Mgbe Mmehie Na-adịkwaghị
“À MỤRỤ anyị n’ime mmehie?” Ajụjụ ahụ gbara otu nwa akwụkwọ mahadum na United States gharịị n’oge na-adịghị anya ọ malitesịrị ịmụ Bible. N’ihi nzụlite ya dị ka onye Hindu, ọ maghị banyere mmehie e ketara eketa. Ma ọ bụrụ na e ketara mmehie eketa n’ezie, ka o chere, ịgọnarị ma ọ bụ ileghara ịdị adị ya anya agaghị aba uru. Olee otú mmadụ pụrụ isi chọta azịza nye ajụjụ a?
Ọ bụrụ na e ketara ya eketa, mmehie aghaghị inweworị ebe ọ malitere. È kere nwoke mbụ ịbụ onye ajọ omume, nke mere na o bufeere ụmụ ya njimara ọjọọ? Ka ntụpọ ahụ ọ̀ pụtara mgbe e mesịrị? Ole mgbe kpọmkwem ka mmehie malitere? N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na mmehie bụ nanị ajọ ihe ma ọ bụ ụkpụrụ, nke dị n’elu ahụ, ọ̀ dị mgbe anyị pụrụ inwe olileanya inwere onwe pụọ na ya?
Dị ka nkwenkwe ndị Hindu si dị, nhụjuanya na ihe ọjọọ nwere ihe jikọrọ ha na okike. “Nhụjuanya [ma ọ bụ ihe ọjọọ],” ka otu ọkà mmụta ndị Hindu na-ekwu, “dị ka àgbà na-adịghị ala ala, na-aga nanị site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ ma a pụghị iwepụ ya kpam kpam.” Ihe ọjọọ abụrụwo n’ezie ihe a na-ahụ n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile e dere ede. Ọ bụrụ na ọ malitere tupu ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, ọ ga-adịrịrị mkpa na azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha banyere mmalite ya aghaghị isite n’ebe karịrị mmadụ elu. Azịza ya aghaghị isite n’ebe Chineke nọ bịa.—Abụ Ọma 36:9.
Mmadụ—E Kere Ya n’Enweghị Mmehie
Nkọwa ndị e nyere na Veda banyere okike mmadụ nwere ihe ha nọchiri anya ya, ka ọkà ihe ọmụma ndị Hindu bụ́ Nikhilananda na-ekwenye. N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ka ọtụtụ n’okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ na-enye nanị nkọwa na-emeghị eme banyere okike. Ma, e nwere ihe ezi uche dị na ha nke kwekọkwara na sayensị maka ikwere n’ihe ndekọ Bible banyere okike nke nwoke mbụ.a Isi mbụ ya kpọmkwem na-ekwu, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.”—Jenesis 1:27.
Gịnị ka ịbụ ndị e kere “n’onyinyo Chineke” pụtara? Nke a nnọọ: E mere mmadụ n’ọdịdị Chineke, na-enwe àgwà Chineke—dị ka ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya—ndị na-edo ya iche pụọ n’ebe anụmanụ nọ. (Tụlee Ndị Kọlọsi 3:9, 10.) Àgwà ndị a nyere ya ikike ịhọrọ ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, na-eme ka ọ bụrụ onye nweere onwe ya ime nhọrọ. E nweghị mmehie dị n’ime nwoke mbụ, ihe ọjọọ ma ọ bụ nhụjuanya adịghị ná ndụ ya, mgbe e kere ya.
Jehova Chineke nyere nwoke ahụ bụ́ Adam iwu a: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Site n’ịhọrọ irube isi, Adam na nwunye ya, bụ́ Iv, nwere ike iwetara Onye Okike ha otuto na nsọpụrụ ma nọgide bụrụ ndị na-enweghị mmehie. N’aka nke ọzọ, omume nnupụisi ga-egosi ọdịda ha iru ụkpụrụ zuru okè nke Chineke ma mee ka ha ghara izu okè—na-eme mmehie.
E keghị Adam na Iv ịbụ ndị bụ chi. Otú ọ dị, ha nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke àgwà Chineke na ikike ime mkpebi ndị metụtara omume. Ịbụ ndị Chineke kere, ha enweghị mmehie, ma ọ bụ ha zuru okè. (Jenesis 1:31; Deuterọnọmi 32:4) Ha ịbụ ndị e mere ka ha dịrị akpaghasịghị ịdị n’otu dịworịị n’agbata Chineke na eluigwe na ala eri ọtụtụ ọgbọ ruo mgbe ahụ. Mgbe ahụ, olee otú mmehie si malite?
