Inwe Ekele Maka Mgbakọta Ndị Kraịst
“Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.”—NDỊ HIBRU 10:24, 25.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ije mgbakọta nke ezi ndị Kraịst? (b) N’echiche dị aṅaa ka Jisọs na-anọ ná mgbakọta nke ụmụazụ ya?
LEE ihe ùgwù ọ bụ ije mgbakọta ndị Kraịst, ma ihe mejupụtara ya ọ dị ala karịa mmadụ iri ma ọ bụ ọtụtụ puku ndị na-efe Jehova, n’ihi na Jisọs sịrị: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha”! (Matiu 18:20) N’ezie, mgbe ọ na-ekwe nkwa ahụ, Jisọs nọ na-ekwu banyere okwu ikpe ndị ọ dị mkpa ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ lebara anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Matiu 18:15-19) Ma à pụrụ ijikwa ụkpụrụ dị n’okwu Jisọs ndị ahụ mee ihe banyere mgbakọta nile nke ndị Kraịst ndị e ji ekpere n’aha ya meghee ma mechie? Ee. Cheta, mgbe Jisọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, o kwere nkwa, sị: “Lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 28:20.
2 A pụghị inwe obi abụọ na Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ Onyenwe Anyị Jisọs Kraịst, nwere mmasị dị ukwuu ná mgbakọta nile nke ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ nọnyeere ha site na mmụọ nsọ Chineke. (Ọrụ 2:33; Mkpughe 5:6) Jehova Chineke nwekwara mmasị ná nzukọta ọnụ anyị. Nzube bụ isi nke nzukọ ndị dị otú ahụ bụ maka inye Chineke otuto “n’ime mkpọkọta mmadụ nile.” (Abụ Ọma 26:12) Anyị ije nzukọ ọgbakọ bụ ihe àmà nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ.
3. N’ihi ihe ndị dị aṅaa dị mkpa ka anyị ji enwe ekele maka mgbakọta ndị Kraịst?
3 E nwere ezi ihe ndị ọzọ mere anyị ji enwe ekele maka mgbakọta ndị Kraịst. Tupu ọ hapụ ụwa, Jisọs Kraịst họpụtara ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ịrụ ọrụ dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’inye ezinụlọ nke okwukwe ahụ nri ime mmụọ n’oge ya. (Matiu 24:45) Otu ụzọ dị mkpa e si enye nri ime mmụọ dị otú ahụ bụ site ná nzukọ ọgbakọ dị iche iche nakwa mgbakọta ndị ka ukwuu—mgbakọ dị iche iche. Onyenwe Anyị Jisọs Kraịst na-eduzi ohu a kwesịrị ntụkwasị obi inye ihe ọmụma dị mkpa ná mgbakọta ndị dị otú ahụ maka ndị nile chọrọ ịlanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ma nweta ndụ n’ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke.
4. ‘Omume’ dị aṅaa dị ize ndụ ka a kpọtụrụ aha na Bible, gịnị ga-enyekwara anyị aka izere ya?
4 N’ihi ya, ọ dịghị onye Kraịst ga-achọ ịzụlite omume ahụ dị ize ndụ Pọl onyeozi kwuru banyere ya, bụ́ onye dere, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ ha otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ịtụgharị uche n’ihe ùgwù na abamuru nke ije mgbakọta ndị Kraịst ga-enyere anyị aka iji iguzosi ike n’ihe na obi dum kwadoo mgbakọta ndị dị otú ahụ.
Nzukọ Ndị Na-ewuli Elu
5. (a) Olee mmetụta okwu anyị kwesịrị inwe ná nzukọ? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji gbuo oge n’ịkpọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa nzukọ?
5 Ebe ọ bụ na ndị Kraịst na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ Jehova na-arụ ọrụ ná nzukọ ndị Kraịst, onye ọ bụla nke na-eje ha kwesịrị ime ihe nile ọ pụrụ ime iji na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ na mmụọ nsọ ahụ, ‘na-emeghịkwa ihe ga-ewute Mmụọ Nsọ nke Chineke.’ (Ndị Efesọs 4:30) Mgbe Pọl onyeozi dere okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, ọ nọ na-ekwu banyere iji okwu eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. E kwesịrị iji ihe anyị na-ekwu mee ihe mgbe nile “iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.” (Ndị Efesọs 4:29) Nke a dị mkpa karịsịa ná mgbakọta ndị Kraịst. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint, Pọl mesiri ike mkpa ọ dị nzukọ ịbụ nke na-ewuli elu, nke a na-amụta ihe na ya, na-agbakwa ume. (1 Ndị Kọrint 14:5, 12, 19, 26, 31) Ndị nile bịara na-erite uru site ná nzukọ ndị dị otú ahụ, tinyere ndị ọhụrụ na-abịa ha, bụ́ ndị pụrụ ikwubi, sị: “Ọ bụ ezie na Chineke nọ n’etiti unu.” (1 Ndị Kọrint 14:25) N’ihi nke a, anyị ekwesịghị igbu oge ịkpọ ndị ọhụrụ nwere mmasị òkù isoro anyị zukọọ, n’ihi na ime otú ahụ ga-eme ka ọganihu ime mmụọ ha dị ngwa.
6. Gịnị bụ ihe ụfọdụ ndị na-enye aka ime ka nzukọ na-ewuli elu?
6 Ndị nile e kenyere okwu, ajụjụ ọnụ, ma ọ bụ ihe ngosi ná nzukọ ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na okwu ha bụ ma nke na-ewuli elu ma nke kwekọrọ n’Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible. Tinyere ikwu okwu ziri ezi, anyị kwesịrị ikwupụta echiche na mmetụta uche ndị kwekọrọ n’àgwà ịhụnanya nke Chineke na Kraịst. Ọ bụrụ na ndị nile na-eme ihe omume ná nzukọ eburu n’uche igosipụta ‘mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke,’ dị ka ọṅụ, ogologo ntachi obi, na okwukwe, mgbe ahụ, ndị nile bịara ga-enwerịrị mmetụta nke ịbụ ndị e wuliri elu.—Ndị Galetia 5:22, 23.
7. Olee otú ndị nile na-eje nzukọ pụrụ isi tụnye ụtụ n’inwe mgbakọta na-ewuli elu?
7 Ọ bụ ezie na nanị ole na ole pụrụ inwe òkè n’ihe omume ná nzukọ ọgbakọ, mmadụ nile pụrụ ịtụnye ụtụ ná mgbakọta na-ewuli elu. Mgbe mgbe a na-enwe ohere maka ndị na-ege ntị ịza ajụjụ. Ndị a bụ oge maka ikwupụta okwukwe anyị n’ihu ọha. (Ndị Rom 10:9) E kwesịghị iji ha mee ihe mgbe ọ bụla dị ka ohere iji kwalite echiche onwe anyị, itu ọnụ banyere ihe anyị rụpụtara, ma ọ bụ iji katọọ onye kwere ekwe ibe anyị. Nke ahụ ọ̀ gaghị ewute mmụọ Chineke? Ọ na-akasị mma idozi nghọtahie anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na nzuzo na mmụọ nke ịhụnanya. Bible na-asị: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:32) Lee ohere magburu onwe ya mgbakọta ndị Kraịst na-enye anyị itinye ndụmọdụ ọma nke a n’ọrụ! Iji mezuo nke ahụ, ọtụtụ na-abịarute nzukọ n’oge ma na-anọtụkwu mgbe e mechiri. Nke a na-enyekwara ndị ọhụrụ nwere mmasị aka, bụ́ ndị nwere mkpa pụrụ iche ịbụ ndị nwere mmetụta nke ịbụ ndị a nabatara. N’ihi ya, ndị Kraịst nile raara onwe ha nye nwere òkè ha ga-ekere n’ime ka nzukọ na-ewuli elu site ‘n’ịtụgharịta uche n’ahụ ibe ha na ịkpasurịta ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.’
Kwadebe nke Ọma
8. (a) Àjà dị aṅaa kwesịrị ịja mma ka ụfọdụ na-achụ iji jee nzukọ? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jehova na-esetịpụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ?
8 Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdịtụrụ ụfọdụ mfe ije mgbakọta ndị Kraịst, nye ndị ọzọ, ọ chọrọ ịnọgide na-achụ àjà. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst bụ́ nne bụ́ onye na-aghaghị ịrụ ọrụ ego iji gboo mkpa nke ezinụlọ ya na-alọtakarị ụlọ ma bụrụ onye ike gwụsịrị. Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ ghaghị isi nri ma nyere ụmụ ya aka ịkwadebe maka nzukọ. Ndị Kraịst ndị ọzọ pụrụ inwe ogologo njem ime iji gaa nzukọ, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọrịa ma ọ bụ ịka nká pụrụ ịkpara ha ókè. N’ezie, Jehova Chineke na-aghọta ọnọdụ onye ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi na-eje nzukọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na-aghọta mkpa pụrụ iche nke atụrụ nke ọ bụla nọ n’ìgwè atụrụ ya. “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ,” ka Bible na-ekwu, “[Jehova] ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.”—Aịsaịa 40:11.
9, 10. Olee otú anyị pụrụ isi nweta abamuru kasị ukwuu site ná nzukọ?
9 Ndị ahụ na-aghaghị ịchụ àjà dị ukwuu iji na-agachi nzukọ anya pụrụ ịbụ ndị a kpaara oge ha pụrụ itinye n’ịkwadebe ihe a ga-atụle ókè. Ịgbaso usoro ọgụgụ Bible kwa izu na-eme ka ije Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụrụ nke na-enyekwu ụgwọ ọrụ. N’otu aka ahụ, ịkwadebe maka nzukọ ndị ọzọ tupu oge eruo, dị ka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, na-eme ka ndị a na-abakwu uru. Site n’ịgụ ihe ọmụmụ ahụ tupu oge eruo na site n’ịtụle ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime akụkụ akwụkwọ Bible ndị e zoro aka na ha, ndị ahụ nwere ọnọdụ ezinụlọ na-achọ oge ga-adịkwu njikere ikere òkè buru ibu ná ntụle ndị a dị mkpa sitere na Bible.
10 Ndị ọzọ, bụ́ ndị ọnọdụ ha na-adịghị akpachara ókè, pụrụ itinyekwu oge n’ịkwadebe nzukọ. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ime nnyocha n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha ndị a na-ehotaghị. N’ụzọ dị otú a mmadụ nile pụrụ ịdị njikere irite uru kasịnụ ná nzukọ ma kere ókè dị mma n’iwuli ọgbakọ elu site n’okwu na azịza ha. Site n’ịkwadebe nke ọma, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ga-esetịpụ ihe nlereanya ọma n’inye azịza ndị dị mkpirikpi, dị nkenke. N’ihi nkwanye ùgwù maka ndokwa Jehova, ndị bịaranụ ga-ezere omume ọ bụla na-adọpụ uche mgbe nzukọ na-aga n’ihu.—1 Pita 5:3.
11. N’ihi gịnị ka ọzụzụ onwe onye ji dị mkpa iji kwadebe maka nzukọ?
11 Ihe omume na ntụrụndụ ndị na-adịghị mkpa maka ahụ ike ime mmụọ anyị pụrụ iri oge anyị gabiga òkè. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dị anyị mkpa inyocha onwe anyị ma ‘ghara ịghọ ndị na-enweghị uche’ n’ihe banyere iji oge anyị eme ihe. (Ndị Efesọs 5:17) Nzube anyị kwesịrị ịbụ ‘ịzụchapụta oge’ site n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa iji tinye oge ka ukwuu n’ọmụmụ Bible onwe onye na ịkwado nzukọ, nakwa n’ozi Alaeze. (Ndị Efesọs 5:16) N’eziokwu, nke a adịghị adịcha mfe mgbe nile, ọ chọkwara ọzụzụ onwe onye. Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-elebara nke a anya na-atọ ntọala ọma maka ọganihu n’ọdịnihu. Pọl degaara onye ibe ya ọ tọrọ bụ́ Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a [ndụmọdụ Pọl nyere Timoti]; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Timoti 4:15.
Ihe Nlereanya Ndị Sitere n’Okwu Chineke
12. Ihe nlereanya dị aṅaa pụrụ iche ka ezinụlọ Samuel setịpụrụ?
12 Tụlee ihe nlereanya ọma ezinụlọ Samuel setịpụrụ, bụ́ ndị na-ekerechi òkè anya ná ndokwa maka isoro ndị ofufe ibe ha gbakọta mgbe ụlọikwuu Chineke dị na Shaịlo. Nanị ndị ikom ka a chọrọ ka ha mee nleta kwa afọ n’ememe oriri. Ma nna Samuel, bụ́ Elkena, na-akpọrọ ezinụlọ ya dum ka o “si n’obodo ya na-arịgo kwa afọ ịkpọ isi ala na ịchụru Jehova nke usuu nile nke ndị agha àjà n’ime Shaịlo.” (1 Samuel 1:3-5) Ọ pụrụ ịbụ na obodo Samuel, bụ́ Ramataim-zofim, dị nso n’ụsọ osimiri Rentis nke oge a, ná mgbada nke “ugwu Efraim.” (1 Samuel 1:1) Ya mere njem ahụ a na-eme gaa Shaịlo gaara agụnye ime njem nke ihe dị ka kilomita 30, bụ́ iji ụkwụ eme njem nke na-akpata ike ọgwụgwụ n’oge ndị ahụ. Nke a bụ ihe ezinụlọ Elkena ji iguzosi ike n’ihe mee “kwa afọ, mgbe ọ bụla [ha] rịgoro n’ụlọ Jehova.”—1 Samuel 1:7.
13. Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi setịpụrụ n’oge Jisọs nọ n’ụwa?
13 Jisọs tolitekwara dị ka akụkụ nke otu ezinụlọ buru ibu. Kwa afọ ezinụlọ ahụ na-eme njem site Nazaret, ihe dị ka kilomita 100 n’ebe ndịda, iji gaa Ememe Ngabiga na Jerusalem. E nwere ụzọ abụọ ha pụrụ isiwo. Ụzọ gara nnọọ kpọmkwem n’ebe ahụ gụnyere ịrịda banye ná Ndagwurugwu Megido, mgbe ahụkwa ime nrịgo nke ihe dị ka mita 600 gabiga ókèala Sameria, gawazie Jerusalem. Ụzọ nke ọzọ a ma ama bụ nke ahụ Jisọs si na ya mee njem ikpeazụ ya gaa Jerusalem na 33 O.A. Nke a gụnyere iji ụkwụ gbadaa Ndagwurugwu Jọdan ruo ihe dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri ruo mgbe o rutere “n’ókèala Judia . . . ofe ọzọ nke Jọdan.” (Mak 10:1) Site n’ebe a, ‘ụzọ rịgoro Jerusalem’ dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 30 n’ịdị anya, na-agụnye nrịgo nke ihe karịrị mita 1,100. (Mak 10:32) Mgbe nile, ìgwè ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eme ememe mere njem ahụ siri ike site Galili gaa Jerusalem. (Luk 2:44) Lee ihe nlereanya ọma nke a bụ nye ndị ohu Jehova ná mba ndị bara ọgaranya taa, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha pụrụ ije mgbakọta ndị Kraịst n’ụzọ dịtụ mfe, n’ihi ụdị ihe e ji eme njem nke oge a!
14, 15. (a) Olee ihe nlereanya Ana setịpụrụ? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’àgwà ọma nke ụfọdụ ndị ọhụrụ na-eje nzukọ gosipụtara?
14 Ihe nlereanya ọzọ bụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ dị afọ 84 bụ́ Ana. Bible na-ekwu na ọ ‘pụghị n’ụlọ Chineke.’ (Luk 2:37) Ọzọkwa, Ana gosiri ndị ọzọ mmasị ịhụnanya. Mgbe ọ hụrụ nwatakịrị ahụ bụ́ Jisọs, matakwa na ọ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, gịnị ka o mere? O kelere Chineke ma malite ‘ịgwa ndị nile na-eche mgbapụta nke Jerusalem okwu banyere Ya.’ (Luk 2:38) Lee àgwà ọma nke a bụ, ihe nlereanya nye ndị Kraịst taa!
15 Ee, ije na ikere òkè ná nzukọ anyị kwesịrị ịbụ nnọọ ihe obi ụtọ nke na, dị ka Ana, anyị agaghị achọ ka ọ kwaa anyị ma ọlị. Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-enwe mmetụta dị otú a. Ebe ha pụtaworo n’ọchịchịrị baa n’ìhè dị ebube nke Chineke, ha chọrọ ịmụta ihe nile ha pụrụ ịmụta, ọtụtụ na-egosikwa ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu n’ebe nzukọ ndị Kraịst dị. N’aka nke ọzọ, ndị nọtetụworo aka karị n’eziokwu aghaghị ịnọ na nche megide ‘ịhapụ ịhụnanya ahụ ha nwere na mbụ.’ (Mkpughe 2:4) Nsogbu ahụ ike siri ike ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nke mmadụ na-apụghị ịchịkwa pụrụ ịkpara ije nzukọ ókè mgbe ụfọdụ. Ma anyị ekwesịtụghị ikwe ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, ntụrụndụ, ma ọ bụ enweghị mmasị mee ka anyị bụrụ ndị na-abịa nzukọ na-akwadebeghị akwadebe, na-enweghị mmasị, ma ọ bụ ndị na-adịghị ejechi anya.—Luk 8:14.
Ihe Nlereanya Kasị Mma
16, 17. (a) Gịnị bụ àgwà Jisọs n’ebe mgbakọta ime mmụọ dị? (b) Omume ọma dị aṅaa ka ndị Kraịst nile kwesịrị ịgbalị ịgbaso?
16 Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya pụrụ iche n’igosi ekele maka mgbakọta ime mmụọ. Mgbe ọ ka bụ nwata dị afọ 12, o gosipụtara ịhụnanya ya maka ụlọ Chineke dị na Jerusalem. Ndị mụrụ ya amaghị ebe ọ nọ ma mesịa hụ ya ka o so ndị nkụzi na-ekwurịta Okwu Chineke n’ụlọ nsọ. Ná nzaghachi nye nchegbu ndị mụrụ ya, Jisọs jụrụ n’ụzọ nkwanye ùgwù, sị: “Ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” (Luk 2:49) N’ido onwe ya n’okpuru, nwatakịrị ahụ bụ́ Jisọs so ndị mụrụ ya laghachi na Nazaret. N’ebe ahụ ọ nọgidere na-egosi ịhụnanya ya maka nzukọ ofufe site n’ịgachi ụlọ nzukọ anya. N’ihi ya, mgbe ọ malitere ozi ya, Bible na-akọ, sị: “O wee bịa ruo Nazaret, ebe a zụpụtara Ya rịị, O wee baa n’ụlọ nzukọ ha n’ụbọchị izu ike, dị ka Ọ na-eme mgbe dum, O wee bilie ịgụ akwụkwọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe Jisọs gụsịrị ma kọwaa Aịsaịa 61:1, 2, “okwu nile nke amara nke si n’ọnụ Ya pụta” wee malite iju ndị na-ege ntị anya.—Luk 4:16, 22.
17 Nzukọ ndị Kraịst taa na-agbaso otu ụkpụrụ a bụ isi. Mgbe e jisịrị abụ otuto na ekpere meghee nzukọ, a na-agụ ma kọwaa amaokwu ndị si na Bible (ma ọ bụ amaokwu ndị e hotara n’akwụkwọ e ji amụ Bible). Ezi ndị Kraịst nwere ibu ọrụ nke iṅomi omume dị mma Jisọs Kraịst mere. Dị ka ọnọdụ ha nyere ohere, ha na-enweta obi ụtọ n’ịgachi mgbakọta ndị Kraịst anya.
Ihe Nlereanya Ndị nke Oge A
18, 19. Ihe nlereanya dị aṅaa magburu onwe ha ka ụmụnna ndị bi ná mba ndị na-abachaghị ọgaranya setịpụworo n’ihe banyere nzukọ na mgbakọ dị iche iche?
18 N’akụkụ ụwa ndị na-abachaghị ọgaranya, ọtụtụ n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị na-esetịpụ ihe nlereanya ọma nke inwe ekele maka mgbakọta ndị Kraịst. Na Mozambique, o were otu onye nlekọta distrikti, bụ́ Orlando, na nwunye ya, bụ́ Amélia, hour 45 iji gaa ije ihe dị ka kilomita 90 gafee otu ugwu dị elu iji lekọta otu mgbakọ. E mesịa ha aghaghị ime otu njem ahụ laghachi iji lekọta mgbakọ nke na-esonụ. Orlando ji obi umeala kọọ, sị: “Ọ dị anyị ka o nweghị ihe anyị mere mgbe anyị zutere ụmụnna si n’Ọgbakọ Bawa. Ije mgbakọ ahụ ma laghachikwa n’ụlọ ha gụnyere iji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita 400 n’ụbọchị isii, e nwekwara n’etiti ha otu nwanna dị afọ 60!”
19 Gịnị banyere inwe ekele maka nzukọ ọgbakọ kwa izu? Kashwashwa Njamba bụ nwanna nwanyị na-esighị ike nọ n’afọ ndị nke 70 ya. O bi na Kaisososi, otu obodo nta dị ihe dị ka kilomita ise site n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Rundu, Namibia. Iji jee nzukọ, ọ na-eje ihe dị ka kilomita iri uje na ụla gafere ime ọhịa. A pụnarawo ndị ọzọ ihe n’ụzọ a, ma Kashwashwa nọgidere na-abịa. A na-eduzi ihe ka ọtụtụ n’ime nzukọ ndị ahụ n’asụsụ ndị ọ na-adịghị aghọta. Ya mere olee otú o si erite uru site n’ije? “Site n’ịdị na-esonye n’ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ,” ka Kashwashwa na-ekwu, “ana m agbalị ịchọpụta ihe a na-ekwu maka ya.” Ma ọ maghị akwụkwọ, ya mere olee otú o si na-esonye n’ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ? “Ana m ege ntị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị m bu n’isi,” ka ọ na-aza. N’afọ ndị gafewokwaranụ, o buruwo ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ n’isi. Iji mee ka ikike ya iji Bible eme ihe ka mma, ọ na-eje klas ịmụ ịgụ na ide bụ́ nke ọgbakọ ahụ mere ndokwa ya. “Ọ na-amasị m ije nzukọ ndị ahụ,” ka ọ na-ekwu. “E nwere ihe ọhụrụ a ga-amụta mgbe ọ bụla. Ọ na-amasị m isoro ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị kpakọrịta. Ọ bụ ezie na apụghị m ịgwa ha nile okwu, ha na-abịa kelee m mgbe nile. Nke kasịkwa mkpa, amaara m na site n’ije nzukọ ndị ahụ, ana m eme ka obi Jehova ṅụrịa.”
20. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị ahapụ mgbakọta ndị Kraịst anyị?
20 Dị ka Kashwashwa, ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova n’ụwa dum na-egosi obi ekele kwesịrị ịja mma maka mgbakọta ndị Kraịst. Ka ụwa Setan na-eche mbibi ya ihu, anyị ekwesịtụghị ịhapụ mgbakọta ọnụ nke onwe anyị. Kama, ka anyị nọgide na-amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, gosikwa ekele miri emi maka nzukọ na mgbakọ dị iche iche. Ọ bụghị nanị na nke ahụ ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa kama ọ ga-abara anyị uru n’ụzọ bara ụba ka anyị na-ekere òkè n’izi ihe Chineke nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Ilu 27:11; Aịsaịa 48:17, 18; Mak 13:35-37.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ije mgbakọta ndị Kraịst?
◻ Olee otú ndị nile bịara pụrụ isi tụnye ụtụ n’inwe nzukọ na-ewuli elu?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa pụrụ iche ka Jisọs Kraịst setịpụrụ?
◻ Gịnị ka a pụrụ ịmụta n’aka ụmụnna ndị bi ná mba ndị na-abachaghị ọgaranya?
[Igbe dị na peeji nke 17]
Ha Na-enwe Ekele Maka Nzukọ Kwa Izu
Ọtụtụ nde ndị mmadụ bi n’obodo ukwu ebe ịda ogbenye na mpụ jupụtara. N’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ezi ndị Kraịst n’etiti ha na-egosi ekele kwesịrị ịja mma maka mgbakọta ndị Kraịst. Otu okenye na-eje ozi n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Soweto bụ́ Gauteng, South Africa, na-akọ, sị: “N’otu ọgbakọ nke nwere Ndịàmà na ndị nkwusa a na-emebeghị baptism 60, anyị na-enwe ihe nọ n’agbata 70 na 80, mgbe ụfọdụkwa karịa, ndị na-abịa nzukọ anyị. Ọ bụ ezie na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ahụ adịghị eme njem dị anya iji bịa, ọnọdụ dị n’akụkụ a nke Soweto siri ike. A mara otu nwanna nwoke mmà n’azụ mgbe o ji ụkwụ na-eje otu nzukọ. Ọ dịkarịa ala, e jidere ụmụnna nwanyị abụọ n’ike ná mgbalị ịpụnara ha ihe. Ma nke a akwụsịghị ha ịbịa. Na Sunday, anyị na-enwe oge ọmụmụ abụ dị nkenke mgbe anyị jisịrị ekpere mechie nzukọ. Ọ dịkarịa ala, pasent 95 na-echere ma bụọ abụ nile a ga-eji mee ihe ná nzukọ nke izu na-esonụ. Nke a na-enyere ndị ọhụrụ nwere mmasị aka ịmụta abụ ndị ahụ ma soro n’ịbụ abụ.”
Ndị bi n’ime obodo nwere ihe mgbochi ndị ọzọ, dị ka ogologo njem nke ha na-aghaghị ime iji jee nzukọ ugbo atọ n’izu. Otu di na nwunye nwere mmasị bi kilomita 15 site n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Lobatse, Botswana. N’afọ gara aga, ha na ụmụ ha abụọ jechiri nzukọ anya. Di ya na-arụzi akpụkpọ ụkwụ iji kwadoo ezinụlọ ahụ. Nwunye ya na-ere ụmụ irighiri ihe iji tụkwasị ihe n’ego ezinụlọ ahụ na-akpata ka ha wee nwee ike ịkwụ ụgwọ ụgbọ uje na ụla nzukọ.
N’otu uhuruchi nke oge okpomọkụ na-adịbeghị anya, mgbe ha sosịrị onye nlekọta sekit mee nzukọ, ezinụlọ a tọrọ n’otu ebe bọs na-akwụsị n’elekere 9:00 nke abalị. Bọs mechiri ọsọ ọsọ n’ihi ajọ ihu igwe. Otu onye uwe ojii kwụsịrị ụgbọala ya ma jụọ ha ihe ha na-eme. Mgbe ọ nụrụ banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ ma kwọrọ ha gaa njem kilomita 15 ahụ laa ụlọ ha. Nwunye ya, onye bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, gwara di ya, sị: “Ị hụla, ọ bụrụ na anyị ebute nzukọ ụzọ, Jehova na-enye ihe mgbe nile.” Ugbu a di ya ekwupụtawo ọchịchọ ịghọkwa onye na-ekwusa ozi ọma ahụ.
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndịàmà dị ka ndị a nọ na Romania na-esetịpụ ihe nlereanya ọma nke inwe ekele maka mgbakọta ndị Kraịst