Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Ezie Nye Gị?
MGBE ị na-enwe nsogbu ndị na-akpata mwute, ị̀ na-ejekwuru Chineke n’ekpere ozugbo? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-enwe mmetụta na ị na-agwa onye dị adị n’ezie okwu?
N’izo aka n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ, Jisọs Kraịst sịrị: “Onye zitere m bụ ezi Onye.” (Jọn 7:28) Ee, Jehova Chineke dị adị n’ezie, ikpegakwara ya ekpere dị ka ichigharịkwuru ezi enyi bụ́ mmadụ maka enyemaka ma ọ bụ ndụmọdụ. N’ezie, iji bụrụ ndị Chineke nụrụ ekpere ha, ekpere anyị aghaghị iru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ekpere a na-anara nke ọma. Dị ka ihe atụ, anyị aghaghị iji obi umeala jekwuru “Onye na-anụ ekpere” n’aha Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Abụ Ọma 65:2; 138:6; Jọn 14:6.
Ụfọdụ pụrụ iche na n’ihi na a pụghị ịhụ Chineke anya, na ọ bụghị onye. Nye ha, Chineke pụrụ iyi ihe na-adịghị adị. Ọbụna ụfọdụ ndị Kraịst, bụ́ ndị mụworo banyere àgwà ndị dị ebube nke Chineke, pụrụ inwe ihe isi ike mgbe ụfọdụ ịghọta otú ọ dịruru adị n’ezie. Nke a ò mewo gị? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị pụrụ inye aka ime ka Jehova Chineke dịrị adị n’ezie nye gị?
Mụọ Akwụkwọ Nsọ
Ị̀ na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya? Ka ọmụmụ Bible gị na-abụ nke ị na-enwechikwu anya nakwa nke na-asakwu mbara, otú ahụ ka Jehova Chineke ga-adịkwu adị n’ezie nye gị. Okwukwe gị ga-esi otú ahụ sikwuo ike, na-enyeziri gị aka ‘ịhụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya.’ (Ndị Hibru 11:6, 27) N’aka nke ọzọ, ọmụmụ Bible a na-adịghị enwechi anya eyighị ka ọ ga-enwe mmetụta pụtara ìhè n’okwukwe gị.
Iji maa atụ: Ka e were ya na dọkịta gị gwara gị ka i tee otu ọgwụ otite ugboro abụọ kwa ụbọchị iji wepụ ọkọ na-achọghị ila ala. Ọkọ gị ọ̀ ga-apụ ma ọ bụrụ na i tee ọgwụ otite ahụ nanị otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ kwa ọnwa? O yighị ka ọ ga-apụ. N’otu aka ahụ, ọbụ abụ ahụ na-enye anyị “ihe ndepụta” maka ahụ ike ime mmụọ. Gụọ Okwu Chineke “ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Iji nweta abamuru na-amụbawanye amụbawanye, ọ dị anyị mkpa ịgbaso “ihe ndepụta” ahụ—ịtụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst.—Joshua 1:8.
Ị̀ ga-achọ ime ka oge ọmụmụ ihe gị bụrụ nke na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike? Lee otu aro: Mgbe ị gụsịrị otu isiakwụkwọ na New World Translation of the Holy Scriptures ma ọ bụ Bible ọzọ nwere ntụaka, họrọ otu amaokwu masịrị gị ma chọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Nke a ga-eme ka ọmụmụ ihe gị dịkwuo ụtọ, obi abụọ adịghịkwa ya na nkwekọrịta dị n’ime Bible ga-amasị gị. N’aka nke ya, nke a ga-eme ka Onye Dere ya, bụ́ Jehova Chineke, dịkwuo adị n’ezie nye gị.
Iji ntụaka eme ihe pụrụ imekwa ka ị mara amụma Bible dị iche iche na mmezu ha nke ọma. Ikekwe ị maara amụma Bible ndị bụ́ isi nke ọma, dị ka ndị ahụ metụtara mbibi Jerusalem site n’aka ndị Babilọn. Ma, Bible nwere usoro amụma ndị nwere nkwekọ na mmezu ha. A machaghị ụfọdụ n’ime ndị a nke ọma.
Dị ka ihe atụ, gụọ amụma banyere ahụhụ maka iwughachi Jeriko ma tụlezie mmezu ya. Joshua 6:26 na-ekwu, sị: “Joshua wee gbaa ha iyi na mgbe ahụ, sị, Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ n’ihu Jehova, nke ga-ebili wuo obodo Jeriko a: ọkpara ya ka ọ ga-ewere tọọ ntọala ya, nwa nwoke ya nke nta ka ọ ga-ewerekwa guzo ọnụ ụzọ ama ya ọtọ.” Mmezu ya bịara n’ihe dị ka afọ 500 n’ihu, n’ihi na anyị na-agụ ná 1 Ndị Eze 16:34, sị: “N’ụbọchị [Eze Ehab] ka Hiel, bụ́ onye Betel, wuru Jeriko: Abaịram, bụ́ ọkpara ya, ka o weere tọọ ntọala ya; Segub, bụ́ nwa ya nwoke nke nta ka o weerekwa guzo ọnụ ụzọ ama ya ọtọ; dị ka okwu Jehova si dị, nke O kwuru n’aka Joshua nwa Nun.”a Nanị Chineke dị adị n’ezie pụrụ ime ka e buo amụma ndị dị otú ahụ ma hụ na ha mezuru.
Ka ị na-agụ Bible, ị pụrụ ịchọ ịmata banyere otu isi ihe. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ iche afọ ole gafere site ná mgbe e buru otu amụma ruo mgbe o mezuru. Kama nnọọ ịjụwa mmadụ, gịnị ma i tinye mgbalị ịchọpụta n’onwe gị? N’iji chaatị na ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible, jiri ịdị uchu chọpụta azịza ha dị ka ị ga-agbalị ịghọta map na-egosi ebe akụ̀ dị oké ọnụ ahịa dị. (Ilu 2:4, 5) Ịchọpụta azịza ha ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’okwukwe gị, ọ ga-emekwa ka Jehova Chineke dịkwuo adị n’ezie nye gị.
Kpesie Ekpere Ike Mgbe Nile
Elegharala mkpa nke ekpere na okwukwe anya. Ndị na-eso ụzọ Jisọs rịọrọ arịrịọ a gara kpọmkwem, sị: “Tụkwasịrị anyị okwukwe.” (Luk 17:5) Ọ bụrụ na Jehova eyibeghị onye dị adị n’ezie nye gị, gịnị ma ị rịọ ya banyere mkpa ọ dị gị inwekwu okwukwe? Jiri obi ike rịọ Nna gị nke eluigwe maka enyemaka ya n’ime ka ya onwe ya dị adị n’ezie nye gị.
Ọ bụrụ na i nwere nsogbu, wepụta oge dị mkpa iji gwa Enyi gị nke eluigwe banyere ya n’ụzọ si n’obi. Mgbe Jisọs na-eche ọnwụ ihu, o kpesiri ekpere ike. Ọ bụ ezie na ọ katọrọ omume okpukpe nke ikpe ogologo ekpere iji gosipụta onwe n’ihu ọha, o jiri otu abalị dum kpee ekpere n’onwe ya tupu ọ họpụta ndị ozi 12 ya. (Mak 12:38-40; Luk 6:12-16) Anyị pụkwara ịmụta ihe n’aka Hana, bụ́ onye ghọrọ nne nke Samuel onye amụma. N’ịbụ onye na-achọsi nwa nwoke ike, “o kpere ọtụtụ ekpere n’ihu Jehova.”—1 Samuel 1:12.
Gịnị bụ ihe mmụta bụ́ isi n’ihe ndị a nile? Ọ bụrụ na i nwere olileanya inweta azịza nye ekpere gị, ị ghaghị ikpe ekpere n’ịdị uchu, n’ịnọsi ike, n’esepụghị aka—n’ụzọ kwekọkwara n’ezie n’uche Chineke. (Luk 22:44; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; 1 Jọn 5:13-15) Ime nke a ga-enye aka ime ka Chineke dị adị n’ezie nye gị.
Kirie Ihe E Kere Eke
Ihe onye na-ese ihe sere pụrụ ikpughe ụdị onye ọ bụ. N’otu aka ahụ, a na-ahụ ‘àgwà anya na-adịghị ahụ’ nke Jehova, bụ́ Onye Mere na Onye Okike nke eluigwe na ụwa, nke ọma n’ihe e kere eke. (Ndị Rom 1:20) Mgbe anyị ji nlezianya kirie ọrụ aka Jehova, anyị na-enweta nghọta ka mma banyere ụdị onye ọ bụ, ọ ga-esikwa otú ahụ aghọkwu onye dị adị n’ezie nye anyị.
Ọ bụrụ na i jiri nlezianya kirie ihe ndị Chineke kere, ịdị adị n’ezie nke àgwà ya dị iche iche pụrụ ịmasị gị n’ụzọ miri emi. Dị ka ihe atụ, ihe ọmụma banyere ikike ife efe nke nnụnụ pụrụ ime ka nghọta gị banyere amamihe Jehova dịkwuo nnọọ ukwuu. N’ịgụ banyere mbara igwe, ị pụrụ ịmụta na Milky Way, nke na-ewe ihe dị ka 100,000 afọ, dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ìhè si dị, isite n’otu akụkụ gbafee n’ọzọ, bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị na gburugburu mbara igwe. Nke ahụ ọ́ dịghị eme ka i nwee mmetụta nke ịdị adị nke amamihe nke Onye Okike?
N’ezie, amamihe Jehova dị adị n’ezie! Ma gịnị ka nke ahụ pụtara nye gị? N’ezie idozi nsogbu ndị onye ọ bụla n’ime anyị na-ebugara ya n’ekpere apụghị isiri ya ike. Ee, ọbụna ntakịrị ihe ọmụma banyere ihe e kere eke pụrụ ime ka Jehova dịkwuo adị n’ezie nye gị.
Soro Jehova Na-ejegharị
Ị̀ pụrụ ịchọpụta n’onwe gị otú Jehova dịruru adị n’ezie? Ee, ma ọ bụrụ na ị dị ka nna ochie ahụ bụ́ Noa. O rubeere Jehova isi mgbe nile, ruo n’ókè dị ukwuu nke na a pụrụ ịsị: “Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:9) Noa biri ndụ dị ka a ga-asị na Jehova nọ ya nnọọ n’akụkụ. Chineke pụrụ ịdị adị otú ahụ nye gị.
Ọ bụrụ na i so Chineke na-ejegharị, ị na-atụkwasị nkwa ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ obi ma na-eme ihe ndị kwekọrọ na ha. Dị ka ihe atụ, ị na-ekwere okwu Jisọs, bụ́: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a [ihe onwunwe ndị dị mkpa] nile.” (Matiu 6:25-33) N’ezie, Jehova nwere ike ọ gaghị enye gị ihe ị chọrọ n’ụzọ i si tụọ anya ya mgbe nile. Ma, mgbe i kpere ekpere ma nwetazie enyemaka Chineke, ọ ga-adị adị n’ezie nye gị dị nnọọ ka onye ọ bụla nọ gị n’akụkụ.
Mmekọrịta chiri anya dị otú ahụ n’ebe Jehova nọ na-etolite ka mmadụ nọgidere soro Chineke na-ejegharị. Tụlee Manuela, bụ́ otu Onyeàmà na-asụ Spanish, onye tachiworo obi n’ọtụtụ ọnwụnwa. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla m nwere nsogbu ma ọ bụ nọrọ ná mkpa, etinyewo m ụkpụrụ dị n’Ilu 18:10 n’ọrụ. Ana m agbakwuru Jehova maka enyemaka. Ọ nọgidewo na-abụ ‘ụlọ elu dị ike’ nye m.” Manuela pụrụ ikwu nke a mgbe afọ 36 nke ịdabere na Jehova na inweta nkwado ya gasịrị.
Ị̀ ka na-amalite amalite ime Jehova obi ike gị? Adala mbà ma ọ bụrụ na mmekọrịta gị na ya abụbeghị ihe ị chọrọ ka ọ bụrụ. Na-adị ndụ kwa ụbọchị dị ka onye ya na Chineke so na-ejegharị. Ka ị na-ewulite ụzọ ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi, gị na Jehova ga-enwe mmekọrịta chikwuru anya.—Abụ Ọma 25:14; Ilu 3:26, 32.
Ụzọ ọzọ isi soro Chineke na-ejegharị bụ imikpu onwe gị n’ozi ya. Mgbe ị nọ n’ọrụ nkwusa Alaeze, ị bụ onye ya na Jehova na-arụkọ ọrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9) Ịmara nke a na-enye aka ime ka Chineke dịrị nnọọ adị n’ezie nye gị.
Ọbụ abụ ahụ na-agba ume, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) Adala ma ọlị n’ịtụkwasị Chineke ibu arọ ma ọ bụ nchegbu ọ bụla i nwere. Na-elegara ya anya mgbe nile maka enyemaka na nduzi. Ọ bụrụ na i jiri ekpere dabere na Jehova Chineke ma na-atụkwasị ya obi mgbe nile n’enweghị obi abụọ, ị ga-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’ihi na ị maara na ọ gaghị ada imere gị ihe. Ị̀ na-enwe obi ike mgbe ị na-eji nchegbu gị nile ejekwuru Jehova? Ị ga-enwe—ma ọ bụrụ na Chineke dị adị n’ezie nye gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ ọzọ, gụọ banyere mmerụ nke ebe ịchụàjà Jeroboam nke e buru n’amụma ná 1 Ndị Eze 13:1-3. Rịbazie mmezu ya e dekọrọ ná 2 Ndị Eze 23:16-18 ama.
[Foto dị na peeji nke 21]
Mee ka oge ọmụmụ ihe gị bụrụ nke na-ewusi okwukwe ike
[Foto dị na peeji nke 22]
Wepụta oge maka ikpesi ekpere ike mgbe nile
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Kirie otú àgwà Chineke si pụta ìhè n’ihe e kere eke
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Hummingbird: U.S. Fish and Wildlife Service, Washington, D.C./Dean Biggins; kpakpando: Photo: Copyright IAC/RGO 1991, Dr. D. Malin et al, Isaac Newton Telescope, Roque de los Muchachos Observatory, La Palma, Canary Islands