Mmalite nke Mmehie
Mmehie weere ọnọdụ na nke mbụ ya n’ógbè ndị bụ mmụọ. Tupu e kee ụwa na mmadụ, Chineke ekeworị ndị bụ mmụọ e kere eke nwere ọgụgụ isi—ndị mmụọ ozi. (Job 1:6; 2:1; 38:4-7; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ịma mma na inwe ọgụgụ isi nke otu n’ime ndị mmụọ ozi a buru ya isi. (Tụlee Ezikiel 28:13-15.) Site n’iwu Chineke nyere Adam na Iv ịmụ ụmụ, mmụọ ozi a nwere ike ịhụ na n’oge na-adịghị anya ụwa dum ga-ejupụta ná ndị ezi omume, ha nile na-efekwa Chineke ofufe. (Jenesis 1:27, 28) Ọ gụrụ mmụọ a e kere eke agụụ ịnara ofufe ha. (Matiu 4:9, 10) Ịnọgide na-eche banyere ọchịchọ a dugara ya n’ịgbaso ụzọ ọjọọ.—Jemes 1:14, 15.
N’iji agwọ na-agwa Iv okwu, mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi sịrị na site n’ịmachibido iri mkpụrụ osisi ahụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ iwu, Chineke na-ejighachi ihe ọmụma nwanyị ahụ kwesịrị inwe. (Jenesis 3:1-5) Ikwu nke a bụ ụgha arụrụala—ime mmehie. Site n’ịgha ụgha a, mmụọ ozi ahụ mere onwe ya onye mmehie. N’ihi ya, a malitere ịkpọ ya Ekwensu, onye nkwutọ, na Setan, onye na-emegide Chineke.—Mkpughe 12:9.
Arụmụka na-enunye enunye nke Setan nwere mmetụta ọjọọ n’ahụ Iv. N’ịtụkwasị obi n’okwu Onye Ọnwụnwa ahụ, o kwere ka a ghọgbuo ya, o wee rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ a machibidoro iwu. Di ya, bụ́ Adam, sonyeere ya n’iri mkpụrụ osisi ahụ, ha abụọ sikwa otú ahụ ghọọ ndị mmehie. (Jenesis 3:6; 1 Timoti 2:14) N’ụzọ doro anya, site n’ịhọrọ inupụrụ Chineke isi, nne na nna anyị mbụ erughị akara nke izu okè, meekwa onwe ha ndị mmehie.
Gịnị banyere ụmụ Adam na Iv? Bible na-akọwa, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Iwu nke ihe e ketara eketa nọrịị n’ọrụ. Adam enweghị ike inyefe ụmụ ya ihe ọ na-enweghị. (Job 14:4) Ebe ha tụfuworo izu okè, di na nwunye mbụ bụ ndị mmehie mgbe a tụụrụ ime ụmụ ha. N’ihi ya, anyị nile—n’enweghị onye a gụpụrụ—eketawo mmehie. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 3:23) N’aka nke ya, mmehie arụpụtabeghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ihe ọjọọ na nhụjuanya. Ọzọkwa, n’ihi ya, anyị nile na-aka nká na-anwụkwa anwụ, “n’ihi na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.”—Ndị Rom 6:23.
Akọ na Uche ‘Na-ebo Ebubo’ Ma Ọ Bụ ‘Na-eme Ngọpụ’
Tụleekwa mmetụta nke mmehie nwere n’akparamàgwà nke di na nwunye mbụ. Ha kpuchiri akụkụ ụfọdụ nke ahụ ha ma gbalịa izopụ n’anya Chineke. (Jenesis 3:7, 8) Mmehie si otú ahụ mee ka ha nwee obi amamikpe, nchegbu, na ihere. Ihe a kpọrọ mmadụ taa maara nke ọma banyere mmetụta ndị a.
Olee onye na-enwebeghị mmetụta obi erughị ala n’ihi igbochi obiọma a gaara emere onye nọ ná mkpa ma ọ bụ onye na-enwebeghị mwute n’ihi ikwu ihe ọ na-ekwesịghị ikwu ma ọlị? (Jemes 4:17) Gịnị mere anyị ji enwe mmetụta ọjọọ dị otú ahụ? Pọl onyeozi na-akọwa na ‘e dere iwu n’obi anyị.’ Ọ gwụla ma akọ na uche anyị emeela etili, mmebi ọ bụla nke iwu ahụ na-akpata ọgba aghara ime ahụ. Otú ahụ ka o si bụrụ na olu nke akọ na uche ‘na-ebo anyị ebubo’ ma ọ bụ “na-agọpụ” anyị. (Ndị Rom 2:15; 1 Timoti 4:2; Taịtọs 1:15) Ma ànyị ghọtara ya ma ọ bụ na anyị aghọtaghị, anyị nwere nghọta dị n’ime nke ihe ọjọọ, nke mmehie!
Pọl maara nke ọma banyere ọchịchọ mmehie a. “Ihe ọjọọ dị m nso n’ebe aka m ga-eru, mụ, bụ́ onye na-achọ ime ihe ọma,” ka o kwenyere. “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.” Ya mere Pọl jụrụ, sị: “Ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?”—Ndị Rom 7:21-24.
Nnwere Onwe Pụọ ná Mmehie —N’ụzọ Dị Aṅaa?
“Ntọhapụ, n’ọdịnala ndị Hindu,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu, “bụ ntọhapụ site n’ịlọ ụwa ọtụtụ ugboro.” Dị ka ihe ngwọta, okpukpe Buddha n’ụzọ yiri nke ahụ na-ezo aka na Nirvana—ọnọdụ amaghị ihe na-eme gburugburu. N’aghọtabeghị ihe mmehie e ketara eketa pụtara, okpukpe Hindu na-ekwe nanị nkwa nke isi n’ịdị adị pụọ.
N’aka nke ọzọ, ụzọ ntọhapụ nke Bible na-arụpụta mwepụ nke ọnọdụ mmehie n’onwe ya. Mgbe ọ jụsịrị otú a pụrụ isi napụta ya ná mmehie, Pọl onyeozi gara n’ihu ịza, sị: “Ekele dịrị Chineke na ndọpụta sitere n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 7:25) Ee, nnapụta ahụ na-abịa site n’aka Chineke site na Jisọs Kraịst.
Dị ka Oziọma Matiu si kwuo, “Nwa nke mmadụ,” Jisọs Kraịst, bịara “ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Dị ka e dekọrọ na 1 Timoti 2:6, Pọl dere na Jisọs “nyere Onwe ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta [kwekọrọ ekwekọ, NW] n’ihi mmadụ nile.” Okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” pụtara ịkwụ ụgwọ maka nnapụta nke ndị e ji eji. Eziokwu ahụ bụ na ọ bụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ na-emesi ike ịdị irè nke ọnụ ahịa ahụ n’ime ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi iwu kwadoro guzozie. Ma olee otú a pụrụ isi were ọnwụ otu mmadụ dị ka “ihe mgbapụta [kwekọrọ ekwekọ, NW] n’ihi mmadụ nile”?
Adam renyere ihe nile a kpọrọ mmadụ, gụnyere anyị, n’ime mmehie na ọnwụ. Ọnụ ahịa, ma ọ bụ ụgwọ, ọ kwụrụ bụ ndụ mmadụ ya zuru okè. Iji nyezuo nke a, a ghaghị iji ndụ mmadụ ọzọ zuru okè—ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ—kwụọ ụgwọ. (Ọpụpụ 21:23; Deuterọnọmi 19:21; Ndị Rom 5:18, 19) Ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè pụrụ inye ihe mgbapụta a, Chineke, n’amamihe ya na-enweghị nsọtụ, mepere ụzọ isi ná nhụjuanya ndị a pụọ. (Abụ Ọma 49:6, 7) O bufere ndụ zuru okè nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya site n’eluigwe gaa n’akpa nwa otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke n’ụwa, na-ekwe ka a mụọ ya dị ka nwoke zuru okè.—Luk 1:30-38; Jọn 3:16-18.
Iji wee rụzuo ọrụ nke ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ, Jisọs aghaghị ịnọgide na-enwe ihe ndekọ dị ọcha n’oge nile ọ nọ n’elu ala. O mere nke a. E mesịa ọ nwụrụ ọnwụ ịchụàjà. N’ụzọ dị otú a, Jisọs hụrụ na uru nke ndụ mmadụ zuru okè—nke ya—ga-adị iji kwụọ ụgwọ dị ka ihe mgbapụta maka ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.—2 Ndị Kọrint 5:14; 1 Pita 1:18, 19.
Ihe Ihe Mgbapụta Kraịst Pụrụ Imere Anyị
Àjà mgbapụta Jisọs pụrụ ịbara anyị uru ugbu a. Site n’igosipụta okwukwe na ya, anyị pụrụ inwe nguzo dị ọcha n’ihu Chineke, nweekwa ike ịbata n’okpuru nlekọta ịhụnanya nke dịkwa nro nke Jehova. (Ọrụ 10:43; Ndị Rom 3:21-24) Kama ịbụ ndị obi amamikpe rikpuru n’ihi mmehie ndị anyị pụrụ imewo, anyị pụrụ ịrịọ mgbaghara site n’aka Chineke ná ndabere nke ihe mgbapụta ahụ.—Aịsaịa 1:18; Ndị Efesọs 1:7; 1 Jọn 2:1, 2.
N’ọdịnihu, ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka o kwe omume ịgwọta kpam kpam ọnọdụ ọrịa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke mmehie kpatara. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-akọwa “osimiri nke mmiri nke ndụ” na-esi n’ocheeze Chineke apụta. E nwere osisi ndị na-amị mkpụrụ nwere akwụkwọ ndụ n’akụkụ nile nke osimiri ahụ “ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:1, 2) N’ụzọ ihe atụ, Bible na-ekwu n’ebe a banyere ndokwa dị ebube nke Onye Okike ahụ mere iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmehie na ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs.
A ga-emezu ọhụụ amụma nke akwụkwọ Mkpughe n’isi nso. (Mkpughe 22:6, 7) Mgbe ahụ ndị nile obi ha ziri ezi ga-ezu okè, bụrụ ndị ‘a tọhapụrụ n’ịbụ ohu mmebi.’ (Ndị Rom 8:20, 21) Nke a ọ́ gaghị akwali anyị ịmụtakwu banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ Jisọs Kraịst, onye ghọrọ ihe mgbapụta ahụ?—Jọn 17:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 6]
Adam wetara mmehie na ọnwụ n’isi ihe a kpọrọ mmadụ
[Foto dị na peeji nke 7]
Àjà mgbapụta Jisọs na-eweta nnwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