Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Jehova Dị Ukwuu n’Ike’
    Bịaruo Jehova Nso
    • 15. Jehova na-eji ike ya eme n’ihi nzube dị aṅaa n’ebe ndị ohu ya nọ, oleekwa otú e si gosipụta nke a n’ihe banyere Ịlaịja?

      15 Jehova na-ejikwa ike ya eme ihe ga-abara anyị uru n’otu n’otu. Rịba ama ihe 2 Ihe E Mere 16:9 na-ekwu: “N’ihi na Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” Ahụmahụ Ịlaịja, bụ́ nke a kpọtụrụ uche ná mmalite, bụ otu ihe atụ. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka ọ hụ ngosipụta ahụ dị egwu nke ike Chineke? Ọ bụ n’ihi na ajọ Eze Nwanyị Jezibel aṅụwo iyi ịhụ na e gburu Ịlaịja. Onye amụma ahụ na-agba ọsọ, na-agba ọsọ maka ndụ ya. Ọ dị ya ka ọ bụ nanị ya fọdụrụ, ụjọ ji ya, o nwekwara nkụda mmụọ—dị ka a ga-asị na ndọgbu nile ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ abụrụwo n’efu. Iji kasie nwoke ahụ na-echegbu onwe ya obi, Jehova chetaara Ịlaịja n’ụzọ doro anya ike Chineke. Ifufe, ala ọma jijiji, na ọkụ ahụ gosiri na Onye kasị ike n’eluigwe na ala nọnyeere Ịlaịja n’ebe ahụ. Gịnị na-atụ ya ụjọ n’ebe Jezibel nọ, ebe Chineke pụrụ ime ihe nile nọnyeere ya?—1 Ndị Eze 19:1-12.b

  • ‘Jehova Dị Ukwuu n’Ike’
    Bịaruo Jehova Nso
    • b Bible na-ekwu na “Jehova anọghị n’ifufe ahụ . . .  n’ala ọma jijiji ahụ . . .  n’ọkụ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’adịghị ka ndị na-efe chi ndị bụ́ ihe e kere eke, ndị a na-akọ n’akụkọ ifo, ndị ohu Jehova adịghị achọ ya n’ike ndị sitere n’okike. Ọ dị nnọọ ukwuu ịnọ n’ime ihe ọ bụla o kere eke.—1 Ndị Eze 8:27.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya