Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/15 p. 10-15
  • Mgbukepụ nke Ìhè n’Oge Ndị Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbukepụ nke Ìhè n’Oge Ndị Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ìhè Banyere Ọrụ Ha nke Ime Nkwusa
  • Ibi Úgwù Adịghịzi
  • Ìhè n’Ime Oziọma Ndị Ahụ
  • Mgbukepụ nke Ìhè n’Akwụkwọ Ozi Ndị Pọl Dere
  • Mgbukepụ nke Ìhè—Ndị Ukwu na Ndị Nta Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Mgbukepụ nke Ìhè—Ndị Ukwu na Ndị Nta Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Ìhè ahụ Abịawo n’Ụwa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gbasoo Ìhè Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/15 p. 10-15

Mgbukepụ nke Ìhè n’Oge Ndị Ozi

“A ghaworo onye ezi omume ìhè dị ka mkpụrụ, a ghawokwara ndị ziri ezi n’obi ọṅụ.”—ABỤ ỌMA 97:11.

1. Olee otú Ndịàmà Jehova taa si yie ndị Kraịst oge mbụ?

LEE nnọọ ókè dị ukwuu anyị na-enwe mmasị n’okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 97:11, dị ka ezi ndị Kraịst! ‘A ghaworo anyị ìhè dị ka mkpụrụ’ site na mgbe ruo na mgbe. N’ezie, ụfọdụ n’ime anyị ahụwo mgbukepụ ìhè nke Jehova ruo ọtụtụ iri afọ. Ihe a nile na-echetara anyị Ilu 4:18, bụ́ nke na-agụ, sị: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” Ná mmasị anyị nwere maka Akwụkwọ Nsọ kama n’ozizi e nyere n’aka idebe, anyị bụ́ Ndịàmà Jehova yiri ndị Kraịst mbụ. A pụrụ ịhụ omume ha n’ụzọ pụtara ìhè site n’akwụkwọ akụkọ ihe mere eme nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na site n’akwụkwọ ozi ya dị iche iche, bụ́ ndị e dere n’okpuru ike mmụọ nsọ Chineke.

2. Gịnị so ná mgbukepụ ìhè ndị mbụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs nwetara?

2 N’ime mgbukepụ ìhè mbụ nke ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst natara bụ banyere Mesaịa. Andru gwara nwanne ya nwoke bụ́ Saịmọn Pita, sị: “Anyị ahụwo Mesaịa anyị.” (Jọn 1:41) Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, Nna nke bi n’eluigwe nyere Pita onyeozi ike ịgba àmà banyere nke ahụ mgbe ọ gwara Jisọs Kraịst, sị: “Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:16, 17; Jọn 6:68, 69.

Ìhè Banyere Ọrụ Ha nke Ime Nkwusa

3, 4. Mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, ihe ọmụma dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere ọrụ ha ga-arụ n’ọdịnihu?

3 Mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs Kraịst gbukepụrụ ìhè banyere ibu ọrụ na-adịkwasị ndị nile na-eso ụzọ ya. O yikarịsịrị ka ọ bụ 500 ndị ahụ na-eso ụzọ gbakọtara na Galili ka ọ gwara, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ Onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20; 1 Ndị Kọrint 15:6) Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị nile na-eso ụzọ Kraịst gaje ịbụ ndị na-eme nkwusa, ọrụ nkwusa ha kwa agajeghị ịbụ nke ga-ejedebe n’ebe “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel” nọ. (Matiu 10:6) Ha agajeghịkwa ime baptism Jọn ná ngosipụta nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. Kama nke ahụ, ha gaje ime ndị mmadụ baptism “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.”

4 Mgbe na-adịghị anya tupu Jisọs arịgoro n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya 11 kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị̀ na-enyeghachi Israel alaeze?” Kama ịza ajụjụ ahụ, Jisọs nyekwuru ntụziaka banyere ọrụ nkwusa ha, na-ekwu, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Tupu mgbe ahụ, ha abụwo ndị àmà nye nanị Jehova, ma ugbu a ha ga-abụkwa ndị àmà Kraịst.—Ọrụ 1:6-8.

5, 6. Mgbukepụ ìhè ndị dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nwetara na Pentikọst?

5 Nanị ụbọchị iri nke a gasịrị, lee ụdị mgbukepụ ìhè ndị na-eso ụzọ Jisọs natara! N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., na nke mbụ ya, ha ghọtara ọdịmkpa nke Joel 2:28, 29: “M [Jehova] ga-awụsa Mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ndị okenye unu ga-arọ nrọ, ụmụ okorobịa unu ga-ahụ ọhụụ: ee, ọbụna n’ahụ ndị ohu ndị ikom na n’ahụ ndị inyom na-eje ozi ka M ga-awụsa Mmụọ m na mgbe ahụ.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs hụrụ mmụọ nsọ, n’ụdị ire dị ka nke ọkụ, ka ọ na-anọkwasị n’isi ha nile—ihe dị ka 120 ndị ikom na ndị inyom—gbakọrọ na Jerusalem.—Ọrụ 1:12-15; 2:1-4.

6 N’ụbọchị Pentikọst kwa, ndị ahụ na-eso ụzọ ghọtara ná nke mbụ ya na okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 16:10 bụ banyere Jisọs Kraịst ahụ e si n’ọnwụ kpọlite. Onye ọbụ abụ ahụ ekwuworị, sị: “Ị gaghị ahapụrụ [Sheol, NW] mkpụrụ obi m; Ị gaghị enye onye ebere Gị ka ọ hụ mbibi.” Ndị ahụ na-eso ụzọ ghọtara na okwu ndị ahụ apụghị ịbụ banyere Eze Devid, n’ihi na ili ya dị n’etiti ha ruo ụbọchị ahụ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ihe dị ka 3,000 n’ime ndị ahụ nụrụ ka a kọwara ìhè ọhụrụ nke a bụ ndị ihe doro anya nke ukwuu nke na e mere ha baptism n’ụbọchị ahụ!—Ọrụ 2:14-41.

7. Ìhè dị aṅaa nke na-enwu nke ọma ka Pita onyeozi nwetara n’oge o letara ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs?

7 Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Israel ghọtara ihe Chineke kwuru banyere ha, sị: “Nanị unu ka m maworo n’etiti agbụrụ nile nke ụwa.” (Emọs 3:2) Ya mere ọ bụ n’ezie mgbukepụ ìhè na-enwu nke ọma ka Pita onyeozi na ndị ya na ha so gaa n’ụlọ onye ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs natara mgbe mmụọ nsọ dakwasịrị ndị Jentaịl kwere ekwe a na-ebighị úgwù ná nke mbụ ya. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na nke a bụ nanị oge e nyere mmụọ nsọ tupu baptism. Ma ọ dị mkpa na ọ dị otú ahụ. Ma ọ bụghị otú ahụ, Pita agaraghị amata na ndị Jentaịl ndị a a na-ebighị úgwù ruru eru maka baptism. N’ịghọta ọdịmkpa nke ihe omume a n’ụzọ zuru ezu, Pita jụrụ, sị: “Ọ̀ dị onye pụrụ ịnapụ mmiri, ka a ghara ime ndị a [ndị Jentaịl] baptism, ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ebe ahụ pụrụ iru eru ịjụ, n’ihi ya kwa baptism nke ndị Jentaịl ndị a weere ọnọdụ.—Ọrụ 10:44-48; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 8:14-17.

Ibi Úgwù Adịghịzi

8. N’ihi gịnị ka o ji siere ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ ike ịhapụ ibi úgwù?

8 Ìhè ọzọ na-enwu nke ọma nke eziokwu pụtara n’ihe banyere okwu ibi úgwù. Ihe omume nke ibi úgwù nwere mmalite ya na 1919 T.O.A. mgbe Jehova na Abraham gbara ndụ. Mgbe ahụ Chineke nyere Abraham iwu na ya na ndị ikom nile ọzọ nke ezinụlọ ya gaje ibi úgwù. (Jenesis 17:9-14, 23-27) Otú a ibi úgwù ghọrọ akara e ji amata ụmụ Abraham. Leekwa ka ha si eji ihe omume nke a anyà isi! Dị ka ihe si na ya pụta, ‘ebighị úgwù’ bịara ghọọ okwu nleda anya. (Aịsaịa 52:1; 1 Samuel 17:26, 27) Ọ dị mfe ịhụ ihe mere ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị Juu ji chọọ ka ha jigide ihe nnọchianya nke a. Ụfọdụ n’ime ha sooro Pọl na Banabas kparịta nnukwu ụka banyere okwu nke a. Iji dozie ya, Pọl na ndị ọzọ gara Jerusalem ịkpọtụrụ òtù na-achị isi nke ndị Kraịst.—Ọrụ 15:1, 2.

9. Mgbukepụ ìhè ndị dị aṅaa ka e kpugheere òtù na-achị isi nke oge mbụ, dị ka e dekọrọ ya n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 15?

9 N’oge a, ọ bụghị site n’ọrụ ebube doro anya ka ndị Kraịst oge mbụ ahụ natara ìhè ahụ na ibi úgwù abụghịzi ihe a chọrọ n’aka ndị ohu Jehova. Kama nke ahụ, ha natara ìhè ahụ e mere ka ọ baa ụba site n’inyocha Akwụkwọ Nsọ, na-adabere n’ebe mmụọ nsọ dị maka nduzi, na ịnụrụ ahụmahụ dị iche iche nke Pita na Pọl banyere ntọghata nke ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. (Ọrụ 15:6-21) E kwupụtara mkpebi ahụ n’otu akwụkwọ ozi nke na-agụ n’otu akụkụ, sị: “Ọ dị Mmụọ Nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karị ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:28, 29) E si otú a tọhapụ ndị Kraịst oge mbụ site n’iwu nke ibi úgwù na site n’ihe ndị ọzọ a chọrọ n’Iwu Mosis. N’ihi ya, Pọl pụrụ ịgwa ndị Kraịst bụ́ ndị Galetia, sị: “Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwee onwe anyị.”—Ndị Galetia 5:1.

Ìhè n’Ime Oziọma Ndị Ahụ

10. Gịnị bụ ụfọdụ mgbukepụ nke ìhè e kpughere n’Oziọma Matiu?

10 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Oziọma Matiu, nke e dere n’ihe dị ka 41 O.A., nwere ọtụtụ mgbukepụ nke ìhè maka abamuru nke ndị na-agụ ya. Ole na ole n’ime ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ma e ji ha tụnyere ndị ọzọ nụrụ n’onwe ha ka Jisọs na-akọwapụta ozizi ya dị iche iche. N’ikwu ya kpọmkwem, Oziọma Matiu mesiri okwu ike na isiokwu nke nkwusa Jisọs bụ Alaeze ahụ. Leekwa ụzọ Jisọs si mesie ike ọdịmkpa nke inwe nzube ziri ezi! Lee mgbukepụ nke ìhè dị n’Ozizi Elu Ugwu ya, n’ilu ya dị iche iche (dị ka ndị ahụ e dekọrọ n’isi nke 13), na n’amụma ukwu ya dị n’isi nke 24 na 25! E mere ka ndị Kraịst oge mbụ mara banyere ihe a nile n’ihe ndekọ nke Oziọma Matiu e dere nanị n’ihe dị ka afọ asatọ mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị.

11. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe ndị dị n’Oziọma Luk na Mak?

11 Ihe dị ka afọ 15 mgbe e mesịrị, Luk dere Oziọma ya. Ọ bụ ezie na ihe dị ukwuu n’ime ya yiri ihe ndekọ nke Matiu, 59 pasent bụ ihe ntụkwasị. Luk dekọrọ ọrụ ebube isii Jisọs rụrụ na ihe jiri okpukpu abụọ karịa nke ahụ n’ilu Ya dị iche iche nke ndị ọzọ dere Oziọma na-akpọtụghị aha. N’ụzọ doro anya nanị afọ ole na ole mgbe e mesịrị, Mak dere Oziọma ya na-ekwusi okwu ike banyere Jisọs Kraịst dị ka nwoke na-arụsi ọrụ ike, onye na-arụ ọrụ ebube. Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka Mak kọọ ihe omume ndị Matiu na Luk buworo ụzọ kọọ, o dekọrọ otu ilu ha na-edekọghị. N’ilu ahụ, Jisọs jiri Alaeze Chineke tụnyere mkpụrụ nke puru, too ogologo, ma jiri nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ.a—Mak 4:26-29.

12. Ruo ókè hà aṅaa ka Oziọma Jọn nyekwuru ihe ọmụma?

12 E nwekwara Oziọma Jọn, nke e dere ihe karịrị 30 afọ mgbe Mak desịrị ihe ndekọ ya. Lee ìgwè ìhè Jọn mụkwasịrị n’ije ozi Jisọs, karịsịa banyere ọtụtụ izo aka o zoro n’ịdị adị Ya tupu ọ ghọọ mmadụ! Ọ bụ nanị Jọn nyere akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ Lazarọs, ọ bụkwa nanị ya nyere anyị ọtụtụ okwu ọma ndị Jisọs gwara ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi tinyere ekpere ya na-ekpo obi ọkụ n’abalị ahụ a raara ya nye, dị ka e dekọrọ n’isi nke 13 ruo 17. N’ezie, e kwuru na 92 pasent nke Oziọma Jọn pụrụ iche.

Mgbukepụ nke Ìhè n’Akwụkwọ Ozi Ndị Pọl Dere

13. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị jiworo lee akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom anya dị ka à ga-asị na ọ bụ Oziọma?

13 E jiri Pọl onyeozi mee ihe karịsịa n’iweta mgbukepụ ìhè nke eziokwu nye ndị Kraịst dịrị ndụ n’oge ndị ozi. Dị ka ihe atụ, e nwere akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, bụ́ nke e dere n’ihe dị ka 56 O.A.—ihe dị nnọọ ka n’otu oge ahụ Luk dere Oziọma ya. N’akwụkwọ ozi a Pọl mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè na a na-agụ mmadụ n’onye ezi omume n’ihi amara Chineke na-erughịrị mmadụ na site n’okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ. Mmesi ihe ike nke Pọl mesiri akụkụ nke a nke ozi ọma ahụ emewo ka ụfọdụ ndị lee akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom anya dị ka Oziọma nke ise.

14-16. (a) N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kraịst na Kọrint, ìhè dị aṅaa ka Pọl mụkwasịrị ná mkpa ọ dị ịdị n’otu? (b) Ihe ọmụma ọzọ dị aṅaa banyere àgwà dị ná Ndị Kọrint nke Mbụ?

14 Pọl dere banyere ihe ụfọdụ na-enye ndị Kraịst nọ na Kọrint nsogbu. Akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint na-agụnye ndụmọdụ dị ukwuu sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke bawooro ndị Kraịst uru ruo ụbọchị anyị. Iji malite, o mere ka ndị Kọrint mata ihe ha na-emehie n’iguzobe ụfọdụ mmadụ dị ka chi. Onyeozi ahụ mere ka ha guzozie, jiri anya ike na-agwa ha, sị: “Ụmụnna m, esitere m n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rịọ unu, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu; kama ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.”—1 Ndị Kọrint 1:10-15.

15 A na-ekwere ka omume rụrụ arụ jọgburu onwe ya dịrị n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ na Kọrint. Otu nwoke n’ebe ahụ akpọrọwo nwunye nna ya, si otú a na-akwa “aha ịkwa iko nke na-adịghịkwa ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ.” Hoo haa, Pọl dere, sị: “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 5:1, 11-13) Nke ahụ bụụrụ ọgbakọ ndị Kraịst ahụ ihe ọhụrụ—ịchụpụ mmadụ. Ọnọdụ ọzọ nke ọ dị mkpa ka e mee ka ọgbakọ Kọrint nwee ihe ọmụma ya bụ banyere eziokwu ahụ bụ na ụfọdụ n’ime ndị òtù ya na-akpọrọ ụmụnna ime mmụọ ha na-eje ụlọ ikpe ndị ụwa iji dozie esemokwu. Pọl basiiri ha mbá ike maka ime nke a.—1 Ndị Kọrint 6:5-8.

16 Ihe ọzọkwa tiri ọgbakọ dị na Kọrint ihe otiti bụ banyere mmekọahụ. Ná 1 Ndị Kọrint isi nke 7, Pọl gosiri na n’ihi ụba nke omume mmekọahụ rụrụ arụ, ọ ga-adị mma ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya na nwanyị ọ bụla di nke ya. Pọl gosikwara na ọ bụ ezie na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ijere Jehova ozi n’enwekebeghị ihe ndọpụ uche, ọ bụghị mmadụ nile nwere onyinye nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụkwa na di nwanyị anwụọ, ọ ga-enwere onwe ya ịlụ di ọzọ ma “ọ bụ nanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:39.

17. Ìhè dị aṅaa ka Pọl mụkwasịrị n’ozizi nke mbilite n’ọnwụ?

17 Lee mgbukepụ ìhè nke Onyenwe anyị jiri Pọl mụkwasị ná mbilite n’ọnwụ! Ahụ dị aṅaa ka a ga-eji kpọlite ndị Kraịst e tere mmadụ? “A na-agha ya ahụ nke mkpụrụ obi na-achị; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie ahụ nke Mmụọ dị n’ime ya na-achị,” ka Pọl dere. Ọ dịghị anụ ahụ a ga-akpọje eluigwe, n’ihi na “anụ ahụ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke.” Pọl kwukwara na ọ bụghị ndị nile e tere mmanụ ga-ada n’ụra ọnwụ, kama n’ọnụnọ Jisọs a ga-akpọlite ụfọdụ ịba ná ndụ anwụghị anwụ ozugbo ha nwụrụ.—1 Ndị Kọrint 15:43-53.

18. Ìhè dị aṅaa banyere ọdịnihu dị n’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Tesalọnaịka?

18 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka, e ji Pọl mee ihe ịmụkwasị ìhè n’ọdịnihu. Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi n’abalị. Pọl kọwakwara, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ ná mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3.

19, 20 Mgbukepụ ìhè dị aṅaa ka ndị Kraịst nọ na Jerusalem na Judia nwetara n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru?

19 Site n’idegara ndị Hibru akwụkwọ ozi ya, Pọl mere ka ìhè mụkwasị ndị Kraịst mbụ na Jerusalem na Judia. Lee ụzọ dị ike o si gosi ọkịka nke usoro ife ofufe nke ndị Kraịst n’ebe usoro ife ofufe dị ka iwu Mosis dị! Kama ịgbaso Iwu nke e nyefere site n’aka ndị mmụọ ozi, ndị Kraịst nwere okwukwe ná nzọpụta nke Ọkpara Chineke buru ụzọ kwupụta, bụ́ onye dị ukwuu karịa ndị ozi dị otú ahụ bụ́ ndị mmụọ ozi. (Ndị Hibru 2:2-4) Mosis bụ onye ozi nkịtị n’ụlọ Chineke. Otú ọ dị, Jisọs Kraịst bụ onye isi oche nke ụlọ ahụ dum. Kraịst bụ onye isi nchụàjà dị ka usoro nke Melkizedek si dị, na-enwe ọkwá dị elu karịa nke ndị nchụàjà nke eriri Erọn. Pọl zokwara aka na ndị Israel enweghị ike ịbanye n’izu ike Chineke n’ihi enweghị okwukwe na nnupụisi, ma ndị Kraịst na-aba n’ime ya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi na nrubeisi ha.—Ndị Hibru 3:1–4:11.

20 Mgbe ahụkwa, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ karịrị ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke ukwuu. Dị ka e bu ụzọ buo n’amụma na Jeremaịa 31:31-34, 600 afọ tupu o mee, e dewo iwu Chineke n’obi ndị ahụ nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha na-enwekwa ụtọ ezi mgbaghara nke mmehie. Kama inwe onye isi nchụàjà nke ga-achụ àjà kwa afọ maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ, ndị Kraịst nwere Jisọs Kraịst dị ka Onye Isi Nchụàjà ha, bụ́ onye na-enweghị mmehie, onye chụkwara àjà banyere mmehie nanị otu mgbe ruo mgbe nile. Kama ịba n’ebe nsọ nke e ji aka wuo iji chụọ àjà ya, ọ banyere n’eluigwe n’onwe ya, igosi onwe ya n’ihu Jehova. Ọzọkwa, àjà ụmụ anụmanụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis apụghị iwezụga mmehie kpam kpam, ma ọ́ bụghị ya a garaghị na-achụ ha kwa afọ. Ma àjà Kraịst, nke a chụrụ otu ugbo ruo mgbe nile, na-ewezụga mmehie. Ihe a nile na-amụkwasị ìhè n’ụlọ nsọ ime mmụọ ukwuu, nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ na-eje ozi n’ogige ya taa.—Jọn 10:16; Ndị Hibru 9:24-28.

21. Gịnị ka ntụle nke a gosiworo banyere mmezu nke Abụ Ọma 97:11 na Ilu 4:18 n’oge ndị ozi?

21 Oghere zuru ezu adịghị iji nye ihe atụ ndị ọzọ, dị ka mgbukepụ ìhè ndị a na-achọta n’akwụkwọ ozi ndị ahụ nke Pita onyeozi na ndị nke Jemes na Jud, bụ́ ndị na-eso ụzọ. Ma ihe ndị a kpọtụrụ aha kwesịrị izu ezu iji gosi na Abụ Ọma 97:11 na Ilu 4:18 nwere mmezu pụtara ìhè n’oge ndị ozi. Eziokwu malitere inwe ọganihu site n’ụdị na onyinyo dị iche iche gaa ná mmezu na ịbụ eziokwu dị iche iche.—Ndị Galetia 3:23-25; 4:21-26.

22. Gịnị mere mgbe ndị ozi nwụsịrị, gịnịkwa ka isiokwu na-esonu ga-egosi?

22 Mgbe ọnwụ nke ndị ozi Jisọs gasịrị na ná mmalite nke ndapụ n’ezi ofufe ahụ e buru n’amụma, ìhè nke eziokwu nwuru nnọọ ntakịrị ntakịrị. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-11) Otú ọ dị, n’ikwekọ ná nkwa Jisọs, mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị Onyenwenụ ahụ lọghachiri wee hụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ka ọ na-enye “ezinụlọ” ya nri ha n’oge ya. N’ihi ya, Jisọs Kraịst mere ohu ahụ onye isi “ihe nile o nwere.” (Matiu 24:45-47) Mgbukepụ ìhè ndị dị aṅaa sochiri? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ala n’ebe a na-ezo aka n’ọnọdụ nke onye Kraịst na-ahọrọ ịkụnye àgwà nke ụdị onye mmadụ bụ n’ime ya.—Lee Ụlọ Nche, December 15, 1980, peji nke 22-23.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Akụkụ Bible ndị dị aṅaa na-egosi na nghọta nke eziokwu na-aga n’ihu n’ihu?

◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime mgbukepụ nke ìhè ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi?

◻ Ìhè dị aṅaa ka a na-achọta n’Oziọma ndị ahụ?

◻ Olee mgbukepụ nke ìhè ndị dị n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya