ISI NKE 06
Olee Otú Ihe Ndị Dị Ndụ Si Malite Ịdị?
Baịbụl kwuru na “ọ bụ [Chineke] na-enye ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) Ì kwetara ihe a o kwuru? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ndị dị ndụ nọkatara dịrị. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ọ pụtara na e keghị anyị eke. Mana, ọ bụrụ na ọ bụ Jehova Chineke kere ihe ndị dị ndụ, a ga-enwerịrị ihe mere o ji kee ha.a Legodị ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú ihe ndị dị ndụ si malite ịdị nakwa ihe mere anyị ji kwesị ikwere na ihe ọ kọrọ bụ eziokwu.
1. Olee otú eluigwe na ụwa si malite ịdị?
Baịbụl kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ọtụtụ ndị sayensị kwetara na eluigwe na ụwa nwere oge ha malitere ịdị. Olee otú Chineke si kee eluigwe na ụwa? O ji ‘ike ya,’ ya bụ, mmụọ nsọ ya, kee eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha, ma kpakpando ma ụyọkọ kpakpando ma ihe ndị ọzọ yiri ụwa a na-akpọ planet.—Jenesis 1:2.
2. Gịnị mere Chineke ji kee ụwa?
Jehova ‘ekeghị ụwa na nkịtị, kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.’ (Aịzaya 45:18) O kere ụwa anyị a otú ọ ga-adị anyị mma ibi na ya nakwa otú anyị ga-enwe ike ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Gụọ Aịzaya 40:28; 42:5.) Ndị sayensị achọpụtala na ụwa pụrụ iche. Ọ bụ ya bụ naanị planet mmadụ ga-ebili na ya ma dịrị ndụ na-aga.
3. Olee otú mmadụ si dị iche n’ụmụ anụmanụ?
Mgbe Jehova kechara ụwa, o kere ihe ndị dị ndụ dị na ya. O bu ụzọ kee ahịhịa na osisi dị iche iche na ụmụ anụmanụ. O mechakwara “kee mmadụ n’oyiyi ya.” (Gụọ Jenesis 1:27.) Olee otú mmadụ si dị iche n’ụmụ anụmanụ? Ebe ọ bụ na Chineke kere anyị n’oyiyi ya, anyị ga-emeli ka ya, dị ka ịhụ ndị ọzọ n’anya na ikpe ikpe ziri ezi. O kekwara anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-amụta asụsụ dị iche iche, otú ịhụ ihe mara mma ga na-amasị anyị, nakwa otú egwú ga na-atọ anyị ụtọ. Anyị nwekwara ike ife Chineke, ma ụmụ anụmanụ enweghị ike ife ya.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe na-egosi na e kere ihe ndị dị ndụ eke nakwa na ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú e si kee ha rijuru afọ. Chọpụtakwa ihe àgwà dị iche iche ndị mmadụ na-akpa na-akụziri anyị gbasara Chineke.
4. E kere ihe ndị dị ndụ eke
A na-eto ndị mmadụ ma ha lere anya n’ihe e kere eke rụpụta ihe. Ònyezi ka e kwesịrị ito maka ihe ndị ahụ e kere eke ha leere anya rụpụta ihe? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ụfọdụ ihe e kere eke ndị mmadụ leere anya rụpụta ihe?
Ọ bụ mmadụ na-ese ụlọ ọ bụla, rụọkwa ya. Ònyekwanụ kere ihe ndị dị n’ụwa? Gụọnụ Ndị Hibru 3:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ihe ndị e kere eke na-amasị gị?
Mmadụ ò kwesịrị ikwere na e kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha eke? Maka gịnị?
Ị̀ ma ihe a?
Ị gaa na jw.org, ị ga-ahụ isiokwu na vidio ndị kọwakwuru ihe a. Ị ga-ahụ ha n’ebe abụọ a kpọrọ “È Kere Ya Eke?” na “Ihe Ndị Mmadụ Kwuru Mere Ha Ji Kwere na Chineke Dị.”
“N’eziokwu, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke”
5. Ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú e si kee ihe enweghị mgbagha
Na Jenesis isi mbụ, Baịbụl kwuru otú e si kee ụwa nakwa otú ihe ndị dị ndụ dị na ya si malite ịdị. Obi ò siri gị ike na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu, ka ì chere na ọ bụ akụkọ ifo? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Baịbụl ò kwuru na ọ bụ ụbọchị isii nkịtị ka e ji kee ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ya?
Ì chere na ihe Baịbụl kwuru gbasara otú e si kee ihe dabara adaba, rijuokwa afọ? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
Gụọnụ Jenesis 1:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ndị sayensị na-ekwu na eluigwe na ụwa nwere mmalite. Olee otú ihe a ha na-ekwu si akwado ihe anyị gụrụ n’amaokwu a?
Ụfọdụ ndị na-eche na ọ ga-abụ na Chineke kere otu ihe, ihe ahụ aghọzie ụdị ihe dị iche iche. Gụọnụ Jenesis 1:21, 25, 27. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Baịbụl ọ̀ sịrị na Chineke kere otu obere ihe dị ndụ, ihe ahụ aghọzie azụ̀, anụmanụ dị iche iche, na mmadụ? Ka ọ̀ sịrị na ọ bụ Chineke kere ihe niile dị ndụ “n’ụdị ha dị iche iche”?
6. Chineke kere mmadụ otú pụrụ iche
Anyị dị iche n’ụmụ anụmanụ Jehova kere. Gụọnụ Jenesis 1:26. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ebe ọ bụ na Chineke kere anyị n’oyiyi ya, olee ihe otú anyị si ahụ ndị ọzọ n’anya na otú anyị si emetere ha ebere na-akụziri anyị gbasara ụdị onye Chineke bụ?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ihe Baịbụl kwuru gbasara otú e si kee ihe bụ akụkọ ifo.
Olee ihe i chere? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
NCHỊKỌTA
Ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị ndụ.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara otú eluigwe na ụwa si malite ịdị?
Chineke ò kere otu obere ihe dị ndụ, ihe ahụ aghọzie ihe ndị ọzọ dị iche iche dị ndụ, ka ọ̀ bụ ya kere ihe niile?
Olee otú mmadụ si dị iche n’ụmụ anụmanụ?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Lee ihe ndị e kere eke gosiri na e nwere onye kere ihe.
“Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?” (Teta!, Septemba 2006)
Lee otú nna nwere ike isi kọọrọ obere nwa ya ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú e si kee ihe.
Baịbụl sịrị na Chineke kere ihe niile, ma ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ aghọzie ihe ndị ọzọ dị ndụ. Chọpụta ma ihe abụọ a hà bụcha eziokwu.
“Chineke Ò Kere Obere Ihe Dị Ndụ, Ihe Ahụ Aghọzie Ihe Ndị Ọzọ Dị Ndụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
a Isi nke 25 ga-ekwu ihe Chineke bu n’obi maka ụmụ mmadụ.