Ndụ—Onyinye Sitere n’Aka Chineke
IRI hour abụọ na anọ kwa ụbọchị, obi anyị na-agbọpụta ọbara dị oké ọnụ ahịa gaa n’akụkụ nile nke ahụ anyị. Anyị hie ụra, akpa ume anyị na-anọgidekwa na-adọtị ma na-apịachi. Anyị rie nri, nri ahụ na-agbarikwa n’onwe ya. Ihe ndị a nile na-ewere ọnọdụ kwa ụbọchị, n’enweghị mgbalị ọ bụla anyị ma ụma na-eme maka ya. Usoro ime ihe ndị a nke dị omimi ma dị ebube, nke a na-ewerekarị dị ka ihe efu, so n’akụkụ nke onyinye ahụ anyị na-akpọ ndụ. N’otu echiche, ọ bụ onyinye nke a pụrụ ịkpọ ọrụ ebube.
Tụlee usoro nke ịtụrụ ime na ọmụmụ nke mmadụ. Ọ bụ ezie na ahụ na-ajụkarị ịnabata uru ahụ nke ọ na-amaghị, akpa nwa na-akpa ókè maka àkwá na-aghọ nwa. Kama ịjụ ịnabata nwa e bu n’afọ na-eto eto dị ka uru ahụ ọ na-amaghị, ọ na-azụ ma na-echebe ya ruo mgbe ọ dị njikere ịpụta dị ka nwa ọhụrụ. E wezụga na akpa nwa enweghị ikike ịkpa ókè nke a nye ụkpụrụ nke ịjụ ịnabata uru ahụ nke ọ na-amaghị, ọmụmụ nwa agaghị ekwe omume.
Ọbụna otú ahụ, ndụ nke nwa a mụrụ ọhụrụ ga-adị mkpirikpi ma ọ bụghị n’ihi ntolite na-ewere ọnọdụ n’akpa nwa mgbe nwa e bu n’afọ dị nanị ihe dị ka ọnwa anọ. Mgbe ahụ, ọ na-amalite ịmị isi aka ya, na-emegharị uru ahụ nke ga-emesị nyere ya aka ịmị ara nne ya. Nke a bụkwa otu n’ime ọtụtụ okwu ndị metụtara ọnwụ na ndụ nke a na-edozi ogologo oge tupu a mụpụta nwa.
Mgbe nwa e bu n’afọ nọ na-akpa nwa, e nwere oghere na-adị n’ime akụkụ obi ya. Otú ọ dị, oghere nke a na-eji aka ya emechi mgbe a mụpụtara nwa. Tụkwasị na nke ahụ, otu nnukwu ihe na-ebugharị ọbara nke na-agafe akpa ume mgbe nwa e bu n’afọ nọ n’akpa nwa na-eji aka ya akpachi n’oge a mụpụtara nwa; ugbu a, ọbara na-aga n’akpa ume, bụ́ ebe ọ pụrụ inweta ikuku ndụ ka nwa ọhụrụ na-amalite iku ume.
Ihe ndị a nile ka bụ nanị mmalite. N’oge nile a dị ndụ, ọtụtụ usoro ndị a haziri nke ọma (ndị dị ka usoro iku ume, nrugharị ọbara, akwara, na mmiri ọgwụ) ga-arụ ma hazie ọrụ ha nke ọma n’ụzọ karịrị nghọta nke mmadụ—ha nile maka iji mee ka a nọgide na-adị ndụ. Ka a sịkwa ihe mere otu onye na-ede akwụkwọ n’oge ochie ji kwuo banyere Chineke, sị: “M ga-ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”—Abụ Ọma 139:14.
N’ụzọ doro anya, onye ahụ dere okwu ndị ahụ mara mma ekwenyeghị na ndụ bụ nanị ihe si ná ndapụta ma ọ bụ ihe mberede efu, nke evolushọn, pụta. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, anyị agaghị enwe ezi ibu ọrụ ọ bụla banyere ụzọ anyị kwesịrị isi bie ndụ anyị. Otú ọ dị, ihe ndị mejupụtara ndụ na-egosipụta nkà n’ụzọ doro anya, nkà chọkwara ome nkà. Bible na-esetịpụ ụkpụrụ nke a: ‘Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya; ma onye rụrụ ihe nile bụ Chineke.’ (Ndị Hibru 3:4) Ya mere, ọ bụ ihe dị mkpa ‘ịmara na Jehova, ya onwe ya bụ Chineke: ya nwe anyị.’ (Abụ Ọma 100:3) Ee, ndụ karịrị ihe mberede obi ọma; ọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke n’onwe ya.—Abụọ Ọma 36:9.
Ebe ọ dị otú ahụ, ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe Onye ahụ na-enye ndụ nọ? Olee ụzọ ọ tụrụ anya ka anyị si jiri ndụ anyị na-eme ihe? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu na-esonụ.