Ọ Bụ Ezie na Anyị Na-eru Újú, Anyị Anọghị n’Enweghị Olileanya
“Anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ, ụmụnna anyị; ka o wee ghara iwute unu, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya.”—1 NDỊ TESALỌNAỊKA 4:13.
1. Gịnị ka ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe ahụmahụ ya mgbe mgbe?
ONYE ị hụrụ n’anya ọ̀ nwụnahụwo gị? N’agbanyeghị afọ ndụ, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị abụrụwo ndị ọnwụ nke onye ikwu ma ọ bụ enyi wuteworo. Eleghị anya ọ bụ nne nne ma ọ bụ nna nna, nne ma ọ bụ nna, onye òtù ọlụlụ, ma ọ bụ nwa. Ịka nká, ọrịa, na ihe ọghọm na-akpata ọnwụ mgbe mgbe. Mpụ, ime ihe ike, na agha na-etinye ihe ná nhụjuanya na iru újú ahụ. Kwa afọ gburugburu ụwa, nkezi nke ihe karịrị 50 nde mmadụ na-anwụ. Nkezi ya kwa ụbọchị na 1993 bụ 140,250. Ọnụ ọgụg̣ụ ndị ọnwụ na-egbu na-emetụta ndị enyi na ezinụlọ, mmetụta nke mfu na-adịkwa omimi.
2. Gịnị yiri ihe na-ekwesịghị ekwesị banyere ụmụaka ịnwụ?
2 Ọ̀ bụ na anyị apụghị imere nne na nna nọ na California, U.S.A., ebere, bụ́ ndị ada ha dị ime nwụnahụrụ ha n’ihe ọghọm ụgbọ ala dị njọ nke mere na mberede? N’otu ntabi anya, nanị nwa nwanyị ha nwere na nwa gaara abụ nwa nwa ha nke mbụ nwụnahụrụ ha. Nwunye na nwa nwoke ma ọ bụ nwanyị nke mbụ nwụnahụrụ di onye ahụ nwụrụ anwụ. Ndị nne na nna ịbụ onye nwa nwụnahụrụ, ma ọ̀ ka bụ nwata ma ọ bụ na o metụwo okenye, bụ ihe na-ekwekọghị n’okike. Ọ bụghị ihe kwesịrị ekwesị ụmụ ịnwụ tupu nne na nna ha anwụọ. Anyị nile hụrụ ndụ n’anya. Ya mere, ọnwụ bụ onye iro n’ezie.—1 Ndị Kọrint 15:26.
Ọnwụ Abanye n’Ezinụlọ Mmadụ
3. Olee otú ọnwụ Ebel pụrụ isiworị metụta Adam na Iv?
3 Mmehie na ọnwụ achịwo dị ka ndị eze ruo ihe dị ka puku afọ isii nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, kemgbe nnupụisi nke nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. (Ndị Rom 5:14; 6:12, 23) Bible agwaghị anyị otú ha si meghachi omume n’ogbugbu e gburu nwa ha nwoke bụ́ Ebel site n’aka nwanne ya nwoke bụ́ Ken. N’ihi ọtụtụ ihe, ọ ghaghị ịbụworị ahụmahụ na-akụri obi nye ha. N’ebe a, na nke mbụ ya, ha chere ọnwụ mmadụ ihu, bụ́ nke e gosipụtara n’ihu nke nwa ha nwoke. Ha hụrụ mkpụrụ nke nnupụisi ha na ịnọgide na-eji nnwere onwe ime nhọrọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mịpụtara. Ken, n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ndị sitere n’aka Chineke, ahọrọwo ịbụ onye mbụ gburu nwanne ya. Anyị maara na Iv aghaghị ịbụ onye ọnwụ Ebel metụtara n’ụzọ dị omimi n’ihi na mgbe ọ mụrụ Set, o kwuru, sị: “Chineke dowooro m mkpụrụ ọzọ n’ọnọdụ Ebel; n’ihi na Ken gburu ya.”—Jenesis 4:3-8, 25.
4. N’ihi gịnị ka echiche ụgha nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ pụrụ iji ghara ịbụ ihe nkasi obi mgbe Ebel nwụrụ?
4 Nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ hụkwara ịbụ eziokwu nke ikpe Chineke mara ha—na ọ bụrụ na ha enupụ isi ma ghara irube isi, ha ‘aghaghị ịnwụ anwụ.’ N’agbanyeghị ụgha nke Setan, o doro anya na a ka ewelitebeghị echiche ụgha nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ya mere ha apụghị isi na ya nweta nkasi obi ụgha ọ bụla. Chineke agwaworị Adam, sị: “Ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” O kwughị okwu ọ bụla banyere ịdị adị n’ọdịnihu dị ka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’eluigwe, hell, Limbo, pọgatrị, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ. (Jenesis 2:17; 3:4, 5, 19) Dị ka mkpụrụ obi dị ndụ ndị meworo mmehie, Adam na Iv ga-emesịa nwụọ ma kwụsị ịdị adị. E nyere Eze Solomọn ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi; ọ dịghịkwa òkè ha nwere ọzọ ruo mgbe ebighị ebi n’ihe ọ bụla nke e meworo n’okpuru anyanwụ.”—Eklisiastis 9:5, 6.
5. Gịnị bụ ezi olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ?
5 Lee otú okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu! N’ezie, ònye na-echeta ndị nna nna nke narị afọ abụọ ma ọ bụ narị atọ gara aga? Mgbe mgbe ọbụna ili ha na-abụ ndị a na-adịghị amakwa ma ọ bụ leghara ha anya ogologo oge gara aga. Nke ahụ ọ̀ pụtara na e nweghị olileanya maka ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Ee e, ọ dịghị ma ọlị. Mata gwara Jisọs banyere nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ, bụ́ Lazarọs, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Ndị Hibru kwenyere na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’oge dị n’ihu. Ma, nke ahụ akwụsịghị ha iru újú banyere ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya.—Job 14:13.
Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ruru Újú
6, 7. Olee otú Abraham na Jekọb si meghachi omume n’ọnwụ mmadụ?
6 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga, mgbe nwunye Abraham bụ́ Sera nwụrụ, “Abraham wee bịa itiri Sera aka n’obi, na ịkwara ya ákwá.” Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke gosiri mmetụta ya miri emi maka ọnwụ nke nwunye ya ọ hụrụ n’anya, nke na-anọgidesikwa ike n’ihe. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke obi ike nke dị gara agara, o meghị ihere igosipụta iru újú ya n’anya mmiri.—Jenesis 14:11-16; 23:1, 2.
7 Ọnọdụ nke Jekọb bụ otu ihe ahụ. Mgbe a ghọgburu ya ikwere na anụ ọhịa egbuola nwa ya nwoke bụ́ Josef, olee otú o si meghachi omume? Anyị na-agụ na Jenesis 37:34, 35: “Jekọb wee dọwaa uwe mgbokwasị ya nile, jere ákwà mkpe n’úkwù ya, ruoro nwa ya újú ọtụtụ ụbọchị. Ụmụ ya ndị ikom nile na ụmụ ya ndị inyom nile wee bilie ịkasi ya obi; ma ọ jụrụ, na a gaghị akasi ya obi; ọ sị, N’ihi na m ga-arịdakwuru nwa m ruo [Sheol, NW] na-eru újú. Nna ya wee kwaara ya ákwá.” Ee, o kwekọrọ n’otú e si kee mmadụ igosipụta iru újú mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ.
8. Olee otú ndị Hibru si egosipụta iru újú ha mgbe mgbe?
8 Ụfọdụ nwere ike iche na dị ka ụkpụrụ ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ nke ógbè si dị, mmeghachi omume Jekọb gafere ókè, bụrụkwa oké ime ihe nkiri. Ma a zụlitere ya n’oge na n’ọdịbendị dị iche. Ngosipụta ya nke iru újú—iyiri ákwà mkpe—bụ nke mbụ a kpọrọ omume a aha na Bible. Otú ọ dị, dị ka a kọwara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-egosipụtakwa iru újú site n’iti aka n’obi, site n’ịrọ abụ ákwá, na site n’ịnọdụ n’ikpo ntụ. Dị ka ihe àmà na-egosi, ndị Hibru enweghị ihe mgbochi n’ezi ngosipụta nke iru újú ha.a—Ezikiel 27:30-32; Emọs 8:10.
Iru Újú n’Oge Jisọs
9, 10. (a) Olee otú Jisọs si meghachi omume n’ọnwụ Lazarọs? (b) Gịnị ka mmeghachi omume Jisọs na-agwa anyị banyere ya?
9 Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere ndị na-eso ụzọ mbụ nke Jisọs? Dị ka ihe atụ, mgbe Lazarọs nwụrụ, ụmụnne ya ndị nwanyị bụ́ Mata na Meri ji anya mmiri na ịkwa ákwá ruo újú ọnwụ ya. Olee otú nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs si meghachi omume mgbe ọ bịarutere n’ebe ahụ ihe mere? Ihe ndekọ Jọn na-asị: “Meri, mgbe ọ bịara n’ebe Jisọs nọ, mgbe ọ hụrụ Ya, ọ daa n’ala n’ụkwụ Ya, na-asị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa ákwá, na ndị Juu ndị soro ya bịa ka ha na-akwakwa ákwá, Ọ sụọ ude n’ime mmụọ Ya, meekwa ka obi lọọ Ya mmiri, O wee sị, Olee ebe unu tọgbọworo ya? Ha sị Ya, Onyenwe anyị, Bịa, leekwa. Anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.”—Jọn 11:32-35.
10 “Anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.” Okwu ole na ole ndị ahụ na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere ịbụ mmadụ nke Jisọs, ọmịiko ya, mmetụta ya. Ọ bụ ezie na ọ mazuuru banyere olileanya mbilite n’ọnwụ, “Jisọs kwara ákwá.” (Jọn 11:35, King James Version) Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu site n’ikwu na ndị na-ekiri ihe na-emenụ kwuru, sị: “Lee otú Ọ hụrụ [Lazarọs] n’anya!” N’ezie, ọ bụrụ na nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs kwara ákwá n’ọnwụ nke enyi ya, ọ bụghị ihe ihere ma ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwanyị eruo újú ma kwaa ákwá taa.—Jọn 11:36.
Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?
11. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ Bible ndị metụtara iru újú? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-adịghị eru újú dị ka ndị na-enweghị olileanya?
11 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ndị a nke Bible? Na ọ bụ ihe kwekọrọ n’otú e si kee mmadụ iru újú, anyị ekwesịghịkwa ime ihere ime ka iru újú anyị pụta ìhè. Ọbụna mgbe olileanya nke mbilite n’ọnwụ belatara ya, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya ka bụkwa mfu na-akpata oké obi mgbawa, nke a na-enwe mmetụta ya n’ụzọ dị omimi. Ọtụtụ afọ, eleghị anya ọtụtụ iri afọ, nke mkpakọrịta chiri anya na nkerịta ihe bụcha ndị gwụsịworo n’otu ntabi anya na n’ụzọ dị mwute. N’eziokwu, anyị adịghị eru újú dị ka ndị na-enweghị olileanya ma ọ bụ ndị nwere olileanya ụgha. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ọzọkwa, anyị abụghị ndị a na-eduhie site n’echiche ụgha nke mmadụ inwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ma ọ bụ ịnọgide na-adị ndụ site n’ịlọ ụwa. Anyị maara na Jehova ekwewo nkwa ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume ga-ebi n’ime ha.’ (2 Pita 3:13) Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile o bụla n’anya [anyị]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma o bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
12. Olee otú Pọl si kwupụta okwukwe ya ná mbilite n’ọnwụ?
12 Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụworonụ?b E nyere onye Kraịst na-ede ihe bụ́ Pọl ike mmụọ nsọ inye anyị nkasi obi na olileanya mgbe o dere, sị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26) The New English Bible sịrị: “Onye iro ikpeazụ a ga-ewepụ bụ ọnwụ.” N’ihi gịnị ka Pọl pụrụ iji jide nnọọ n’aka na nke ahụ ga-eme? N’ihi na ọ bụrụwo onye Jisọs Kraịst e siworo n’ọnwụ kpọlite tọghatara ma zie ihe. (Ọrụ 9:3-19) Nke ahụ bụkwa ihe mere Pọl ji nwee ike ikwu, sị: “Ebe ọnwụ sitere n’aka mmadụ [Adam], mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sitekwara n’aka mmadụ [Jisọs]. N’ihi na dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.”—1 Ndị Kọrint 15:21, 22.
13. Olee otú ndị ji anya ha hụ ihe merenụ si meghachi omume ná mbilite n’ọnwụ nke Lazarọs?
13 Ozizi Jisọs na-enye anyị nkasi obi na olileanya dị ukwuu maka ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, gịnị ka o mere n’ọnọdụ nke Lazarọs? Ọ gara n’ili ebe ozu Lazarọs dọsaworo kemgbe ụbọchị anọ. O kpere ekpere, “ma mgbe O kwusịrị ihe ndị a, O were oké olu tie mkpu, sị, Lazarọs, pụta n’èzí. Onye nwụrụrịị anwụ pụtara, e wereworị ákwà ozu kee ya ụkwụ na aka; werekwa ịchafụ kechie ya ihu. Jisọs sị ha, Tọpụnụ ya, gharakwa ya ka ọ laa.” Ì nwere ike iche echiche ihe ịtụnanya na ọṅụ dị n’ihu Mata na Meri? Lee otú ọ na-aghaghị isiworị tụọ ndị agbata obi n’anya mgbe ha hụrụ ọrụ ebube a! Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ ji nwee okwukwe na Jisọs. Otú ọ dị, ndị iro ya bụ́ ndị okpukpe, “gbara izu ka ha wee gbuo Ya.”—Jọn 11:41-53.
14. Gịnị ka mbilite n’ọnwụ Lazarọs bụ ihe atụ ya?
14 Jisọs mere mkpọlite n’ọnwụ ahụ a na-adịghị echezọ echezọ n’ihu ọtụtụ ndị akaebe ji anya ha hụ. Ọ bụ ihe atụ mbilite n’ọnwụ ga-adị n’ọdịnihu nke o buworo amụma ya n’otu oge tupu mgbe ahụ, mgbe o kwuru, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Ọkpara Chineke], ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.
15. Ihe àmà dị aṅaa ka Pọl na Ananaịas nwere banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs?
15 Dị ka e kwuworo na mbụ, Pọl onyeozi kwenyere ná mbilite n’ọnwụ. Ná ndabere dị aṅaa? Ọ bụbu Sọl ahụ na-ewu ewu, onye na-akpagbu ndị Kraịst. Aha ya na-akpata ụjọ n’etiti ndị kwere ekwe. E kwuwerị, ọ̀ bụ na ọ bụghị ya bụ onye kwadoro iji nkume tụgbuo onye Kraịst e gburu n’ihi okwukwe ya bụ́ Stifen? (Ọrụ 8:1; 9:1, 2, 26) Ma, n’ụzọ na-aga Damaskọs, Kraịst e meworo ka o si n’ọnwụ bilie mere ka anya doo Sọl, na-eji ikpu ìsì nwa oge na-eti ya ihe otiti. Sọl nụrụ olu na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere ị na-esogbu m? O wee sị, Ị̀ bụ Ònye, Onyenwe anyị? Ọ sị, Mụ onwe m bụ Jisọs, Onye gị onwe gị na-esogbu.” Mgbe ahụ otu Kraịst ahụkwa e mere ka o si n’ọnwụ bilie tụziiri Ananaịas, onye bi na Damaskọs, ka ọ gaa n’ụlọ ebe Sọl na-ekpe ekpere, weghachikwa ọhụhụ ụzọ ya. Ya mere, site n’ahụmahụ onwe onye, ma Sọl ma Ananaịas nwere ihe dị ukwuu mere ha ga-eji kwere ná mbilite n’ọnwụ.—Ọrụ 9:4, 5, 10-12.
16, 17. (a) Olee otú anyị si mara na Pọl ekwenyeghị n’echiche ndị Grik nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi e bu pụta ụwa? (b) Olileanya siri ike dị aṅaa ka Bible na-enye? (Ndị Hibru 6:17-20)
16 Rịba àmà otú Sọl, bụ́ Pọl onyeozi, si zaghachi mgbe, dị ka onye Kraịst a na-akpagbu, a kpọtara ya n’ihu Onye Ọchịchị Filiks. Anyị na-agụ n’Ọrụ Ndị Ozi 24:15: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” N’ụzọ pụtara ìhè, Pọl ekwenyeghị n’echiche ndị ọgọ mmụọ Gris nke mkpụrụ obi mmadụ na-adịghị anwụ anwụ e bu pụta ụwa, nke e chere na-abanye ná ndụ a na-adị mgbe a nwụsịrị ma ọ bụ ala mmụọ ndị dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. O kwenyere ma kụzie okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. Nke ahụ ga-apụtara ndị ụfọdụ onyinye nke ndụ anwụghị anwụ dị ka ndị e kere eke bụ́ mmụọ n’eluigwe ha na Kraịst nakwa n’ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nọ nlọghachi ná ndụ n’elu ala zuru okè.—Luk 23:43; 1 Ndị Kọrint 15:20-22, 53, 54; Mkpughe 7:4, 9, 17; 14:1, 3.
17 Otú a Bible na-enye anyị nkwa doro anya na olileanya siri ike nke na site ná mbilite n’ọnwụ, ọtụtụ ga-ahụ ndị ha hụrụ n’anya ọzọ n’elu ala ebe a kama ọ ga-abụ n’okpuru ọnọdụ dịgasị iche.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4.
Enyemaka Dị Irè Maka Ndị Na-eru Újú
18. (a) Ngwá ọrụ dị aṅaa na-enye aka ka e wepụtara ná Mgbakọ “Egwu Chineke”? (Lee igbe.) (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa chọrọ ugbu a ka a zaa ha?
18 Ugbu a anyị nwere ihe ndị anyị na-echeta, na-erukwa újú. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji lanarị oge ule a nke ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ? Gịnị ka ndị ọzọ pụrụ ime iji nyere ndị na-eru újú aka? Ọzọ, gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ndị nwere obi eziokwu anyị na-ezute n’ozi ubi, bụ́ ndị na-enweghị ezi olileanya ọ bụla ma na-erukwa újú aka? Nkasi obi ọzọkwa dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site na Bible banyere ndị anyị hụrụ n’anya daworo n’ụra ọnwụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụ ụfọdụ aro.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere iru újú n’oge Bible, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 446-447, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere olileanya mbilite n’ọnwụ dị na Bible, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 783-793.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọnwụ bụ onye iro?
◻ Olee otú ndị ohu Chineke n’oge Bible si mee ka iru újú ha pụta ìhè?
◻ Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?
◻ Ihe ndabere dị aṅaa ka Pọl nwere maka ikwere ná mbilite n’ọnwụ?
[Igbe dị na peeji nke 8, 9]
Enyemaka Dị Irè Maka Ndị Na-eru Újú
Ná Mgbakọ “Egwu Chineke” n’oge 1994-1995, Watch Tower Society mara ọkwa mwepụta nke broshuọ ọhụrụ a kpọrọ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. A haziwo akwụkwọ a na-agba ume iwetara ndị nke mba nile na asụsụ nile nkasi obi. Dị ka ị pụrụ ịhụworị, ọ na-enye nkọwa Bible dị mfe banyere ọnwụ na ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ọbụna nke ka mkpa, ọ na-eme ka nkwa Chineke, site n’ọnụ Kraịst Jisọs, nke mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ na paradaịs elu ala e mere ka ọ dị ọcha pụta ìhè. Ọ na-ewetara ndị na-eru újú nkasi obi n’ezie. Ya mere, o kwesịrị ịbụ ngwá ọrụ na-enye aka n’ozi ndị Kraịst ma kwesịkwa ịkpali mmasị, na-akpata ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi. E jiriwo ezi uche tinye ajụjụ maka ọmụmụ n’igbe ndị dị n’ebe ngwụsị nke akụkụ ọ bụla nke ga-eme ka e soro onye nwere obi eziokwu, na-eru újú tụleghachi ụfọdụ isi ihe ndị a tụlesịworo n’ụzọ dị mfe.
[Foto dị na peeji nke 8]
Mgbe Lazarọs nwụrụ, Jisọs kwara ákwá
[Foto dị na peeji nke 9]
Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]
Iru Újú Mbụ, nke W. Bouguereau sere, site n’enyo foto mbụ dị na Photo-Drama of Creation, 1914