-
“Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Eprel
-
-
7. (a) Olee nkwa Hana kwere Chineke, maka gịnị? Gịnị ka Chineke meere ya? (b) Olee ihe a ga-eme Samuel n’ihi nkwa Hana kwere? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)
7 Hana bụ onye ọzọ mezuru nkwa o kwere Jehova. O kwere nkwa ahụ mgbe obi na-adịghị ya mma, ya ana-echegbu onwe ya n’ihi na ọ mụtaghị nwa nakwa n’ihi mkparị a na-akparị ya. (1 Sam. 1:4-7, 10, 16) Hana gwara Chineke otú ọ dị ya n’obi ma kwe ya nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ nnọọ na i lekwasị anya ná mmekpa ahụ́ nke ohu gị nwaanyị ma cheta m, wee ghara ichefu ohu gị nwaanyị ma nye ohu gị nwaanyị nwa nwoke, m ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya niile, ọ dịghịkwa agụba ga-emetụ ya n’isi.”a (1 Sam. 1:11) Jehova nụrụ ekpere Hana ma mee ka ọ mụta nwa nwoke. Obi tọgburu Hana atọgbu. Ma, o chefughị nkwa o kwere Chineke. Mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’aka Jehova ka m rịọtara ya.”—1 Sam. 1:20.
-
-
“Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Eprel
-
-
a Hana kwere Jehova nkwa na nwa ya ga-abụ onye Naziraịt ná ndụ ya niile. Ihe ọ pụtara bụ na a ga-edo nwa ya iche, nyefeekwa ya Jehova ka ọ na-ejere ya ozi dị nsọ.—Ọnụ Ọgụ. 6:2, 5, 8.
-