Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 6/1 p. 26
  • Ọ Ma Ihe Anyị Ga-emeli

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Ma Ihe Anyị Ga-emeli
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àjà Ndị Tọrọ Chineke Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Levitikọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 6/1 p. 26

Bịaruo Chineke Nso

Ọ Ma Ihe Anyị Ga-emeli

Levitikọs 5:2-11

MGBE otu nwaanyị na-ekwu banyere otú o si gbalịa ime ihe dị Chineke mma, ọ sịrị: “Anwara m ike m niile, ma ọ naghị adị m ka m na-agbalị.” Jehova Chineke ọ̀ na-anabata mgbalị niile ndị na-efe ya na-eme? Ọ̀ maara na ikike ha na ọnọdụ ha nwere ike ime ka ha ghara imeru ihe otú ha gaara eme? Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ ndị ahụ, ọ ga-abara anyị uru ma anyị leba anya n’ihe Iwu Mozis kwuru na Levitikọs 5:2-11 banyere ịchụ àjà ụfọdụ.

N’Iwu ahụ, Chineke kwuru na e nwere àjà ndị a ga-achụ iji kpuchie mmehie. N’ụdị mmehie ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ, onye mmehie ahụ mere ya n’amaghị ama ma ọ bụ n’echeghị echiche. (Amaokwu nke 2-4) Ọ bụrụ na ọ mata na ya emehiela, ọ ga-aga kwupụta mmehie ya ma weta àjà ikpe ọmụma, ya bụ, “obere nne atụrụ ma ọ bụ obere nne ewu.” (Amaokwu nke 5, 6) Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ dara ogbenye nke na o nweghị atụrụ ma ọ bụ ewu ọ ga-eji chụọ àjà ahụ? Iwu ahụ ò kwuru na ọ ga-aga gbaziri anụmanụ ahụ, si otú ahụ banye n’ụgwọ? Ọ̀ ga-arụgide ọrụ ruo mgbe ọ kpatara ego ọ ga-eji zụọ ya, gbuwe oge tupu ya achụọ àjà mkpuchi mmehie ahụ?

Ihe Iwu ahụ kwuru gosiri na Jehova ma ihe onye ahụ ga-emeli. Ọ sị: “Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-ewetara Jehova nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma maka mmehie o mere.” (Amaokwu nke 7) Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ahịrịokwu bụ́ “ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali” bụ “ọ bụrụ na aka ya agaghị eruli.” Ọ bụrụ na onye Izrel dara ezigbo ogbenye nke na ọ gaghị ewetali atụrụ, Chineke nwere mmasị ịnara ihe ọ ga-ewetali, ya bụ, nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye ahụ agaghịdị ewetali nnụnụ abụọ ahụ? Iwu ahụ kwuru, sị: “Ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka [ya bụ, iko asatọ ma ọ bụ iko itoolu] e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere.” (Amaokwu nke 11) Jehova mere ka ọ dịrị onye ogbenye ọnụ ntụ mfe, kweta ka ọ chụọ àjà mmehie n’ejighị ọbara.a N’Izrel, ịbụ ogbenye agaghị eme ka mmadụ ghara irite uru n’àjà mkpuchi mmehie ma ọ bụ mee ka onye ahụ na Chineke ghara ịdị ná mma.

Olee ihe iwu a Jehova nyere gbasara àjà ikpe ọmụma na-akụziri anyị banyere Jehova? Ọ bụ Chineke obi ebere na onye ghọtara ndị na-efe ya nke ọma, ọ makwa ihe ha ga-emeli na ihe ha na-agaghị emeli. (Abụ Ọma 103:14) Ọ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso, chọọkwa ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma n’agbanyeghị nsogbu anyị ndị dị ka ime agadi, ọrịa, ibu ezinụlọ ma ọ bụ mkpa anyị ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị amata na Jehova Chineke na-enwe obi ụtọ ma anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime, obi ga-eru anyị ala.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ọbara anụmanụ mere iji anụmanụ ekpuchi mmehie ji baa uru, n’ihi na Chineke weere ọbara ka ihe dị nsọ. (Levitikọs 17:11) Ọ̀ pụtaziri na ntụ ọka ahụ e gwere egwe onye ogbenye nyere abaghị uru ọ bụla? Mbanụ. Ihe Jehova ji kpọrọ ihe bụ obi umeala onye ahụ na otú o si jiri obi ya chụọ àjà ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọbara àjà anụmanụ a na-achụrụ Chineke otu ugbo n’afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kpuchiri mmehie mba ahụ niile, ma nke ogbenye ahụ.—Levitikọs 16:29, 30.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya