Ezinụlọ Ndị Na-asọpụrụ Chineke n’Oge Gara Aga—Ihe Nlereanya Maka Oge Anyị
EZINỤLỌ—òtù Mba Ndị Dị n’Otu gbalịrị ime ka ọ bụrụ ebe ụwa ga-elekwasị anya. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịkpọ 1994 “Afọ Ezinụlọ Maka Mba Nile.” Ọ bụ ezie na ndị ndú ụwa, ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha mmadụ, na ndị ndụmọdụ ezinụlọ dị ngwa n’ịkwa arịrị banyere ihe ndị dị ka ịrị elu nke ịmụ nwa n’alụghị di na ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm na-arị elu ọjị, ha na-egbu oge n’ikwu ihe ngwọta ga-ekwe omume, nke dị irè nye nsogbu ndị dị otú ahụ.
Ọ̀ pụrụ ịbụ na Bible nwere ngwọta nye nsogbu nile nke ezinụlọ? Nye ụfọdụ ndị ọ pụrụ iyi omume ime ọhịa ikwu na Bible pụrụ ịba uru n’ezinụlọ dị iche iche nke taa. E kwuwerị, e dere ya ọtụtụ narị afọ gara aga n’ọdịdị na ọdịbendị nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. N’akụkụ ka ukwuu n’ụwa, ndụ agbanweela kpam kpam eri oge Bible. Ka o sina dị, e dere Bible site n’ike mmụọ nsọ Jehova Chineke, bụ́ onye e sitere na ya gụọ ezinụlọ nile aha. (Ndị Efesọs 3:14, 15; 2 Timoti 3:16) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere nsogbu nile nke ezinụlọ?
Jehova maara kpọmkwem ihe dị mkpa iji mee ka ndụ ezinụlọ bụrụ nke na-enye ọṅụ na nke na-eju afọ. Ya mere, Okwu ya, bụ́ Bible, nwere ihe dị ukwuu ikwu banyere ndụ ezinụlọ, ụfọdụ n’ime ha bụ n’ụdị ndụmọdụ. Bible nwekwara ọtụtụ ihe atụ nke ezinụlọ ndị tinyere ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. N’ihi ya, ha nwere ezi ịnọ nso na afọ ojuju. Ka anyị leba anya ná ndụ ezinụlọ n’oge Bible wee hụ ihe ndị a pụrụ ịmụta.
Ịbụisi—Ọ̀ Bụ Ihe Isi Ike?
Dị ka ihe atụ, tụlee okwu banyere ịbụisi ezinụlọ. N’oge ndị nna ochie, ndị ikom dị ka Abraham, Aịsak, na Jekọb bụ “ndị isi ezinụlọ” a na-azọghị azọ. (Ọrụ 7:8, 9; Ndị Hibru 7:4, NW) Akwụkwọ bụ́ The New Manners and Customs of Bible Times, nke Ralph Gower dere, na-asị: “Ezinụlọ bụ . . . ‘ntakịrị alaeze’ nke nna na-achị. Ọ na-achị nwunye, ụmụ, ụmụ ụmụ, na ndị odibo—onye ọ bụla n’ime ezinụlọ.” N’ezie, ọtụtụ mgbe ndị nna ochie ahụ nwekwara ike n’ahụ ezinụlọ nke ụmụ ha ndị nwoke.—Tụlee Jenesis 42:37.
Nke a ó nyeghị ụmụ nwoke ikike imegbu ndị nwunye ha na ụmụ ha? Ọ dịghị ma ọlị. N’eziokwu, Chineke gwara nwanyị mbụ, bụ́ Iv, sị: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Okwu ndị ahụ gosiri otú ihe ga-adịrị ndị inyom lụrụ di n’ozuzu ha, ma ha akọwaghị otú ihe ga-adị n’etiti ezi ndị na-efe Chineke. Ndị bụ́ di na-atụ egwu Chineke ga-eburu ihe bụ nzube mbụ nke Jehova n’uche. Jehova mere nwanyị ịbụrụ nwoke “onye inyeaka kwesịrị ya,” ọ bụghị ohu ya. (Jenesis 2:20) N’ihi na ndị ikom sọpụụrụ Chineke n’oge ochie matara ọnụnọ ha onwe ha n’okpuru Chineke na ajụjụ ha ga-aza ya, ha ejighị ikike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Kama imeso ndị nwunye ha na ụmụ ha nanị dị ka ndị ohu, ndị nna ochie na-atụ egwu Chineke gosiri ha ezi ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya.
Na Jenesis 50:23 e gosiri ntakịrị ihe atụ nke mmetụta ịhụnanya nke ụmụaka naenwetakarị. N’ebe ahụ ọ na-ekwu banyere ụmụ ụmụ nke atọ Josef, sị: “A mụkwara [ha] n’ikpere abụọ nke Josef.” Ebe nke a pụrụ nanị ịpụta na Josef nakweere ụmụaka ahụ dị ka ndị si n’eriri ya, ọ pụkwara igosi na o ji mmetụta ịhụnanya soro ụmụaka ahụ gwurie egwu, na-ekukwasị ha n’ikpere ya abụọ. Ndị bụ nna taa ga-eme nke ọma igosi ụmụaka ha ụdị mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ.
Dị ka ndị isi ezinụlọ, ndị nna ochie ahụ na-atụ egwu Chineke gbokwara mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha. Mgbe o si n’ụgbọ ahụ pụta ka Iju Mmiri ahụ zuru ụwa gasịrị, “Noa wee wuoro Jehova ebe ịchụ àjà . . . suree àjà nsure ọkụ n’ebe ịchụ àjà ahụ.” (Jenesis 8:20; tụlee Job 1:5.) Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Abraham setịpụrụ ezi ihe nlereanya site n’inye ndị òtù ezinụlọ ya ntụziaka onwe onye. O ‘nyere ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi ya, iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume na ihe e kpere n’ikpe.’ (Jenesis 18:19) Ịbụisi ịhụnanya si otú a tụnye ụtụ n’ọdịmma mmetụta uche na nke ime mmụọ nke ezinụlọ dị iche iche.
Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst taa na-agbaso ihe nlereanya nke a. Ha na-egosi ịbụisi ha n’okwu ndị metụtara ofufe site n’inyere ezinụlọ ha aka irube isi n’ihe ndị Chineke chọrọ na isetịpụ ezi ihe nlereanya n’onwe ha. (Matiu 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25) Dị ka ndị nna ochie, ndị Kraịst bụ́ di na nna na-ewepụtakwa oge iji nye ndị òtù ezinụlọ ha ntụziaka onwe onye.
Ime Ihe Kpọmkwem
N’ikpeazụ mgbe ọ kwụchapụrụ nnukwute ụgwọ o ji nna nwunye ya, nna ochie ahụ bụ́ Jekọb jụrụ, sị: “Ole mgbe ka mụ onwe m ga-emekwara ụlọ m?” (Jenesis 30:30) Dị ka ndị nile bụ́ nna, Jekọb nwere mmetụta nke nrụgide igbo mkpa anụ ahụ nile nke ezinụlọ ya, ọ rụsikwara ọrụ ike iji mee nke a. Jenesis 30:43 na-asị: “Nwoke ahu wee basaa nke ukwuu nke ukwuu, o wee nwee ìgwè ewu na atụrụ hie nne, na ndị inyom na-eje ozi, na ohu ndị ikom, na camel na ịnyịnya ibu dị ọtụtụ.”
Otú ọ dị, ọtụtụ afọ n’ihu, mgbe Jekọb kwagasịrị n’ala Kenean, o doro anya na ọ maghị na nwa ya nwanyị bụ́ Daịna azụlitewo àgwà dị ize ndụ nke iso ndị Kenean na-ekpere arụsị na-akpakọrịta.a (Jenesis 34:1) O meghịkwa ihe mgbe ọ matara na ngwongwo ndị ọgọ mmụọ dị n’ụlọ ya. Ka o sina dị, mgbe ọdachi ndina n’ike nke Daịna site n’aka onye Kenean gasịrị, Jekọb mere ihe kpọmkwem. O nyere ntụziaka, sị: “Wezụganụ chi nile nke ndị ala ọzọ nke dị n’etiti unu, meenụ onwe unu ka unu dị ọcha.”—Jenesis 35:2-4.
Ndị Kraịst bụ́ nna aghaghị ịmụrụ anya mgbe a bịara n’ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ha. Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-eyi ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ egwu n’ụzọ siri ike, dị ka inwe akwụkwọ ọgụgụ ndị na-akọ banyere omume rụrụ arụ ma ọ bụ egwu ndị na-adịghị mma n’ebe obibi, ha aghaghị ime ihe kpọmkwem.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ndị inyom nwere okwukwe ndị dị ka Sera, Rebeka, na Rechel nwekwara mmetụta pụtara ìhè n’ezinụlọ. Ọ bụ ezie na ha nọ n’okpuru di ha, e gbochighị ha ibute ụzọ n’ime ihe mgbe o kwesịrị ekwesị ma dị mkpa. Dị ka ihe atụ, Ọpụpụ 4:24-26 na-agwa anyị na mgbe Mosis na ezinụlọ ya na-eje Ijipt, “Jehova [“mmụọ ozi Jehova,” Septuagint] zutere ya, chọọ ime ka ọ [nwa nwoke Mosis] nwụọ.” N’ụzọ doro anya, nwa nwoke Mosis nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e gburu n’ihi na Mosis ebighị ya úgwù. Zipora mere ihe ngwa ngwa wee bie nwa ya nwoke úgwù. Mmụọ ozi ahụ hapụziri ya. Ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst taa pụkwara ibute ụzọ n’ime ihe mgbe ọnọdụ mere ka nke a kwesị ekwesị.
Izi Ihe nke Nna n’Okpuru Iwu Mosis
Na 1513 T.O.A., ọgbọ nke ndị nna ochie ahụ gwụsịrị mgbe Israel ghọrọ otu mba. (Ọpụpụ 24:3-8) Ndị bụ́ nna nọgidere na-eje ozi dị ka ndị isi ezinụlọ. Otú ọ dị, iwu ezinụlọ ghọrọ ihe dị ala n’ebe Iwu mba ahụ Chineke nyere Mosis dị, bụrụkwa nke ndị ikpe a họpụtara ahọpụta hụrụ na e debere. (Ọpụpụ 18:13-26) Usoro ndị nchụàjà nke ebo Livaị weghaara akụkụ ofufe ndị metụtara ịchụ àjà. Ka o sina dị, nna ka nọgidere na-arụ ọrụ dị mkpa. Mosis gbara ume, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:6, 7.
Iwu ahụ nyere oge, dị ka Ememe Ngabiga, mgbe a pụrụ inye ntụziaka ma mgbe e zukọtara maka ịnụrụ ya na mgbe ndị ọzọ. Ka ụbọchị Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ Nisan 14, na-akpụdewe, ezinụlọ dị iche iche nke ndị Juu ga-amalite ime nkwadebe maka njem ahụ ha na-emekarị gaa Jerusalem. (Deuterọnọmi 16:16; tụlee Luk 2:41.) Olee nwatakịrị nkwadebe ndị dị otú ahụ na-agaghị akpali? Njem ahụ n’onwe ya ga-abụ ihe obi ụtọ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ udu mmiri akwụsịwo, anwụ nke oge opupu ihe ubi amaliteworị iwepụ oyi dị n’ikuku. Ka snow nke Ugwu Heamọn na-agbaze, Osimiri Jọdan na-eruchi ụsọ ya nile.
Mgbe a nọ n’ụzọ, ndị nna pụrụ ịkụziri ụmụ ha ọ bụghị nanị nkà mmụta ọdịdị nke ala ha kamakwa ọtụtụ akụkọ ihe mere eme banyere ebe ndị ha pụrụ ịgafeta. Ihe ndị a pụrụ ịgụnye Ugwu Ibal na Geraịzim, bụ́ ebe ndị a nọ gụpụta ngọzi na nkọcha nile nke Iwu ahụ. Ha pụkwara ịgafeta Betel, bụ́ ebe Jekọb nọ wee rọọ nrọ ya nke ubube ruru eluigwe. Lee aha mkparịta ụka ndị na-akpali akpali ga-ebilite! Ka njem ahụ na-aga n’ihu, ndị njem sitere n’akụkụ nke ala ahụ na-esonyere ìgwè ezinụlọ dị iche iche, mmadụ nile ga-enwe mkpakọrịta ndị na-ewuli elu.
N’ikpeazụ ezinụlọ ahụ ga-abanye Jerusalem, “ebe mazuru mma.” (Abụ Ọma 50:2) Onye ọkà mmụta bụ́ Alfred Edersheim na-asị: “Ọtụtụ n’ime ndị njem ala nsọ a aghaghị ịmaworịị ụlọikwuu ha ná mpụga nke mgbidi obodo ahụ. A na-enye ndị nwetara ebe obibi n’ime obodo ụlọ n’efu.” Ee, ndị ntorobịa bụ́ ndị Hibru mụtara n’onwe ha ịhụnanya ụmụnna na ile ọbịa. Mgbakọ kwa afọ nke Ndịàmà Jehova na-emezukwa otu nzube ahụ taa.
Nisan 14 ga-emesịa ruo. A ga-egbu anụ Ememe Ngabiga ahụ ma hụọ ya n’ọkụ ruo ọtụtụ hour. Ka ọ na-eru n’etiti abalị, ezinụlọ ahụ ga-eri anụ nwa atụrụ ahụ, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa na-elu ilu. Dị ka omenala si dị, nwa nwoke ga-ajụ, sị: “Gịnị bụ ofufe a unu nwere?” Mgbe ahụ ndị nna ga-enye nkụzi a haziri ahazi, na-asị: “Àjà ngabiga ka ọ bụ nke a na-achụrụ Jehova, Onye gabigara ụlọ nile nke ụmụ Israel n’Ijipt, mgbe O tiri ndị Ijipt ihe, O wee napụta ụlọ nile anyị.”—Ọpụpụ 12:26, 27; 13:8.
Eze Israel bụ́ Solomọn kwuru, sị: ‘Oge ịchị ọchị na oge ite egwú dị.’ (Eklisiastis 3:4) E nyere ụmụaka Israel ohere maka ntụrụndụ. O doro anya na Jisọs Kraịst kiriri ụmụaka ka ha na-egwuri egwú n’ọmà ahịa. (Zekaraịa 8:5; Matiu 11:16) Ọ bụghịkwa ihe a na-adịghị ahụkebe nye ndị mụrụ ụmụ nwere ihe ime ndokwa maka nnọkọ ezinụlọ ndị na-enye ọṅụ maka ịgụ egwú, ite egwú, na iri oriri. (Luk 15:25) N’otu aka ahụkwa taa, ndị Kraịst mụrụ ụmụ na-ebute ụzọ n’inye ụmụaka ha ezi ntụrụndụ na mkpakọrịta.
Ndị Nne na Ụmụaka n’Ọha Mmadụ nke Ndị Juu
Òkè dị aṅaa ka ndị nne keere n’okpuru Iwu Mosis? Ilu 1:8 nyere iwu, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” N’okpuru ịchịisi nke di ya, onye nwunye bụ onye Juu ga-etinye ihe ndị Chineke nyere n’iwu n’ime ndụ ezinụlọ. Ụmụaka ya ga-asọpụrụ ya, ọbụna mgbe o meworo agadi.—Ilu 23:22.
Nne nwekwara òkè dị ukwuu n’ọzụzụ nke ụmụ ya. Ọ na-elekọta nwa ọhụrụ ruo n’ókè fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’emeghị ihe ọ bụla ọzọ ruo mgbe o ruru ogo ịnapụ ya ara, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ na-arụpụta nkekọ chiri anya nke nne na nwa. (Aịsaịa 49:15) Ebe ndị nna nọ na-akụziri ụmụ ha ndị nwoke ọrụ aka, ndị nne kụziiri ụmụ ha ndị nwanyị ọrụ ụlọ. Ndị nne nwekwara mmetụta dị omimi n’ebe ụmụ ha ndị nwoke nọ. Dị ka ihe atụ, Lemuel bụ́ eze ritere uru site “[n’ozi siri ike, NW] nke nne ya ji dọọ ya aka ná ntị.”—Ilu 31:1.
Ezigbo nwanyị bụ́ onye Juu nwere ohere butụrụ ibu ‘n’iche ojije nile nke ezinụlọ ya nche.’ Dị ka Ilu 31:10-31 si kwuo, ọ pụrụ ịzụta ihe ndị ezinụlọ ji eme ihe, azụmahịa ala na ụlọ, ọbụna na-azụ obere ahịa. Nye di nwere ekele, ọnụ ahịa ya “karịrị ruby nke ukwuu”!
Ihe Nlereanya Maka Taa
N’oge Bible ndokwa ezinụlọ rụrụ ọrụ maka uto mmetụta uche na nke ime mmụọ nke ndị òtù ya nile. Ndị nna aghaghị igosi ịchịisi ha n’ụzọ ịhụnanya iji baara ezinụlọ ha uru. Ha ga-ebute ụzọ n’ofufe. Ma ndị nna ma ndị nne gosiri mmasị n’ụmụ ha—na-ezi ha ihe ma na-enye ha ọzụzụ, soro ha na-efe ofufe, ma na-enye ha ntụrụndụ. Ndị nne na-asọpụrụ Chineke ghọrọ ndị inyeaka bara oké uru, na-akwanyere ịbụisi nke ndị di ha ùgwù, ka ha na-ebute ụzọ n’ime ihe n’ihi ezinụlọ ha. Ụmụaka ndị na-erube isi wetaara ndị mụrụ ha na Jehova Chineke ọṅụ. N’ezie, ezinụlọ na-atụ egwu Chineke n’oge Bible bụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka ụbọchị anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E kwesịrị ịrịba ama na tupu mgbe a, Jekọb emeela ihe ndị siri ike iji chebe ezinụlọ ya pụọ ná mmetụta nke ndị Kenean. O wuru ebe ịchụ àjà, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’ụdị kewapụrụ ya iche ná ndị agbata obi ya bụ́ ndị Kenean. (Jenesis 33:20; Ọpụpụ 20:24, 25) Ọzọkwa, ọ mara ụlọikwuu ya ná mpụga nke obodo Shekem ma gwuo olulu mmiri nke ya. (Jenesis 33:18; Jọn 4:6, 12) N’ụzọ dị otú a Daịna gaara amataworịị ọchịchọ Jekọb ka ọ ghara iso ndị Kenean na-akpakọrịta.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ezinụlọ gị pụrụ inwe obi ụtọ dị ka ezinụlọ ndị fere Jehova ofufe n’oge Bible