Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/15 p. 4-7
  • Ndụ Ọhụrụ Maka Ndị Nna Nna Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Ọhụrụ Maka Ndị Nna Nna Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
  • Mbilite n’Ọnwụ Gaa ná Ndụ n’Eluigwe
  • Ihe Ndị Ga-eme Tupu Mbilite n’Ọnwụ nke Elu Ụwa
  • Paradaịs n’Elu Ụwa
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Onye Nwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/15 p. 4-7

Ndụ Ọhụrụ Maka Ndị Nna Nna Anyị

OKWU Chineke, bụ́ Bible, ọ̀ na-akụzi na onye ọ bụla na-agafe nnọọ n’enweghị nsogbu banye n’ịdị ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ mgbe a nwụrụ? Ee e, ọ dịghị. Bible na-enye olileanya dị ebube nke ndụ mgbe a nwụsịrị, ma ọ bụghị n’ụzọ ọtụtụ ndị si eche na ọ na-eme.

Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere nna nna anyị mbụ, bụ́ Adam. Jehova “wee were ájá sitere n’ala” mee ya. (Jenesis 2:7) Adam nwere ohere ibi ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ụwa. (Jenesis 2:16, 17) Otú ọ dị, o nupụụrụ Onye Okike ya na-ahụ n’anya isi, ihe ọ rụpụtakwara bụ ọnwụ.

Ebee ka Adam gara mgbe ọ nwụrụ? Chineke gwara ya, sị: “Ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”—Jenesis 3:19.

Ebee ka Adam nọ tupu Jehova ekee ya site n’ájá? O nweghị. Ọ dịghị adị. Ya mere mgbe Jehova kwuru na Adam “ga-alata n’ala,” ọ ghaghị ibuwo n’uche nanị na Adam ga-aghọkwa ihe na-enweghị ndụ, dị nnọọ ka ájá. Adam ‘agabigaghị’ ịghọ onye mbụ n’ụwa nke mmụọ nke ndị nna nna. Ọ gafereghịkwa banye ná ndụ oké ọṅụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ahụhụ ebighị ebi n’ebe ntaramahụhụ. Mgbanwe o mere agwụla site ná ndụ gaa n’enweghị ndụ, site n’ọnọdụ nke ịdị adị gaa na nke adịghị adị.

Gịnị banyere ndị ọzọ n’agbụrụ mmadụ? Ụmụ Adam hà na-akwụsịkwu ịdị adị n’ọnwụ? Bible na-aza: “Ha nile [ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ] na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”—Eklisiastis 3:19, 20.

Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ

Ee, ndị nwụrụ anwụ enweghị ndụ, enweghị ike ịnụ ihe, ịhụ ihe, ikwu okwu, ma ọ bụ iche echiche. Dị ka ihe atụ, Bible na-asị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi.” Bible na-ekwukwa, sị: “Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW, (ili)], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 6, 10.

Ya mere, dị ka Okwu Chineke na-ekwu, mgbe ndị mmadụ dị ndụ, ha maara banyere ọnwụ. Otú ọ dị, mgbe ọnwụ bịara, ha adịghị ama ihe ọ bụla. Ha adịghị eguzo n’akụkụ ozu nke ha, na-ekiri ihe a na-eme ya. N’adịghị adị e nweghị ma ihe ụtọ ma ihe mgbu, ma ọṅụ ma iru újú. Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ngafe nke oge. Nke ha bụ ọnọdụ amaghị ihe na-aganụ nke dị omimi karịa ụra ọ bụla.

Job, bụ́ ohu Chineke n’oge ochie, maara na ndị mmadụ adịghị adịgide ndụ mgbe ha nwụsịrị. Ọ ghọtakwara na ma Chineke etinyeghị aka, a gaghị enwe olileanya ọ bụla nke ịlaghachite ndụ. Job sịrị: “Onye dị ike ga-anwụ, ike ga-agwụkwa ya: mmadụ wee kubie ume, olee ebe ọ nọkwa? Mmadụ edinawo, ọ dịghị ebilikwa.” (Job 14:10, 12) N’ezie Job atụghị anya na mgbe ọ nwụrụ na ya ga-esonyere ndị nna nna ya n’ụwa nke ndị bụ mmụọ.

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ

Ebe ọ bụ na ndị dị ndụ na-akwụsị ịdị adị n’ọnwụ, ajụjụ dị oké mkpa bụ nke ahụ Job welitere mgbe ọ gara n’ihu ịjụ: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?” Job n’onwe ya nyere azịza a: “Ụbọchị nile nke obubu agha m [n’ime ili] ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị [Jehova] ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.”—Job 14:14, 15.

N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na Job ga-agafere banye n’adịghị adị, Chineke agaghị echezọ ya. Job nwere okwukwe na oge ga-abịa mgbe Jehova Chineke “ga-akpọ” ya bịaghachi ná ndụ site ná mbilite n’ọnwụ.

Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke, gosiri na olileanya Job ná mbilite n’ọnwụ bụ nke nwere isi. Jisọs nwapụtara na a pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site na ya ime ya! Ọ nọghị ya ịkpọlite Job, ma mgbe ọ nọ n’elu ụwa Jisọs kpọlitere nwa otu nwanyị di ya nwụrụ onye sitere n’obodo Nain. Jisọs kpọlitekwara nwa nwanyị dị afọ 12 nke otu nwoke aha ya bụ́ Jaịrọs bịaghachi ná ndụ. Ọ kpọlitekwara enyi ya bụ́ Lazarọs, onye nwụworo ruo ụbọchị anọ.—Luk 7:11-15; 8:41, 42, 49-56; Jọn 11:38-44.

Tinyere ịrụ ọrụ ebube ndị a, Jisọs kwuru banyere nnukwute mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) E mesịa, Pọl onyeozi, onye Jehova ji kpọlite otu nwa okorobịa, kwupụtakwara nkwenye ná mbilite n’ọnwụ nke ọdịnihu. Ọ sịrị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 20:7-12; 24:15.

Ntụaka Akwụkwọ Nsọ ndị a gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ọdịnihu adịghị agụnye ndụ gara n’ihu n’ógbè ndị bụ mmụọ. Ha na-ezo aka n’oge mgbe ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ga-alaghachite ná ndụ n’anụ ahụ nkịtị kpọmkwem n’ebe a n’elu ụwa. Ndị a a kpọlitere n’ọnwụ agaghị abụ ndị na-echetaghị ihe ọ bụla banyere ndụ mbụ ha n’elu ụwa. A gaghị amụgharị ha dị ka ụmụ ọhụrụ. Kama nke ahụ, ha ga-abụ otu ndị ahụ ha bụ mgbe ha nwụrụ, na-enwe otu ncheta na ọdịdị ndị ahụ. Ha ga-amata onwe ha, ndị ọzọ ga-amatakwa ha. Lee aha ihe ọṅụ ọ ga-abụ ka ndị a na-esonyeghachiri ndị enyi na ezinụlọ ha! Leekwa ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-akpali akpali izute ndị nna nna anyị ha!

Mbilite n’Ọnwụ Gaa ná Ndụ n’Eluigwe

Ọ̀ bụ na Jisọs ekwughị na ụfọdụ ga-aga eluigwe? Ee, o kwuru. N’uhuruchi tupu e gbuo ya, ọ sịrị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị; . . . ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na Mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe Mụ onwe m nọ.” (Jọn 14:2, 3) Jisọs na-agwa ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, ma okwu ya apụtaghị na ndị ezi omume nile ga-aga eluigwe.

Jisọs gosiri na ndị a kpọlitere gaa n’eluigwe aghaghị iru ihe ụfọdụ a chọrọ karịa nanị ibi ndụ dị mma. Otu ihe a chọrọ bụ inwe ezi ihe ọmụma nke Jehova na nzube ya. (Jọn 17:3) Ihe ndị ọzọ a chọrọ bụ igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst na irubere Chineke isi. (Jọn 3:16; 1 Jọn 5:3) Ihe ọzọkwa a chọrọ bụ ịbụ onye ‘a mụrụ ọzọ’ dị ka onye Kraịst e mere baptism nke e ji mmụọ nsọ Chineke mụta. (Jọn 1:12, 13; 3:3-6) Ihe ọzọ a chọrọ maka ndụ eluigwe bụ ịtachi obi dị ka Jisọs tachiri, na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ọbụna ruo ọnwụ.—Luk 22:29; Mkpughe 2:10.

E nwere ihe kpatara e ji chọọ oké ihe ndị dị otú ahụ. Ndị a kpọlitere gaa n’eluigwe nwere ọrụ dị mkpa ịrụ. Jehova maara na gọọmenti mmadụ apụghị ma ọlị inwe ihe ịga nke ọma n’ilekọta ihe ndị a na-eme n’ụwa. Ya mere o dokwara maka gọọmenti, ma ọ bụ Alaeze nke eluigwe, nke ga-achị isi n’elu agbụrụ mmadụ. (Matiu 6:9, 10) Jisọs ga-abụ Eze nke Alaeze ahụ. (Daniel 7:13, 14) Ụfọdụ ndị a họọrọ site n’ụwa ma kpọlite ha gaa n’eluigwe ga-eso ya chịa. Bible kwuru na ndị a a kpọlitere ga-aghọ “alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha [ga-abụkwa] eze n’elu ụwa.”—Mkpughe 5:10.

Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ ọ̀ ga-eru ihe ndị a chọrọ maka mbilite n’ọnwụ nke eluigwe? Ee e. N’esighị ha n’aka, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị nọ n’ụra ọnwụ erughị eru. Ọtụtụ nwere ohere dị nta ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị maka ịmụta eziokwu banyere Jehova na nzube ya nile. Ha biri ndụ ma nwụọ n’enweghị ihe ọmụma ọ bụla banyere Jisọs Kraịst ma ọ bụ banyere Alaeze Chineke.

Jisọs kpọrọ ndị ga-aga eluigwe “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) E mesịa e kpughere na ọnụ ọgụgụ ndị “a gbatararịị n’ụwa” iso Kraịst chịa n’eluigwe ga-abụ 144,000. (Mkpughe 14:1-3; 20:6) Ọ bụ ezie na 144,000 bụ ọnụ ọgụgụ buru ibu iju “ọtụtụ ebe obibi” Jisọs zoro aka na ha, ọ dị nta ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ ndị siteworo n’Adam.—Jọn 14:2.

Ihe Ndị Ga-eme Tupu Mbilite n’Ọnwụ nke Elu Ụwa

Ka anyị tụleghachi ihe anyị kwuworo ruo ugbu a. Dị ka Bible na-ekwu, ndị nwụrụ anwụ enweghị ndụ n’ọnwụ ruo mgbe Jehova Chineke kpọlitere ha. A na-akpọlite ụfọdụ gaa ná ndụ n’eluigwe, ebe ha ga-eso Jisọs Kraịst chịa n’ọchịchị Alaeze ahụ. A ga-akpọlite ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’elu ụwa, ịghọ ndị Alaeze ahụ ga-achị.

N’otu akụkụ site ná mbilite n’ọnwụ nke elu ụwa, Jehova ga-emezu nzube ya maka ụwa. Jehova kere ya “ka e wee biri n’ime ya.” (Aịsaịa 45:18) Ọ gaje ịbụ ebe obibi na-adịgide adịgide nke agbụrụ mmadụ. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 115:16.

Tupu mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ụwa amalite, oké mgbanwe dị iche iche aghaghị iwere ọnọdụ. Ọ ghaghị ịbụ na ị ga-ekwere na ọ bụghị nzube Chineke ka ụwa jupụta n’agha, mmetọ, mpụ, na ime ihe ike. Ọ bụ ndị mmadụ na-enweghị nkwanye ùgwù ọ bụla maka Chineke na iwu ya nile nke ezi omume na-akpata nsogbu ndị a. Ya mere, Alaeze Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa’—oké nzọụkwụ n’ime ka e mee uche ya n’elu ụwa. (Mkpughe 11:18) Alaeze ahụ ga-ebibi ndị ajọ omume nile, na-ahapụ ndị ezi omume ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:9, 29.

Paradaịs n’Elu Ụwa

Ndị a kpọlitere n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha ga-abụ ndị dị nwayọọ n’obi, na-eche maka ndị ọzọ, na-eme ihe ziri ezi. (Tụlee Matiu 5:5.) N’okpuru nlekọta ịhụnanya nke Alaeze Chineke, ha ga-ebi ndụ obi ụtọ n’ịnọ ná ntụkwasị obi. Bible na-enye nleperetụ anya nke a magburu onwe ya nke ọnọdụ ndị ga-adị mgbe ahụ: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

Ee, a ga-enwogha ụwa ịbụ paradaịs. (Luk 23:43) Cheedị ihe nke ahụ ga-apụta! Ụlọ ọgwụ na ebe nlekọta ndị agadi agaghị abakwa uru. N’ime Paradaịs, ndị mmetụta nile nke ịka nká dọlịsịrị ugbu a ga-agbasi ike ma nwee ahụ ike ọzọ. (Job 33:25; Aịsaịa 35:5, 6) A gaghị enwekwa ụlọ ịkwadebe ozu, ala ili, na olulu ili ọzọ. Site n’Alaeze ya, Jehova ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Aịsaịa 25:8) Ngọzi ndị dị otú ahụ pụrụ n’ezie ịpụta ndụ ọhụrụ nye anyị na ndị nna nna anyị ha.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’elu ụwa ga-abụ ndị Alaeze ahụ ga-achị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya