Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/15 p. 21-24
  • Jehova Maara Anyị Nke Ọma!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Maara Anyị Nke Ọma!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Lee Ka Jehova Si Mara Ihe Nke Ukwuu!
  • A Pụghị Ịgbanarị Mmụọ Chineke
  • Ọchịchịrị Abụghịrị Chineke Nsogbu
  • Lee Ka Echiche Chineke Si Dị Oké Ọnụ Ahịa!
  • Nkwụghachi Ụgwọ nye Ndị Ajọ Omume
  • Kwee Ka Chineke Nyochaa Gị
  • Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • ‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Gwupụta Ala Obi M, Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • E Kere Anyị n’Ụzọ Dị Ebube
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/15 p. 21-24

Jehova Maara Anyị Nke Ọma!

JEHOVA maara anyị n’ezie, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu ya kwesịrị ntụwasị obi. Ezi ndị enyi anyị, ndị ikwu anyị, ọbụna ndị mụrụ anyị, amaghị anyị nke ọma dị ka o si mara anyị. Ee, Chineke maara anyị karịa ka anyị maara onwe anyị!

E gosiụtara nke ọma ihe ọmụma zuru okè Jehova nwere banyere ndị ohu ya n’Abụ Ọma 139. Gịnị ka Devid kwuru n’abụ ọma ahụ? Oleekwa otú ihe ọmụma Chineke nwere banyere anyị kwesịrị isi metụta okwu na ihe omume anyị?

Lee Ka Jehova Si Mara Ihe Nke Ukwuu!

Ebe Chineke bụ Onye Kere anyị, anyị kwesịrị ịtụ anya na ọ ga-enwe ihe ọmụma zuru ezu banyere anyị. (Ọrụ 17:24-28) Otú a, Devid pụrụ ịsị: “Jehova, i gwụpụtawo ala obi m, i wee mara m.” (Abụ Ọma 139:1) Ọmụma Chineke maara Devid yiri nke e nwetara site n’ime nnyocha dị omimi. N’ịbụ onye nwere obi ụtọ ka Jehova nyochaa ya, onye ọbụ abụ ahụ doro onwe ya kpam kpam n’okporo nchịkwa, na nduzi nke Chineke. N’otu aka ahụkwa, Ndịàmà Jehova na-eji ekpere ‘kpọree ụzọ ha nile ruo Jehova ahụ, na-atụkwasị ya obi, na-ejide n’aka na ọ ga-eme ihe kwesịrị ekwesị mgbe nile. (Abụ Ọma 37:5) Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nọ ná ntụkwasị obi n’ime obi anyị n’ihi na anyị na-achọ ibụ ndị amamihe Chineke duziri, anyị na-edokwa onwe anyị n’okpuru nduzi Chineke. (Ilu 3: 19-26) Dị ka Devid, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na Chineke na-ahụ anyị, na-aghọta ihe isi ike anyị nile, na-adịkwa njikere mgbe nile inyere anyị aka.

“Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m,” ka onye ọbụ abụ ahụ kwetara. (Abụ Ọma 139:2a) Chineke maara ihe nile banyere ọrụ nile nke Devid, dị ka ịnọdụ ala ná ngwụsị nke ụbọchị ịrụ ọrụ nakwa ibili ọtọ mgbe o hisịrị ụra n’anyasị. Ọ bụrụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova, jide n’aka na Jehova makwaara anyị nke ọma otú ahụ.

Devid kwetara, sị: “Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya.” (Abụ Ọma 139:2b) Ọ bụ ezie na Chineke bi n’eluigwe n’ebe dị anya nke ukwuu site n’elu ala, ọ maara ihe Devid na-eche n’echiche. (1 Ndị Eze 8:43) Nghọta dị otú ahụ ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya, n’ihi na Jehova ‘na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi.’ (1 Samuel 16: 7; Ilu 21:2) Eziokwu ahụ nke bụ na Chineke na-atụle echiche anyị nile kwesịrị ịkpali anyị iche echiche n’ihe ndị dị ọcha, ndị dị mma, ndị kwesịrị otuto.

Leekwa ka o si kwesị nnọọ ekwesị na anyị ga na-ekwupụta echiche anyị mgbe nile site n’ekpere sitere n’ala ala obi ka anyị wee na-enweta nduzi Chineke na “udo nke Chineke”!—Ndị Filipaị 4:6-9.

Onye ọbụ abụ kwukwara, sị: “Okporo ụzọ m na ndina ala m ka ị fụchaworo dị ka ọka, ọ bụkwa ụzọ m nile ka ị mawooro nke ọma.” (Abụ Ọma 139: 3) Ịfụcha okporo ụzọ nile nke Devid site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ nakwa ndina ala ya mgbe ọ na-ezuru ike pụtara na Jehova na-enyocha ihe ọ bụla onye ọbụ abụ ahụ mere. Onye ahụ Kasị Elu na-atụ ihe omume nile nke Devid n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji mara kpọmkwem ihe bụ ọnọdụ obi ya. Chineke nwere ihe ọmuma zuru ezu banyere ụzọ nile nke Devid, ụzọ ndị ọ gbasoro ná ndụ. Mgbe Nna anyị nke eluigwe na-enyochakwa anyị n’ụzọ dị otú ahụ, ya bụrụkwa na ọ ga-ahụ na anyị na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwesị obi, na-anọgidekwa “n’ụzọ ezi omume” nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.—Ilu 12:28.

Ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe ọ ga-ekwu nke a pụrụ izonarị Chineke, Devid sịrị: “N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, lee, Jehova, ị machasịwo ya.” (Abụ Ọma 139:4) Ọ bụrụ na anyị nọ n’oké mmekpaahụ nke na anyị amakwaghị ihe anyị ga-ekwu n’ekpere, mmụọ Jehova “[na-ewere] ịsụ ude a na-apughị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ.” (Ndị Rom 8:26) Ná mkparịta ụka anyị nile, Chineke na-amata ihe ndị dị n’ọnụ ọnụ ire anyị nke anyị na-ekwughị ekwu, n’ihi na ọ maara ihe bụ ezi mmetụta anyị na-enwe. Ọ bụrụkwa na anyị nwere ịhụnanya nke sitere ‘n’okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya,’ anyị agaghị anwa anwa iji “okwu ụtọ” na eduhie ndị ọzọ.”—1 Timoti 1:5; Ndị Rom 16:17, 18.

Devid kwukwara, sị “N’azụ na n’ihu ka ị nọchigideworo m, wee tụkwasị ọbọ aka gị n’ahụ m.” (Abụ Ọma 139:5) Ihe nke a pụtara bụ na Jehova nọchibidoro Devid dị ka obodo a gbara gburugburu n’agha. Ọ pụtara ìhè na onye ọbụ abụ ahụ maara na a kpaara ihe ndị ọ pụrụ ime n’oge ndụ ya ókè. Ọ makwaara na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme ya ịgbanarị anya nke Chineke na aka ya, ma ọ bụ nchịkwa ya. N’ezie, ọ dịghị mgbe Devid nwara ime nzopu dị otú ahụ, anyị adịghị anwakwa ime otú ahụ. Ma, ka anyị na-eduzi onwe anyị mgbe nile, na-amara na aka Jehova na-adịkwasị anyị dị ka Ndịàmà ya.

Ụzọ Chineke si mara ya nke ọma dị ebube n’anya Devid. Otú a, o kwupụtara, sị: “Ọmụma ihe dị otú a dịkarịrị m ebube; ọ dị ka elu, apụghị m iru ya.” (Abụ Ọma 139:6) Chineke maara anyị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu nke ọma nke na anyị apụghị ịchọpụta ya, n’agbanyeghi ahụmahụ na ọzụzụ anyị nwere. Ebe ọ karịrị nghọta nke mmadụ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova maara ihe kachasị mma maka anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka otu ihe, azịza ya ewee bụrụkwa ee e, ka anyị doo onwe anyị n’okpuru uche Chineke. Dị ka Jọn onyeozi dere: “Ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

A Pụghị Ịgbanarị Mmụọ Chineke

Ọ bụghị nanị na Jehova na-aza ekpere nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, kama mmụọ ya na-arụkwa ọrụ n’ebe ha nọ, na-enyekwara ha aka ime ihe ọ na-achọ. N’eziokwu, Devid jụrụ, sị: “Olee ebe m ga-alanarị mmụọ gị? Ma ọ bụ olee ebe m ga-esi n’ihu gị gbalaga?” (Abụ Ọma 139:7) Onye ọbụ abụ ahụ maara na ya apụghị ịgbanarị mmụọ Jehova, ma ọ bụ ike ọrụ ya, bụ́ nke pụrụ iru ọbụna akụkụ eluigwe na ala kachasị dị anya. Ọ dịghịkwa onye pụrụ ịgbapụ n’ihu Chineke, ya bụ, pụọ n’ebe ọ na-apụghị ihụ ya anya. N’eziokwu, ‘Jona biliri wee si n’ihu Jehova gbalaga na Tashish,’ ma onye amụma ahụ apụghị ịgbanarị azụ ukwu ahụ nke Chineke zipụrụ ilo ya ma ọ bụ ịza ajụjụ banyere ọrụ ahụ Chineke kenyere ya ịrụ. (Jona 1:3, 17; 2:10–3:4) Ya mere ka anyị dabere ná mmụọ Jehova inyere anyị aka ịrụzu ọrụ ndị Chineke nyere anyị ịrụ.—Zekaraịa 4:6.

Ebe Devid maara na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ịgbanarị Chineke, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na arịgoo m n’eluigwe, n’ebe ahụ ka ị nọ: ọ bụrụ na agbasaa m ute m n’ala mmụọ lee, ị nọ n’ebe ahụ.” (Abụ Ọma 139:8) N’oge onye ọbụ abụ ahụ, ‘ịrịgo n’eluigwe’ pụtara ịrịgo n’ugwu ndị dị oké elu, ndị igwe ojii na-ekpuchitekrị ọnụ ọnụ ha. Ma, ọ bụrụ na anyị nọ n’ọnụ ọnụ ugwu kachasị elu, anyị agaghị anọ n’ebe mmụọ Chineke na-apụghị iru anyị. Ọzọkwa, anyị apụghị ịnọ n’ebe anya ya na-agaghị eru ma ọ bụrụ na anyị agbasaa ute anyị na Sheol, nke na-eme ihe atụ nke akụkụ ụwa kachasị dị ala .—Tụlee Deuterọnọmi 30:11-14; Emọs 9:2, 3.

“Ọ bụrụ na achịrị m nku nke ụtụtụ, biri n’akụkụ dịkarịsịrị anya nke oké osimiri;” ka Devid sịrị, “Ọbụna n’ebe ahụ ka aka gị ga-eduru m, aka nri gị ga-ejidekwa m.” (Abụ Ọma 139:9, 10) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ “nku nke ụtụtụ”? Okwu ndị a na-akọwa n’ụzọ abụ otú ìhè nke isi ụtụtụ, dị ka à ga-asị na o nwere nku, na-esi agbasa ngwa ngawa site n’ọwụwa anyanwụ gaa n’ọdịda anyanwụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na Devid pụrụ ịchịrị nku nke ụtụtụ wee feruo ebe dịkarịsịrị anya n’oké osimiri ma ọ bụ n’agwaetiti nile nke ebe ọdịda anyanwụ? Ọ ka ga-anọkwa n’okpuru aka Chineke, ma ọ bụ nchịkwa na nduzi ya. Site ná mmụọ Ya, Jehova ga-anọ n’ebe ahụ iji obi ebere na-eduzi onye ọbụ abụ ahụ.—Abụ Ọma 51:11.

Ọchịchịrị Abụghịrị Chineke Nsogbu

Ma ịdị anya ma ọchịchịrị adịghị nke pụrụ ido mmadụ n’ebe Chineke na-apụghị irute ya. Ya mere Devid kwukwara sị: “M wee sị, N’ezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m; ma abalị ghọrọ ìhè gburugburu m. Ọbụna ọchịchịrị adịghị agbachiri gị; ma abalị na-enye ìhè dị ka ehihie: dị ka ọchịchịrị si dị, otú a ka ìhè dị ka ehihie: dị ka ọchịchịrị si dị, otú a ka ìhè dị n’anya gị.” (Abụ Ọma 139:11, 12) Ọchịchịrị zuru ezu pụrụ ịgbachibido mmadụ, dị ka à ga-asị na ọ na-ejide onye ahụ. Ma n’ebe Jehova nọ, ọ ga-abụ onye a na-ahụ anya dị ka à ga-asị na o guzo n’etiti ehihie. Ọ dịghị onye pụrụ izonarị Chineke mmehie ọ bụla e mere n’ọchịchịrị.—Aịsaịa 29:15, 16.

Ikpuchi ihe adịghị eme ka Onye Okike anyị ghara ịhụ ya. N’ihe banyere nke a Devid kwuru, sị: “N’ihi na gị onwe gị [mepụtara, NW] akụrụ m abụọ: ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa ákwà. M ga ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ; oké ọrụ ka ọrụ gị nile di; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma. Ọkpụkpụ m ezopụghị n’anya gị, mgbe e mere m na nzuzuo, mgbe a dụrụ m nke ọma, dị ka onyeọkà ọdụdụ ákwà si adụ, n’ebe nile dị ala nke ụwa. Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ, nke a kpụrụ kwa ụbọchị, mgbe ọ dịghị otu ihe [akụkụ ahụ a ma ama] dị n’ime ha.” —Abụ Ọma 139:13-16.

Jehova Chineke, onye maara mmetụta anyị kasị dị omimi, mepụtara akụrụ Devid. Ebe ọ dịrị n’ebe dị omimi n’ime ahụ, akụrụ so n’akụkụ ahụ ndị a kasị kpuchie ekpuchie, ndị sikwara ike irute n’ebe ha dị, ma Chineke pụrụ ịhụ ha. Ọ pụrụ ileba anya ọbuna n’ime afọ nke onye bụ nne, ma ọ bụ n’ime akpa nwa. Ee, Jehova pụrụ ileba anya n’ime nwa ahụ ka na-etolite n’ime akpa nwa! Nanị iche echiche banyere ụzọ dị ebube e si mee ya n’ime akpa nwa kpaliri Devid ito Onye Mere ya. Ihe àmà gosiri na onye ọbụ abụ ahụ zoro aka n’ebe akpa nwa nke onye bụ nne dị dị ka “ebe nile dị ala nke ụwa.” N’ebe ahụ, n’ịbụ nke anya mmadụ na-apụghị ịhụ, na nke Chineke pụrụ ịhụ, a na-akpakọta ọkpụkụ, akwara, uru ahụ, na okpo ọbara nile.

Tupu akụkụ ahụ dị iche iche nke Devid aghọọ ihe a pụrụ ịmata amata n’ime akpa nwa nke nne ya, Chineke maara otú ọ ga-adị. N’ihi gịnị? N’ihi na ntolite nke nwa ahụ e bu n’afọ na-agbaso otu ụkpụrụ doro anya, dị ka à ga-asị na ọ na-erube isi ná ntuziaka ndị e deturu n’akwụkwọ. Lee ka nke a si egosi amamihe Jehova na ike o nwere ịhụ ọbụna ihe ndị e kpuchiri ekpuchi! O kwesịkwara ime ka anyị ghọta na Chineke kere agbụrụ mmadụ, na ọ bụkwa ya ka usoro dị ebube nke ịmụpụta nwa sitere n’aka, bụ́ nke meworo ka a mụpụta anyị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu.

Lee Ka Echiche Chineke Si Dị Oké Ọnụ Ahịa!

Iche echiche banyere ntolite nke nwa ọhụrụ n’ime akpa nwa mere ka Devid tụgharịa uche n’amamihe Chineke. Otú a, onye ọbụ abụ ahụ tiri mkpu, sị: “Lee ka echiche gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne!” (Abụ Ọma 139:17) Devid jiri echiche nile nke Jehova Chineke kpọrọ ihe, ha hikwara nne nke ukwuu nke na o metụtara ya nke ukwuu bụ́ “ọnụ ọgụgụ nile ha.” Ọ bụrụ na echiche nile nke Chineke dị oké ọnụ ahịa n’anya anyị, anyị ga-abụ ndị na-amụsi Akwụkwọ nsọ ike. (1 Timoti 4:15, 16) Echiche ya ndị e dekọrọ edekọ “[bara] uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè, ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

N’ihe banyere echiche nile nke Jehova, Devid sịrị: “Ọ bụrụ na agụọ m ha ọnụ, ha bara ụba karịa ájá: mgbe m tetaworo, mụ na gị na-anọgide.” (Abụ Ọma 139:18) Ebe ọ bụ na echiche nile nke Chineke hiri nne karịa ájá, ọ bụrụ na Devid amalite ịgụ ha ọnụ n’isi ụtụtụ, ọ gaghị agụcha ha ruokwa abalị. Mgbe o tetara n’ụtụtụ, ya na Jehova ka ga-anọgidekwa. Ya bụ, ọ ka ga-anọkwa na-agụ echiche nile nke Chineke. N’eziokwu, ebe ọ bụ na nduzi Jehova dị anyị mkpa, iji ekpere na-atụgharị uche n’echiche na nzube ya nile kwesịrị ịdị n’uche anyị dị ka ihe ikpeazụ n’anyasị nakwa ihe mbụ n’ụtụtụ.—Abụ Ọma 25:8-10.

Nkwụghachi Ụgwọ nye Ndị Ajọ Omume

Ebe ọ bụ na Chineke na-enye nduzi amamine dị na ya, gịnị bụ mmetụta Devid banyere ndị ahụ na-ajụ nduzi nke Chineke? O kpere ekpere, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na i gbuo onye na-emebi iwu, Chineke: [mgbe ahụ, ọbụna ndị ikpe ọbara mara ga-esi n’ebe m nọ pụọ, bụ́ ndị na-ekwu okwu banyere gị dị ka echiche nke onwe ha si dị; ha ebuliwo aha gị ime ihe efu—bụ́ ndị iro gị, NW].” (Abụ Ọma 139:19, 20) Devid anwaghị igbu ndị mmebi iwu ahụ kama o kpere ekpere ka ha nata nkwụghachi ụgwọ n’aka Jehova. Anyị kwesịrị inwe otu ụdị omume ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ikpe ekpere ka anyị nwee anya ike iji kwuo okwu Chineke mgbe ndị iro na-emegide anyị. (Ọrụ 4:18-31) Ma anyị adịghị achọ igbu ndị iro anyị, n’ihi na anyị maara na Jehova ekwuwo, sị: “Mụ onwe m nwe ọbọ, mụ onwe m ga-enyeghachi.”—Ndị Hibru 10:30; Deuterọnọmi 32:35

Ọ bụrụ na Chineke egbuo ndị na-emebi iwu, ndị dị otú ahụ ikpe ọbara mara ga-apụ site n’ebe Devid nọ. Ha nwere ihe ndekọ nke ikpe ọmụma n’iwufu ọbara, ha kwukwara okwu banyere Jehova dị ka echiche nke onwe ha si dị, ọ bụghị n’ụzọ kwekọrọ n’echiche ya nile. Ọzọkwa, ha kwesịrị ọnwụ n’ihi iwetara aha Chineke nkọcha site n’ibuli ya ime ihe efu, nke ha pụrụ imeworị site n’iji ya na-eme ihe mgbe ha nọ na-akwalite atụmatụ ọjọọ ha nile. (Ọpụpụ 20:7) Ka ikpe mmehie ndị dị otú ahụ gharakwa ịma anyị!

N’ihi na ikpe mwufu ọbara mara ndị mmebi iwu, tinyekwara nke iweta nkọcha n’aha Chineke, Devid kwupụtara, sị: “Ọ́ bụghị ndị na-akpọ gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ́ bụghịkwa ndị na-ebili imegide gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” (Abụ Ọma 139:21, 22) Devid sọrọ ndị ahụ oyi n’ihi na ha kpọrọ Jehova asị nke ukwuu, na-ebilikwa imegide Ya. Ha bụ ndị iro nke onye ọbụ abụ ahụ n’ihi na ọ kpọrọ ajọ omume ha asị, asọpụrụghị Chineke ha, na nnupụisi ha megide Onye ahụ Kasị Elu.

Kwee Ka Chineke Nyochaa Gị

Devid achọghị ịdị ka ndị ajọ omume, ma ọ maara na ya ekwesịghị ịkpọ ha asị. Ya mere ọ rịọrọ, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebị.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, anyị kwesịrị ịchọ ka Chineke nyochaa obi anyị, wee chọpụta ma ọ̀ dị mkpali ọ bụla na-ezighị ezi dị n’ime anyị. (1 Ihe Emere 28:9) Anyị kwesịrị ịgwa Jehova ka o nyochaa anyi, na-amata echiche ndị na-enye anyị nsogbu, wee na-achọpụta ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-akpata ihe mgbu nke dị n’ime anyị. Ọ bụrụ na oké nchekasị abịakwasị anyị n’ihi mmehie anyị ma ọ bụ na ọ dị ihe mgbu dị n’ime anyị ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi dị ná mkpali ndị anyị na-enwe, ka anyị jiri obi umeala kpee ekpere, dookwa onwe anyị kpam kpam n’okpuru nduzi nke mmụọ Chineke na ndụmọdụ nke Okwu ya. (Abụ Ọma 40:11-13) Site n’ụzọ dị otú a, Enyi anyị kasị mma bụ́ Jehova pụrụ iduru anyị gaa n’ụzọ nke mgbe ebighị ebe, na-enyere anyị aka ịgbaso ụzọ ezi omume nke na-enduje ná ndụ ebighị ebi.

Abụ Ọma 139 si otú a na-enye anyị ezi agbamume. Ọ na-egosi na, ebe ọ na-adịghị ihe na-agbanarị anya nke Nna anyị nke eluịgwe, na ọ pụrụ inyere anyị aka n’oge mkpa ọ bụla. (Ndị Hibru 4:16) Karịsịa, n’ihi na Jehova maara anyị karịa ka anyị maara onwe anyị, anyị nọ ná nchebe ná nlekọta ịhụnanya ya. (Deuterọnọmi 33:27) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala rịọ ya ka o nyochaa anyị, meekwa ka anyị mara ịda mbà ọ bụla anyị nwere, anyị pụrụ iji enyemaka ya dozie ihe ndị metụtara anyị. Ya mere, o doro anya na ọmụma Chineke maara anyị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu kwesịrị imetụta ndụ anyị n’ụzọ dị mma. O kwesịrị ịkpali anyị ịbụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ezi ofufu, jirikwa obi umeala na-eje ije n’ihu Jehova, bú onye maara anyị nke ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya