Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 11/1 p. 9
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ́ Bụghị Chineke Nwe Ịkọwa Ihe?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jehova Echefughị Josef
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • “Agụụ Agaghị Agụkwa Ha Ọzọ”
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 11/1 p. 9

Ị̀ MAARA?

Gịnị mere Josef ji kpụọ isi ya na ajị agba ya tupu ya agaa hụ Fero?

Ebe e sere onye Ijipt na-akpụ mmadụ isi n’oge ochie

Ebe e sere onye Ijipt na-akpụ mmadụ isi n’oge ochie

N’akwụkwọ Jenesis, Baịbụl kwuru na Fero nyere iwu ka e si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Josef, bụ́ onye Hibru, ka ọ bịa kọwaara ya nrọ ọ rọrọ na-enye ya nsogbu n’obi. Josef anọọla ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ tupu Fero ekwuo ka a kpọta ya. Ma, n’agbanyeghị na Fero chọrọ ka Josef bịa ngwa ngwa, Josef bu ụzọ gaa kpụọ isi ya na ajị agba ya. (Jenesis 39:20-23; 41:1, 14) Ihe a e dere n’akwụkwọ Jenesis nwere ike iyi ihe na-adịghị mkpa, ma, o gosiri na onye dere ya maara omenala ndị Ijipt nke ọma.

E ji iruwe afụ ọnụ mara ndị Hibru na ọtụtụ mba ndị ọzọ dị́ n’oge ochie. Ma, otu akwụkwọ nke kwuru gbasara ihe ndị mere n’oge ochie kwuru na ná mba ndị dị́ n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, ọ bụ naanị ndị Ijipt bụ ndị na-anaghị eruwe afụ ọnụ ha.

Ọ̀ bụ naanị afụ ọnụ ka ndị Ijipt na-akpụ? Otu akwụkwọ a na-akpọ Biblical Archaeology Review kwuru ihe gosiri na ndị Ijipt na-achọ ka onye chọrọ ịga hụ Fero jikere ka onye na-aga n’ụlọ nsọ. Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na Josef ga-akpụcharịrị ntutu isi na ajị niile dị ya n’ahụ́ tupu ya agaa hụ Fero.

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na nna Timoti bụ onye Grik. Ọ̀ pụtara na Timoti bụ onye Gris?

Ebe mama Timoti na-agụrụ ya ihe, papa ya ana-eme ihe ọzọ n’azụ ebe ha nọ

Ọ bụchaghị ihe ọ pụtara. N’Akwụkwọ Nsọ, Pọl chọọ ikwu gbasara ndị na-abụghị ndị Juu mgbe ụfọdụ, ya akpọọ ha ndị Grik. (Ndị Rom 1:​16; 10:12) Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ndị bí n’ebe dị iche iche Pọl kwusara ozi ọma na-asụ asụsụ Grik, ­na-emekwa omenala ndị Grik.

Ma ònye ka ndị oge ochie na-akpọ onye Grik? N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga, otu ọkà okwu ndị Atens, aha ya bụ Isokratis, kwuru na omenala ndị Grik na-agbasa ebe niile n’ụwa. O kwuru na o meziri ka “ọ ghara ịbụ naanị ụmụ amaala Gris ka a na-akpọ ndị Grik, kamakwa, ndị niile a kụziiri asụsụ na omenala ndị Gris.” N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe mere Pọl ji kpọọ nna Timoti na-abụghị onye Juu onye Grik bụ n’ihi na ọ na-eme omenala ndị Grik, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ nwa amaala Gris. Ọ ga-abụkwa ya mere o ji kpọọ ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu ndị Grik.​—⁠Ọrụ Ndịozi 16:⁠1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya