bụ “mba nile ndị dị na nkuku anọ nke ụwa”? (b) N’ihi gịnị ka e ji kpọọ ndị nnupụisi ahụ “Gọg na Megọg”?
22 Bible kpọrọ ndị nnupụisi ndị a “mba nile ndị dị na nkuku anọ nke ụwa.” Nke a apụtaghị na a ga-ekewasịworị ihe a kpọrọ mmadụ ọzọkwa gaa ná mba ndị kwụgasịịrị onwe ha. Ihe ọ na-egosi bụ nanị na ndị a ga-ekewapụ onwe ha site ná ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị ezi omume, wee gosipụtakwa otu ajọ mmụọ ahụ nke mba dị iche iche na-egosi taa. Ha ‘ga-eche echiche ọjọọ,’ dị ka Gọg onye Megọg mere n’amụma Ezikiel, na-enwe nzube nke ibibi ọchịchị Chineke n’elu ala. (Ezikiel 38:3, 10-12) Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ha “Gọg na Megọg.”
23. Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ nke bụ na ọnụ ọgụgụ ndị nnupụisi ahụ “hà ka ájá nke oké osimiri”?
23 Ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-esonyere Setan ná nnupụisi ya ‘ga-adị ka ájá nke oké osimiri.’ Mmadụ ole ka nke ahụ ga-abụ? Ọ dịghị ọnụ ọgụgụ ọ bụla e bu ụzọ kaa aka ọ ga-abụ. (Tụlee Joshua 11:4; Ndị Ikpe 7:12.) Ngụkọta ikpeazụ nke ọnụ ọgụgụ ndị nnupụisi ga-adabere n’otú onye ọ bụla si meghachi omume n’ụzọ nduhie nile nke Setan. Ma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-enwe ọnụ ọgụgụ buru nnọọ ibu, ebe ọ bụ na ha ga-eche na ha ruru eru imeri ‘ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ ya na obodo ahụ nke a hụworo n’anya.’
24. (a) Gịnị bụ “obodo ahụ nke a hụworo n’anya,” à pụkwara isi aṅaa gbaa ya gburugburu? (b) Gịnị ka “ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ” ahụ nọchiri anya ya?
24 “Obodo ahụ nke a hụworo n’anya” aghaghị ịbụ obodo ahụ nke Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ya ná Mkpughe 3:12, nke ọ kpọkwara “obodo Chineke m, bụ́ Jerusalem ọhụrụ, nke si n’eluigwe rịdata site n’ebe Chineke m nọ.” Ebe ọ bụ na nke a bụ nzukọ dị n’eluigwe, ò si aṅaa bụrụ na ìgwè ndị ahụ nọ n’elu ala ‘gbara ya gburugburu’? Ọ bụ n’ihi na ha gbara “ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ” gburugburu. Ọmụma ụlọ ikwuu na-adị ná mpụga mpụga nke obodo; ya mere, “ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ” aghaghị ịnọchi anya ndị ahụ nọ n’elu ala, n’ebe na-adịghị n’ọnọdụ eluigwe nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ, bụ́ ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-akwado ndokwa ọchịchị Jehova. Mgbe ndị nnupụisi ahụ nọ n’okpuru nduzi Setan wakwasịrị ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, Onyenwe anyị Jisọs na-ewere ya dị ka mbuso agha megide ya onwe ya. (Matiu 25:40, 45) ‘Mba ndị ahụ’ ga-agbalị ikpochapụ ihe nile Jerusalem Ọhụrụ nke eluigwe ahụ mezuworo n’ime ka elu ala bụrụ paradaịs. Ya mere, n’ibuso “ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ” ahụ agha, ha na-ebusokwa “obodo ahụ nke a hụworo n’anya” agha.
Ọdọ Ọkụ na Brimstone
25. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ihe si ná mwakwasị ndị nnupụisi ahụ wakwasịrị “ọmụma ụlọ ikwuu ndị nsọ” ahụ pụta, gịnịkwa ka nke a ga-apụtara Setan?
25 Mgbalị ikpeazụ nke a Setan ga-eme ọ̀ ga-aga nke ọma? Ọ dịghị ma ọlị—dịkwa ka mbuso agha ahụ Gọg nke Megọg ga-ebuso Israel ime mmụọ n’oge anyị a na-agaghị aga nke ọma! (Ezikiel 38:18-23) Jọn kọwara ihe si na nke a pụta nke ọma, sị: “Ọkụ wee si n’eluigwe rịdata, ripịa ha. Ekwensu ahụ nke na-eduhie ha, a tụbara ya n’ime ọdọ ọkụ na brimstone, ebe anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ nọkwa.” (Mkpughe 20:9b-10a) Kama ịbụ onye a tụbara nanị n’abyss, ugbu a Setan, bụ́ agwọ ochie ahụ, ga-abụ onye a zọpịara kpam kpam ka ọ ghara ịdịkwa adị, gwepịa ya, kpochapụ ya kpam kpam dị ka à ga-asị na e ji ọkụ mee ihe.
26. N’ihi gịnị ka “ọdọ ọkụ na brimstone” ahụ na-apụghị ịbụ ebe nkịtị nke ịta ahụhụ?
26 Anyị arịbaworị ama na “ọdọ ọkụ na brimstone” ahụ apụghị ịbụ ebe nkịtị nke ịta ahụhụ. (Mkpughe 19:20) Ọ bụrụ na Setan ga-anọ ebe ahụ na-ata oké ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ ga-adị mkpa ka Jehova debe ya ndụ. Ma, ndụ bụ onyinye, ọ bụghị ahụhụ. Ọnwụ bụ ahụhụ dịịrị mmehie, dịkwa ka Bible si kwuo, ihe e kere eke ndị nwụrụ anwụ adịghị enwe mmetụta ọ bụla nke ihe ụfụ. (Ndị Rom 6:23; Eklisiastis 9:5, 10) Karịsịa, anyị mesịrị gụọ na ọnwụ n’onwe ya, tinyere Hedis, ka a tụbakwara n’otu ọdọ ọkụ na brimstone ahụ. O doro nnọọ anya na ọnwụ na Hedis apụghị inwe mmetụta nke ihe ụfụ!—Mkpughe 20:14.
27. Olee ụzọ ihe mere Sọdọm na Gọmọra si enyere anyị aka ịghọta okwu ahụ bụ ọdọ ọkụ na brimstone?
27 Ihe ndị a nile na-emesi echiche ahụ ike nke bụ na ọdọ ọkụ na brimstone ahụ bụ nke ihe atụ. Ọzọkwa, mkpọtụ a kpọtụrụ ọkụ na brimstone aha na-echetara anyị ihe mere Sọdọm na Gọmọra oge ochie, bụ́ nke Chineke bibiri n’ihi ajọ mmebi iwu ha. Mgbe oge ha ruru, “Jehova wee mee ka brimstone na ọkụ si n’eluigwe zokwasị Sọdọm na Gọmọra dị ka mmiri site n’ebe Jehova nọ.” (Jenesis 19:24) A na-akpọ ihe mere obodo abụọ ahụ “ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ ọkụ ebighị ebi.” (Jud 7) Ma obodo abụọ ahụ enweghị nke nọgidere na ntaramahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, e kpochapụrụ ha, wepụ ha kpam kpam ruo mgbe ebighị ebi, ha na ndị nile rụrụ arụ bi n’ime ha. Obodo ndị ahụ adịghị adị taa, ọ dịkwaghị onye pụrụ ikwu kpọmkwem ebe ha dịbu.
28. Gịnị bụ ọdọ ọkụ na brimstone ahụ, oleekwa ụzọ o si ghara iyi ọnwụ, Hedis, na abyss ahụ?
28 N’ikwekọ na nke a, Bible n’onwe ya kọwara ihe ọdọ ọkụ na brimstone ahụ pụtara: “Nke a bụ ọnwụ nke abụọ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.” (Mkpughe 20:14) O doro anya na ọ bụ otu ihe ahụ ya na Gehena ahụ nke Jisọs kwuru okwu banyere ya, bụ́ ebe ndị ajọ omume na-anọgide ná mbibi, ọ bụghị na ntaramahụhụ ebighị ebi. (Matiu 10:28) Ọ bụ mbibi zuru ezu, nke na-enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. Ya mere, ọ bụ ezie na e nwere mkpịsị ugodi nke ọnwụ, Hedis, na nke abyss ahụ, e kwughị ihe ọ bụla banyere mkpịsị ugodi e ji emeghe ọdọ ọkụ na brimstone ahụ. (Mkpughe 1:18; 20:1) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ ga-atọhapụ ndị nọ n’ime ya.—Tụlee Mak 9:43-47.
Ndị E Mekpara Ahụ Ehihie na Abalị ruo Mgbe Ebighị Ebi
29, 30. Gịnị ka Jọn kwuru banyere Ekwensu nakwa banyere anụ ọhịa na onye amụma ụgha ahụ, oleekwa ụzọ e kwesịrị isi ghọta nke a?
29 N’izo aka n’ebe Ekwensu nakwa anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ nọ, Jọn gwara anyị ugbu a, sị: “A ga-emekpakwa ha ahụ ehihie na abalị ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 20:10b) Gịnị pụrụ ịbụ ihe nke a pụtara? Dị ka e hotaworo, ọ bụghị ihe ezi uche dị n’ime ya ikwu na ihe nnọchianya, ndị dị ka anụ ọhịa ahụ na onye amụma ahụ, tinyekwara ọnwụ na Hedis, pụrụ ịta ahụhụ n’ụzọ nkịtị. Ya mere, anyị enweghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji kwere na Setan ga-anọ na-ata ahụhụ ruo mgbe nile ebighị ebi. A ga-ekpochapụ ya kpam kpam.
30 Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a maka ‘imekpa ahụ,’ ba·sa·niʹzo, pụtara n’ụzọ bụ isi “iji nkume anwale (ígwè dị iche iche).” “Ịgba mmadụ ajụjụ site n’ịta ya ahụhụ” bụkwa ihe nke abụọ ọ pụtara. (The New Thayer’s Greek-English Lexicon of the New Testament) Dị ka okwu dị n’ebe a si dị, ojiji e jiri okwu Grik nke a mee ihe gosiri na ihe ga-eme Setan ga-anọ, ruo mgbe nile ebighị ebi, dị ka nkume nnwale nke okwu ahụ metụtara izi ezi na ezi omume nke ọchịchị Jehova. Ihe iseokwu ahụ nke ọchịchị eluigwe na ala ga-abụworị nke e doziri ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ gaghị adịkwa mkpa ọzọ ichere ogologo oge ka e wee nwapụta na ihe ịma aka ọ bụla megide ọchịchị eluigwe na ala nke Jehova ezighị ezi.—Tụlee Abụ Ọma 92:1, 15.
31. Olee ụzọ okwu Grik abụọ ndị metụtara nke ahụ pụtara “mmekpa ahụ” si enyere anyị aka ịghọta ntaramahụhụ nke Setan bụ́ Ekwensu ga-enweta?
31 Ọzọkwa, okwu ahụ metụtara ya nke bụ ba·sa·ni·stesʹ, “onye mmekpa ahụ,” bụ nke e jiri mee ihe na Bible ịpụta “onyenche ụlọ mkpọrọ.” (Matiu 18:34, Kingdom Interlinear) N’ikwekọ na nke a, a ga-atụ Setan mkpọrọ n’ọdọ ọkụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi; ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-atọhapụ ya atọhapụ. N’ikpeazụ, ná nsụgharị Septuagint nke Grik, bụ́ nke Jọn maara nke ọma, okwu ahụ metụtara ya nke bụ baʹsa·nos bụ nke a na-eji eme ihe izo aka ná mweda n’ala nke na-eduje n’ọnwụ. (Ezikiel 32:24, 30) Nke a na-enyere anyị aka ịhụ na ahụhụ Setan ga-enweta bụ ọnwụ mweda n’ala na-adịru ebighị ebi n’ime ọdọ ọkụ na brimstone ahụ. Ọrụ ya nile ga-eso ya wee nwụọ.—1 Jọn 3:8.
32. Ntaramahụhụ dị aṅaa ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ ga-enweta, ànyị sikwa aṅaa mara?
32 Ọzọkwa, a kpọtụghị ndị mmụọ ọjọọ ahụ aha n’amaokwu nke a. À ga-atọhapụ ha na Setan n’ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ, ha wee sorokwa ya nweta ahụhụ nke ọnwụ ebighị ebi? Ihe àmà na-aza ee. N’ilu ahụ metụtara atụrụ na ụmụ ewu, Jisọs kwuru na ewu ndị ahụ ga-eje “n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.” (Matiu 25:41) Okwu ahụ bụ ‘ọkụ ebighị ebi’ aghaghị izo aka n’ọdọ ọkụ na brimstone ahụ ebe a ga-atụba Setan. A chụpụkọrọ Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya site n’eluigwe. Ihe àmà gosikwara na ha sooro ya banye n’abyss ahụ ná mmalite Ọchịchị Puku Afọ ahụ. Ya mere, n’ụzọ kwekọrọ na nke a, a ga-alakọkwa ha na ya n’iyi n’ime ọdọ ọkụ na brimstone ahụ.—Matiu 8:29.
33. Akụkụ ikpeazụ dị aṅaa nke Jenesis 3:15 ga-enwe mmezu ya n’oge ahụ, ọ̀ bụkwa n’okwu dị aṅaa ka mmụọ Jehova dọọrọ uche Jọn gaa na ya ugbu a?
33 N’ụzọ dị otú a, akụkụ ikpeazụ nke amụma ahụ e dekọrọ na Jenesis 3:15 bụ nke e mezuru. Mgbe a tụbara Setan n’ime ọdọ ọkụ ahụ, ọ ga-aghọ ihe nwụrụ anwụ dị ka agwọ nke e jiworo ikiri ụkwụ bụ ígwè gwepịa isi ya. Ya na ndị mmụọ ozi ya ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. A kpọtụghị ha aha ọzọ n’ime akwụkwọ Mkpughe. Ugbu a, mgbe e wepụworo ndị a n’ụzọ amụma, mmụọ Jehova na-adọrọ uche gaa n’okwu ọzọ nke na-akpali oké mmasị nye ndị nwere olileanya elu ala: Gịnị ka ọchịchị eluigwe nke ‘Eze ahụ kachasị ndị eze nile’ nakwa ‘ndị so ya, bụ́ ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi’ ga-arụpụtara ihe a kpọrọ mmadụ? (Mkpughe 17:14) Iji zaa ajụjụ a, Jọn na-akpọrọ anyị laghachi ọzọ ná mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-ekwu na Jisọs nọ n’ime Hedis n’oge ahụ ọ nwụrụ anwụ. (Ọrụ 2:31) Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ikwubi na Hedis na abyss ahụ na-abụ otu ihe n’oge nile. Ebe anụ ọhịa ahụ na Setan na-abanye n’ime abyss ahụ, ọ bụ nanị ụmụ mmadụ ka a na-ekwu na ha na-aga na Hedis, ebe ha na-anọ n’ụra ọnwụ ruo mgbe a kpọlitere ha site n’ọnwụ.—Job 14:13; Mkpughe 20:13.
b O yiri ka anyụike (Grik, peʹle·kus) bụ ihe a na-ejikarị eme ihe n’igbu ndị mmadụ na Rom, ọ bụ ezie na n’oge Jọn a na-ejikarị mma agha eme ihe. (Ọrụ 12:2) Ya mere, okwu Grik ahụ e ji mee ihe n’ebe a, bụ́ pe·pe·le·kis·meʹnon (“e ji anyụike gbuo”), pụtara n’ụzọ nkịtị “e gburu egbu.”
c Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke anọ, bụ́ Eusebius, kọrọ na Papias onye Hierapolis, bụ́ onye a maara na o nwetara ụfọdụ n’ihe ọmụma Bible ya site n’aka ndị Jọn onye dere akwụkwọ Mkpughe ziri ihe, kwere n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst nke nkịtị (ọ bụ ezie na Eusebius ekwenyeghịrị ya ma ọlị).—The History of the Church, Eusebius, III, 39.
[Foto dị na peeji nke 293]
Osimiri Nnu ahụ. Ebe ọ pụrụ ịbụ na Sọdọm na Gọmọra dịbu
[Foto ndị dị na peeji nke 294]
“Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echipịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echipịakwa ya n’ikiri ụkwụ”