Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya?
“Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—ABỤ ỌMA 119:97.
1. Olee otu ụzọ ndị na-atụ egwu Chineke si egosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Okwu Chineke dị?
ỌTỤTỤ narị nde ndị ikom na ndị inyom nwere Bible. Ma e nwere ọdịiche dị n’inwe Bible na ịhụ Okwu Chineke n’anya. Mmadụ ọ̀ pụrụ ịzọrọ n’ụzọ ziri ezi na ọ hụrụ Okwu Chineke n’anya ma ọ bụrụ na ọ dịghị agụkarị ya? N’ezie ọ dịghị ma ọlị! N’ụzọ dị iche, ụfọdụ ndị na-ejichaghị Bible kpọrọ ihe na mbụ na-agụzi ya kwa ụbọchị. Ha amụtala ịhụ Okwu Chineke n’anya, dịkwa ka ọbụ abụ ahụ, ha na-emezi ka Okwu Chineke bụrụ ihe ha na-atụgharị n’uche “ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 119:97.
2. Olee otú e si kwagide okwukwe nke otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ọnọdụ ndị tara akpụ?
2 Nasho Dori bụ otu onye nke mụtara ịhụ Okwu Chineke n’anya. O so ndị kwere ekwe ibe ya tachie obi ruo ọtụtụ iri afọ, na-ejere Jehova ozi n’obodo ya bụ́ Albania. N’ihe ka ọtụtụ n’oge ahụ, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu, ndị Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi nwetakwara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible dị ole na ole. Ma, okwukwe Nwanna Dori nọgidere na-esi ike. Ò si aṅaa dị otú ahụ? “Ihe mgbaru ọsọ m” ka ọ sịrị, bụ “ịgụ Bible ruo ma ọ dịkarịa ala otu awa kwa ụbọchị, bụ́ nke m mere ruo ihe dị ka afọ 60 ruo mgbe m na-adịghịzi ahụ ụzọ nke ọma.” Rute na nso nso a, e nweghị Bible n’ozuzu ya n’asụsụ Albanian, ma Nwanna Dori mụtara Grik mgbe ọ bụ nwata, ya mere ọ gụrụ Bible n’asụsụ ahụ. Ịgụchi Bible anya kwagidere Nwanna Dori n’oge ọnwụnwa dị iche iche, ọ pụkwara ịkwagide anyị.
‘Ka Agụụ Okwu Chineke Na-agụsi Gị Ike’
3. Àgwà dị aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị ịzụlite n’ebe Okwu Chineke dị?
3 “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ,” ka Pita onyeozi dere, “ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.” (1 Pita 2:2) Dị nnọọ ka nwa ọhụrụ na-esi achọsi mmiri ara nne ya ike, ndị Kraịst maara mkpa ime mmụọ ha na-achọta obi ụtọ n’ịgụ Okwu Chineke. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ na-adị gị? Ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, obi ekoropụla gị. Gị onwe gị kwa pụrụ ịzụlite agụụ maka Okwu Chineke.
4. Gịnị ka ime ka ọgụgụ Bible bụrụ ihe a na-eme kwa ụbọchị gụnyere?
4 Iji mee otú ahụ, buru ụzọ zụọ onwe gị ime ka ọgụgụ Bible bụrụ ihe ị na-eme mgbe dum, kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na o kwere mee. (Ọrụ 17:11) Ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike itinye otu awa kwa ụbọchị n’ọgụgụ Bible dị ka Nasho Dori mere, ma o yikarịrị ka ị pụrụ iwepụta oge ụfọdụ kwa ụbọchị iji tụlee Okwu Chineke. Ọtụtụ ndị Kraịst na-etetetụ ngwa ngwa karị iji tụgharịa uche n’otu akụkụ Bible. Ọ̀ dị ụzọ ọzọ pụrụ ịka mma isi malite ụbọchị? Ndị ọzọ na-ahọrọ imechi ụbọchị site n’ịgụ Bible tupu ha alakpuo ụra. Ma ndị ọzọ na-agụ Bible n’oge ndị ọzọ ha nwere ohere maka ya. Ihe dị mkpa bụ ịgụchi Bible anya. Mgbe ahụ, jiri obere oge tụgharịa uche n’ihe ị gụrụ. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ nke ndị ritere uru site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke.
Ọbụ Abụ nke Hụrụ Iwu Chineke n’Anya
5, 6. Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ghara ịma aha ya, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere onye dere Abụ Ọma nke 119 site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’ihe o dere?
5 N’ezie, onye dere Abụ Ọma nke 119 nwere ekele miri emi maka Okwu Chineke. Ònye dere abụ ọma ahụ? E kwughị onye dere ya n’ime Bible. Otú ọ dị, site n’ihe a na-ekwu, anyị na-amụta ihe ụfọdụ banyere ya, anyị na-amatakwa na ndụ ya abụghị nke na-enweghị nsogbu. Ụfọdụ ndị ọ maara bụ́ ndị e weere na ha bụ ndị na-efe Jehova esoghị ya nwee ịhụnanya o nwere n’ebe ụkpụrụ Bible dị. Otú o sina dị, ọbụ abụ ahụ ekweghị ka àgwà ha gbochie ya ime ihe ziri ezi. (Abụ Ọma 119:23) Ọ bụrụ na gị na onye na-adịghị akwanyere ụkpụrụ Bible ùgwù bi ma ọ bụ na-arụkọ ọrụ, i nwere ike ịhụ myirịta ndị dị n’etiti ọnọdụ ọbụ abụ ahụ na nke gị.
6 Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke na-asọpụrụ Chineke, ọbụ abụ ahụ abụtụghị onye ezi omume n’anya onwe ya. O kwetara ezughị okè ya n’ezoghị ọnụ. (Abụ Ọma 119:5, 6, 67) Otú ọ dị, o kweghị ka mmehie chịkwaa ya. “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” ka ọ jụrụ. Ọ zara, sị: “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị.” (Abụ Ọma 119:9) Mgbe ahụ, n’imesi ike otú Okwu Chineke si bụrụ ihe mkpali dị ike n’ime ezi ihe, ọbụ abụ ahụ gbakwụnyere, sị: “N’obi m ka m zobeworo okwu ọnụ Gị, ka m wee ghara imehie megide Gị.” (Abụ Ọma 119:11) Ihe mkpali nke pụrụ inyere anyị aka izere imehie megide Chineke dị ike n’ezie!
7. N’ihi gịnị ka ndị na-eto eto karịsịa kwesịrị iji mata mkpa ọ dị ịgụ Bible kwa ụbọchị?
7 Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst ga-eme nke ọma ịtụle ihe ọbụ abụ ahụ kwuru. A na-awakpo ndị Kraịst na-eto eto taa. Ọ ga-amasị Ekwensu nke ukwuu imerụ ọgbọ na-eto eto nke ndị na-efe Jehova. Ihe mgbaru ọsọ Setan bụ ịraba ndị Kraịst na-eto eto n’ọchịchọ anụ ahụ ma mebie iwu Chineke. Ihe nkiri sinima na ihe omume telivishọn na-egosipụtakarị echiche Ekwensu. Ndị a ma ama n’ime ihe omume ndị dị otú ahụ na-eyi ndị na-adọrọ adọrọ na ndị kwesịrị ka e nwee mmasị n’ebe ha nọ; a na-egosi mmekọahụ rụrụ arụ ndị ha na-enwe dị ka ihe kwesịrị ekwesị. Gịnị bụ echiche a na-enye? ‘Ọ dịghị ihe dị njọ na ndị na-alụghị di na nwunye inwe mmekọahụ ma ọ bụrụhaala na ha hụrụ onwe ha n’anya n’ezie.’ N’ụzọ dị mwute, kwa afọ ọtụtụ ndị Kraịst na-eto eto na-adaba n’echiche dị otú ahụ. Okwukwe ụfọdụ ndị na-ekpu dị ka ụgbọ. Ya mere nrụgide ahụ ka na-aga n’ihu! Ma nrụgide ahụ ọ̀ kpụ ọkụ n’ọnụ nke na ọ gaghị ekwe unu bụ́ ndị na-eto eto omume ịnagide ya? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova egosiwo ụzọ ndị Kraịst na-eto eto ga-esi na-emeri ọchịchọ ndị na-adịghị mma. Ha pụrụ iguzogide ngwá agha ọ bụla Ekwensu pụrụ imepụta site ‘n’ilezi anya dị ka Okwu Chineke si dị, na-ezobe okwu ọnụ Chineke n’obi ha.’ Oge ha aṅaa ka ị na-etinye n’ọgụgụ Bible onwe onye chiri anya na ntụgharị uche?
8. Olee otú ihe atụ ndị e depụtara na paragraf a pụrụ isi nyere gị aka ịghọtakwu Iwu Mosis?
8 Onye dere Abụ Ọma nke 119 tipụrụ, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” (Abụ Ọma 119:97) Olee iwu nke ọ na-ekwu banyere ya? Ọ bụ okwu Jehova e kpughere ekpughe, gụnyere usoro Iwu Mosis. Ná ngwuru anya mbụ ha, ụfọdụ pụrụ ileghara usoro Iwu ahụ anya dị ka ihe oge ya gaferela ma na-eche otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi hụ ya n’anya. Otú ọ dị, ka anyị na-atụgharị uche n’akụkụ dịgasị iche nke Iwu Mosis, dị ka ọbụ abụ ahụ mere, anyị pụrụ ịghọta amamihe dị n’ime Iwu ahụ. E wezụga ọtụtụ akụkụ metụtara amụma nke Iwu ahụ, e nwere iwu ndị metụtara idebe ihe ọcha na ihe oriri, bụ́ ndị kwalitere ịdị ọcha na ezi ahụ ike. (Levitikọs 7:23, 24, 26; 11:2-8) Iwu ahụ gbara ume ịkwụwa aka ọtọ n’ihe metụtara achụmnta ego, gbaakwa ụmụ Israel ume igosipụta mmetụta ọmịiko n’ahụ ndị na-efe ofufe ibe ha nọ ná mkpa. (Ọpụpụ 22:26, 27; 23:6; Levitikọs 19:35, 36; Deuterọnọmi 24:17-21) A ga-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Deuterọnọmi 16:19; 19:15) Ka onye dere Abụ Ọma nke 119 nwetara ahụmahụ ná ndụ, obi abụọ adịghị ya na ọ hụrụ otú ihe si gaziere ndị tinyere Iwu Chineke n’ọrụ, mmasị o nwekwara n’ebe ọ dị sikwuru ike. N’otu aka ahụ taa, ka ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ịhụnanya na ekele ha na-enwe maka Okwu Chineke na-amụba.
Nwa Eze nke Nwere Obi Ike Ịpụ Iche
9. Olee àgwà Eze Hezekaịa zụlitere n’ebe Okwu Chineke dị?
9 Ihe ndị e dere n’Abụ Ọma nke 119 kwekọrọ nke ọma n’ihe anyị maara banyere Hezekaịa mgbe ọ ka bụ nwa eze na-eto eto. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible na-atụ aro na ọ bụ Hezekaịa dere abụ ọma ahụ. Ọ bụ ezie na e jighị nke a n’aka, anyị maara na Hezekaịa nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka Okwu Chineke. Site n’ụzọ ndụ ya, o gosipụtara na o ji obi ya kwenye n’okwu ndị dị n’Abụ Ọma 119:97. Bible na-ekwu banyere Hezekaịa, sị: “O wee rapara Jehova n’ahụ, o sighị n’iso Ya wezụga onwe ya, o wee debe ihe nile O nyere n’iwu, bụ́ nke Jehova nyere Mosis n’iwu.”—2 Ndị Eze 18:6.
10. Olee agbamume ihe nlereanya Hezekaịa na-enye ndị Kraịst bụ́ ndị ndị nne na nna na-adịghị asọpụrụ Chineke zụlitere.
10 N’ihe nile a kọrọ banyere ya, Hezekaịa etoliteghị n’ezinụlọ na-asọpụrụ Chineke. Nna ya, bụ́ Eze Ehaz, bụ onye na-ekpere arụsị nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ onye surere ma ọ dịkarịa ala otu n’ime ụmụ ya ndị ikom—nwanne nwoke Hezekaịa—n’ọkụ ná ndụ dị ka àjà nye chi ụgha! (2 Ndị Eze 16:3) N’agbanyeghị ihe nlereanya ọjọọ a, Hezekaịa ‘mere ka ụzọ ya dị ọcha’ pụọ ná mmetụta ndị na-ekpere arụsị site n’ịmara Okwu Chineke.—2 Ihe E Mere 29:2.
11. Ka Hezekaịa nọ na-ekiri ihe na-emenụ, olee otú ihe si gaara nna ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi?
11 Ka Hezekaịa na-etolite, o ji anya ya hụ otú nna ya na-ekpere arụsị si chịkwaa ihe omume Obodo. Ndị iro gbara Juda gburugburu. E nwere Rezin, bụ́ eze Siria, bụ́ onye so Eze Peka nke Israel jikọọ aka n’ịnọchigide Jerusalem. (2 Ndị Eze 16:5, 6) E nwere ndị Edọm na ndị Filistia, bụ́ ndị wakporo Juda n’ụzọ gara nke ọma, ọbụnakwa weghara ụfọdụ obodo Juda. (2 Ihe E Mere 28:16-19) Olee otú Ehaz si mee ihe banyere nsogbu ndị a? Kama ịrịọ Jehova maka enyemaka megide Siria, Ehaz chigharịkwuuru eze Asiria, na-enye ya ọlaedo na ọlaọcha, gụnyere ndị si n’ebe ndebe akụ̀ nke ụlọ nsọ, dị ka ihe iri ngo. Ma nke a ewetaghịrị Juda udo na-adịgide adịgide.—2 Ndị Eze 16:6, 8.
12. Site n’ime gịnị ka Hezekaịa pụrụ izere ihie ụzọ ndị nna ya hiere?
12 N’ikpeazụ, Ehaz nwụrụ, Hezekaịa ghọkwara eze mgbe ọ dị afọ 25. (2 Ihe E Mere 29:1) Ọ ka bụ nwata, ma nke ahụ egbochighị ya ịghọ eze nwere ihe ịga nke ọma. Kama iṅomi omume nke nna ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ rapagidesiri ike n’Iwu Jehova. Nke a gụnyere iwu pụrụ iche e nyere ndị eze: “Mgbe [eze] na-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ya, na ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, site n’akwụkwọ ahụ nke dị n’ihu ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị: ọ ga-adịkwa n’aka ya, ọ ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya: ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a.” (Deuterọnọmi 17:18, 19) Site n’ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, Hezekaịa ga-amụta ịtụ egwu Jehova ma zere ihie ụzọ ahụ nna ya na-adịghị asọpụrụ Chineke hiere.
13. Olee otú onye Kraịst pụrụ isi jide n’aka na n’ụzọ ime mmụọ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma?
13 Ọ bụghị nanị ndị eze Israel ka a gbara ume ichebara Okwu Chineke echiche mgbe nile kama ụmụ Israel nile na-atụ egwu Chineke ga-eme otú ahụ. Abụ Ọma nke mbụ na-akọwa onye ihe na-agara nke ọma n’ezie dị ka onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere onye dị otú ahụ, sị: “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:3) N’ụzọ dị iche, Bible na-ekwu banyere onye na-enweghị okwukwe n’ebe Jehova Chineke nọ, sị: “Ọ bụ nwoke nwere uche abụọ, onye na-adịghị eguzo n’otu ebe n’ụzọ ya nile.” (Jemes 1:8) Anyị nile chọrọ inwe obi ụtọ ma na-enwe ihe ịga nke ọma. Iji nzube na-agụchi Bible anya pụrụ ịtụnye ụtụ n’obi ụtọ anyị.
Okwu Chineke Kwagidere Jisọs
14. Olee otú Jisọs si gosipụta ịhụnanya n’ebe Okwu Chineke dị?
14 N’otu oge, ndị mụrụ Jisọs hụrụ ya ka ọ nọdụrụ n’etiti ndị ozizi n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem. Lee ka ‘ibobo nghọta Ya na ọzịza nile Ya si nwụọ ndị a bụ ọkachamara n’Iwu Chineke n’ahụ’! (Luk 2:46, 47) Nke ahụ bụ mgbe Jisọs dị afọ 12. Ee, ọbụna n’oge ọ bụ nwata, o doro anya na o nwere mmasị n’Okwu Chineke. Mgbe e mesịrị, Jisọs ji Akwụkwọ Nsọ baara Ekwensu mbá, na-asị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:3-10) N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs mere nkwusa nye ndị bi n’obodo ya bụ́ Nazaret, na-eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe.—Luk 4:16-21.
15. Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya mgbe ọ na-eme nkwusa nye ndị ọzọ?
15 Jisọs hotara ihe ugboro ugboro site n’Okwu Chineke iji kwado ozizi ya. ‘Ibubo ozizi Ya nwụrụ ndị na-ege ya ntị n’ahụ.’ (Matiu 7:28) Ọ bụghịkwa ihe ijuanya—ozizi Jisọs sitere n’aka Jehova Chineke n’onwe ya! Jisọs kwuru, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m. Onye na-ekwu site n’onwe ya na-achọ otuto nke aka ya: ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya, onye ahụ bụ onye eziokwu, ajọ omume adịghịkwa n’ime ya.”—Jọn 7:16, 18.
16. Ruo n’ókè ha aṅaa ka Jisọs gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe Okwu Chineke dị?
16 N’adịghị ka onye dere Abụ Ọma nke 119, ‘ajọ omume adịghị’ n’ime Jisọs. O nweghị mmehie, ọ bụ Ọkpara Chineke, nke “wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ.” (Ndị Filipaị 2:8; Ndị Hibru 7:26) Ma, n’agbanyeghị otú o si zuo okè, Jisọs mụrụ ma rubere Iwu Chineke isi. Nke a bụ isi ihe nyere ya ikike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Mgbe Pita ji mma agha mee ihe ịnwa ime ka a ghara ijide Onyenwe ya, Jisọs baara onyeozi ahụ mbá ma jụọ, sị: “Ị̀ na-eche na apụghị m ịrịọ Nna m, Ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karịa legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi? Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?” (Matiu 26:53, 54) Ee, mmezu nke ihe e deworo n’Akwụkwọ Nsọ ka mkpa nye Jisọs karịa ịgbanahụ ọnwụ na-egbu mgbu na nke ihere. Lee ịhụnanya pụtara ìhè maka Okwu Chineke nke a bụ!
Ndị Ọzọ Bụ́ Ndị Na-eṅomi Kraịst
17. Olee otú Okwu Chineke dịruru Pọl onyeozi ná mkpa?
17 Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) Dị ka Onyenwe ya, Pọl zụlitere mmasị maka Akwụkwọ Nsọ. O kwupụtara, sị: “N’ime ime onwe m, ahụrụ m Iwu Chineke n’anya nke ukwuu.” (Ndị Rom 7:22, The Jerusalem Bible) Pọl hotara Okwu Chineke ugboro ugboro. (Ọrụ 13:32-41; 17:2, 3; 28:23) Mgbe o nyere Timoti, bụ́ onyeozi ibe ya ọ hụrụ n’anya, ntụziaka ikpeazụ, Pọl mesiri ike òkè dị mkpa nke Okwu Chineke kwesịrị ikere ná ndụ “onye nke Chineke” ọ bụla kwa ụbọchị.—2 Timoti 3:15-17.
18. Nye otu ihe atụ nke onye kwanyeere Okwu Chineke ùgwù n’oge a.
18 N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge a eṅomiwo ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe Okwu Chineke dị. Ná mmalite narị afọ a, otu nwa okorobịa nwetara Bible site n’aka otu enyi ya. Ọ kọwara mmetụta onyinye a dị oké ọnụ ahịa nwere n’ebe ọ nọ, sị: “Ekpebiri m ime ka ọ bụrụ iwu ná ndụ m ịgụ otu akụkụ Bible kwa ụbọchị.” Nwa okorobịa ahụ bụ Frederick Franz, ịhụnanya o nwere n’ebe Bible dị dugakwara ya n’ịnụ ụtọ ndụ dị ogologo na nke gara nke ọma n’ozi Jehova. E ji mmasị echeta ya maka ikike o nwere ihota isiakwụkwọ nile nke Bible n’isi.
19. Olee otú ụfọdụ si edokwa ọgụgụ Bible dịịrị izu maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?
19 Ndịàmà Jehova ji ịgụchi Bible anya akpọrọ ihe nke ukwuu. Kwa izu, ha na-agụ isiakwụkwọ ụfọdụ nke Bible ná nkwadebe maka otu n’ime nzukọ ndị Kraịst ha, bụ́ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ná nzukọ ahụ, a na-atụle isi ihe ndị dị n’akụkụ Bible ahụ e kenyere ịgụ. Ụfọdụ Ndịàmà ahụtawo ya dị ka ihe kaara ha mma ikewa ọgụgụ Bible dịịrị izu ụzọ asaa dịgasị nta ma na-agụ otu akụkụ kwa ụbọchị. Ka ha na-agụ, ha na-atụgharị uche n’ihe ha na-agụ. Mgbe o kwere mee, ha na-eji akwụkwọ ndị dabeere na Bible emekwu nnyocha.
20. Gịnị dị mkpa iji wepụta oge maka ịgụchi Bible anya?
20 Ọ pụrụ ịdị gị mkpa ‘ịzụchapụta oge’ site n’ihe omume ndị ọzọ iji na-agụchi Bible anya. (Ndị Efesọs 5:16) Otú ọ dị, uru ndị dị na ya ga-akarị nnọọ àjà ọ bụla ị chụrụ maka ya. Ka ị na-azụlite àgwà nke ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịhụnanya i nwere n’ebe Okwu Chineke dị ga-amụba. N’oge na-adịghị anya, a ga-akpali gị isoro ọbụ abụ ahụ kwuo, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Àgwà dị otú ahụ ga-eweta abamuru dị ukwuu ugbu a nakwa n’ọdịnihu, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú onye dere Abụ Ọma nke 119 si gosipụta ịhụnanya miri emi n’ebe Okwu Chineke dị?
◻ Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Jisọs na nke Pọl?
◻ Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’onwe anyị n’ebe Okwu Chineke dị pụrụ isi too etoo?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi ga-agụchi Okwu Chineke anya. Ị̀ na-eme otú ahụ?
[Foto dị na peeji nke 12]
Ọbụna dị ka nwata, Jisọs hụrụ Okwu Chineke n’anya