Ikwu Okwu Ụgwọ Isi Nwanyị Ezi Uche Dị na Ya
TAA, dịkwa ka n’oge Bible, ụfọdụ ọdịbendị na-achọ ka a kwụọ ụgwọ isi nwanyị tupu nwoke enwee ike ịlụrụ nwanyị. “M ga-efe gị afọ asaa n’ihi Rechel, bụ́ nwa gị nwanyị nke nta,” ka Jekọb gwara onye gaje ịbụ nna nwunye ya, bụ́ Leban. (Jenesis 29:18) N’ihi ịhụnanya Jekọb nwere n’ebe Rechel nọ, o kwuru ka ya kwụọ ụgwọ dị elu—ihe ya na ụgwọ ọnwa afọ asaa hà nhata! Leban nakweere ihe ahụ ọ sịrị na ya ga-akwụ ma ghọgbuo Jekọb gaa n’ibu ụzọ lụọ ada ya, bụ́ Lia. Ihe ndị ọzọ Leban sooro Jekọb mekọọ nọgidere bụrụ nke aghụghọ. (Jenesis 31:41) Oké ihe Leban ji uru ihe onwunwe kpọrọ mere ka ụmụ ya ndị inyom gharazie inwe nsọpụrụ n’ebe ọ nọ. “Ọ́ bụghị ná ndị ala ọzọ ka ọ gụworo anyị? n’ihi na o rewo anyị, ripịasịakwa ego anyị” ka ha jụrụ.—Jenesis 31:15.
N’ụzọ dị mwute, n’ụwa taa nke ji ihe onwunwe kpọrọ oké ihe, ọtụtụ nne na nna dị ka Leban. Ụfọdụ kwa dị nnọọ njọ karịa ya. Dị ka otu akwụkwọ akụkọ Africa si kwuo, a na-ekwu okwu alụmdi na nwunye ụfọdụ “nanị ka ndị nna dị anyaukwu nweta uru.” Ihe ọzọ bụ nrụgide nke ọnọdụ akụ̀ na ụba nke na-eduga ụfọdụ ndị nne na nna n’ile ụmụ ha ndị inyom anya dị ka ụzọ a ga-esi belata nsogbu ego.a
Ụfọdụ ndị nne na nna na-ejighachi ụmụ ha ndị nwanyị azụ ịlụ di n’ihi na ha na-eche onye ga-ekwekarịcha ọnụ. Nke a pụrụ iweta nsogbu ndị siri ike. Onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ bụ́ onye nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Africa dere, sị: “Ndị na-eto eto na-ahọrọ ịgbafu gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye iji gbanahụ ụgwọ isi gabigara ókè nke ndị ọgọ kpọrọ ekwe nkụ na-asị ka a kwụọ.” Mmekọahụ rụrụ arụ bụ otu n’ime nsogbu ndị ịsị ka a kwụọ ụgwọ isi nwanyị dị elu na-akpata. Ọzọkwa, ụfọdụ ụmụ okorobịa na-ejisi ike zụta nwunye ma nọrọzie n’oké ụgwọ. “Ndị nne na nna kwesịrị iji ezi uche mee ihe,” ka otu onye South Africa na-arụ ọrụ ebere gbara ume. “Ha ekwesịghị ịsị ka a kwụọ ego dị elu. Di na nwunye ahụ lụrụ ọhụrụ ga-adịnụ ndụ . . . Ya mere n’ihi gịnị ka a ga-eji mịkọrọ ego nwa okorobịa a?”
Olee otú ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi setịpụ ihe nlereanya nke inwe ezi uche mgbe ha na-ekwu okwu maka ịkwụ ma ọ bụ ịnata ụgwọ isi nwanyị? Okwu a dị oké mkpa, n’ihi na Bible na-enye iwu, sị: “Meenụ ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] unu.”—Ndị Filipaị 4:5.
Ụkpụrụ Bible Ndị Ezi Uche Dị na Ha
Ma nne na nna bụ́ ndị Kraịst hà kpebiri ikwu okwu ụgwọ isi nwanyị ma ọ bụ na hà emeghị otú ahụ bụ mkpebi aka ha. Ọ bụrụ na ha ahọrọ ime otú ahụ, e kwesịrị ikwu okwu ndị ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego,” ka Okwu Chineke na-ekwu. (Ndị Hibru 13:5) Ọ bụrụ na ụkpụrụ a apụtaghị ìhè n’okwu alụmdi na nwunye, nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst pụrụ ịdị na-egosi na ya abụghị ezi ihe nlereanya. Ndị ikom nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst ga-enwe “ezi uche,” (NW) ọ bụghị ‘ndị na-ahụ ego n’anya’ ma ọ bụ ‘ndị akpịrị uru nke na-eweta ihere na-akpọ nkụ.’ (1 Timoti 3:3, 8) A pụrụ ọbụna ịchụpụ onye Kraịst nke na-eji anyaukwu anara ụgwọ isi nwanyị dị elu, nke na-echegharịghịkwa, n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 5:11, 13; 6:9, 10.
N’ihi nsogbu ndị anyaukwu kpatara, gọọmenti ụfọdụ emewo iwu ndị kpaara ụgwọ isi nwanyị ókè. Dị ka ihe atụ, otu iwu e mere ná mba Ọdịda Anyanwụ Africa bụ́ Togo na-ekwu na ‘a pụrụ ịkwụ ụgwọ isi nwanyị n’ụzọ inye ihe ma ọ bụ n’ego ma ọ bụ n’ụzọ abụọ ahụ.’ Iwu ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ọ dịghị n’ọnọdụ ọnụ ego ahụ ga-akarị 10,000 F CFA (US$20.00).” Ugboro ugboro, Bible na-enye ndị Kraịst iwu ịbụ ndị amaala na-erube isi n’iwu. (Taịtọs 3:1) Ọbụna ọ bụrụ na gọọmenti amanyeghị mmadụ irube isi n’iwu dị otú ahụ, ezi onye Kraịst ga-achọ irube isi. Ọ ga-esi otú ahụ nwee ezi akọ na uche n’ihu Chineke, ọ gaghịkwa abụ onye na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—Ndị Rom 13:1, 5; 1 Ndị Kọrint 10:32, 33.
Ònye Ka Ọ Dị n’Ubu Ikwu Okwu Ụgwọ Isi Nwanyị?
N’ọdịbendị ụfọdụ, otú e si ekwu okwu ụgwọ isi nwanyị pụrụ imegide ụkpụrụ ọzọ dị mkpa. Dị ka Bible si kwuo, ihe omume ezinụlọ dị n’ubu nna. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Kọlọsi 3:18, 20) N’ihi ya, ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ga-abụ ndị “na-achị ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma.”—1 Timoti 3:12.
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ ihe a na-ahụkarị n’ógbè ụfọdụ ịhapụ okwu alụmdi na nwunye ndị dị mkpa n’aka ndị ikwu nke onyeisi ezinụlọ. Ndị ikwu a na-achọkwa òkè n’ụgwọ isi nwanyị ahụ. Nke a na-ewetara ezinụlọ ndị Kraịst ule. N’aha omenala, ụfọdụ ndị isi ezinụlọ na-ekwere ka ndị ikwu ha na-ekweghị ekwe bulie ụgwọ isi nwanyị elu. Nke a mgbe ụfọdụ edugawo na nwa agbọghọ bụ́ onye Kraịst ịlụ onye na-ekweghị ekwe. Nke ahụ megidere ndụmọdụ bụ́ na ndị Kraịst kwesịrị ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) A pụghị ile onyeisi ezinụlọ nke hapụrụ ka ndị ikwu ya na-ekweghị ekwe mee mkpebi ndị na-emerụ ahụ nye ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ya anya dị ka “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma.”—1 Timoti 3:4.
Dị ka ọ dị n’ebe nna ochie ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Abraham nọ, gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst bụ́ nna ekereghị òkè kpọmkwem n’okwu ọlụlụ nke otu n’ime ụmụ ya? (Jenesis 24:2-4) Ọ bụrụ na a họpụtara onye ọzọ ime nke a, onye Kraịst ahụ bụ́ nna kwesịrị ijide n’aka na onye ahụ na-ekwu okwu nwanyị ahụ na-agbaso ntụziaka ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha nke Bible. Ọzọkwa, tupu e mee ihe ọ bụla iji kwuo okwu ụgwọ isi nwanyị, nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị iji nlezianya chebara okwu dị iche iche echiche ma ghara ikwe ka omenala ma ọ bụ ọchịchọ ndị ezi uche na-adịghị na ha bufuo ha.—Ilu 22:3.
Izere Àgwà Ndị Na-abụghị nke Ndị Kraịst
Bible na-akatọ nganga na “oké okwu nke ibi obi.” (1 Jọn 2:16; Ilu 21:4) Ma, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst egosipụtawo àgwà ndị a n’ikwu okwu alụmdi na nwunye ha. Ụfọdụ na-eṅomi ụwa site n’ime ka ndị ọzọ hụ ọkwụkwụ ma ọ bụ nnata nke ụgwọ isi nwanyị buru ibu. N’aka nke ọzọ, otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Africa kọrọ, sị: “Ụfọdụ ndị bụ́ di egosibeghị nkwanye ùgwù mgbe ezinụlọ gosipụtara ezi uche n’ihe ha sịrị ka a kwụọ, na-ele nwunye ha anya dị ka onye e ji ego ‘ewu’ zụta.”
Anyaukwu maka ụgwọ isi nwanyị dị elu ejidewo ụfọdụ ndị Kraịst aka, o dugawokwa n’ọdachi. Dị ka ihe atụ, tụlee akụkọ a sitere n’alaka ụlọ ọrụ ọzọ nke Watch Tower Society: “Ọ na-ara nnọọ ụmụnna nwoke ndị na-alụbeghị nwunye ahụ ịlụ nwunye ma ọ bụ ụmụnna nwanyị ịchọta di. Ihe ọ na-akpata bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke nchụpụ n’ọgbakọ n’ihi mmekọahụ rụrụ arụ. Ụfọdụ ụmụnna nwoke na-aga ebe a na-egwupụta ihe na-achọ ọlaedo ma ọ bụ diamọnd ndị ha pụrụ ire iji nwetazuo ego iji lụọ nwunye. Nke a pụrụ iwe ha otu afọ ma ọ bụ abụọ ma ọ bụ karịa, ha na-adakarịkwa mbà n’ụzọ ime mmụọ ka ha na-ahapụ mkpakọrịta ha na ụmụnna na ọgbakọ.”
Iji zere ajọ ihe ndị a na-esi na ya apụta, nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya nke ndị tozuru okè n’ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ mụghị nwa, Pọl onyeozi gosiri ezi uche ná mmekọrịta ya na ndị kwere ekwe ibe ya. Ọ kpachapụrụ anya izere ibo onye ọ bụla oké ibu arọ. (Ọrụ 20:33) N’ezie, nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịtụle ihe nlereanya ya ọchịchọ onwe onye nanị na-adịghị na ya mgbe ha na-abanye n’ikwu okwu ụgwọ isi nwanyị. N’ezie, mmụọ nsọ Chineke kpaliri Pọl ide, sị: “Ụmụnna m, dịnụ n’otu n’iṅomi m, na-elekwanụ ndị na-ejegharị otú a, otú unu nwere anyị dị ka ihe atụ.”—Ndị Filipaị 3:17.
Ihe Nlereanya nke Inwe Ezi Uche
Mgbe a bịara n’ihe banyere okwu alụmdi na nwunye, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst esetịpụwo ezi ihe nlereanya nke inwe ezi uche. Tụlee ihe banyere Joseph na nwunye ya, bụ́ Mae, ndị na-eje ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile.b Ha bi n’otu n’ime Solomon Islands ebe okwu ụgwọ isi nwanyị na-abụ nsogbu mgbe ụfodụ. Iji zere ihe isi ike ndị dị otú ahụ, Joseph na Mae mere ndokwa ka nwa ha nwanyị bụ́ Helen lụọ di n’àgwàetiti ọzọ dị ha nso. Ha mekwara otú ihe ahụ maka nwa ha nwanyị nke ọzọ, bụ́ Esther. Joseph kwekwara ka di nwa ya bụ́ Peter kwụọ ụgwọ isi nwanyị dị nnọọ ala. Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji mee ihe a, Joseph kọwara, sị: “Achọghị m ibo di nwa m onye bụ́ ọsụ ụzọ ibu arọ.”
Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova bi n’Africa esetịpụwokwa ezi ihe nlereanya nke inwe ezi uche. N’ebe ụfọdụ, ndị òtù nke ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ n’ozuzu ha na-atụ anya ka e buru ụzọ kwụọ ego buru nnọọ ibu tupu e kwuwazie okwu banyere nke bụ ezigbo ụgwọ isi nwanyị. Ijikwa nweta nwunye, a pụrụ ịchọ ka nwoke ahụ chọrọ ịlụ nwunye kwe nkwa na ya ga-akwụchitere nwanne nwoke nke nwa agbọghọ ahụ ọ chọrọ ịlụ ụgwọ isi nwanyị ya n’ọdịnihu.
N’ụzọ dị iche, tụlee ihe atụ nke Kossi na nwunye ya, bụ́ Mara. Nwa ha nwanyị, bụ́ Beboko, lụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova na nso nso a. Tupu alụmdi na nwunye ahụ, ndị ikwu kwanyere nne na nna ya ọkụ n’ahụ maka òkè ha nke ụgwọ isi nwanyị buru ibu. Otú ọ dị, di na nwunye ahụ kwụụrụ chịm ma ghara ime ihe ahụ a sịrị ha mee. Kama nke ahụ, ha sooro onye gaje ịbụ di nwa ha kwurịta ya ihu na ihu, na-asị ka a kwụọ ụgwọ dị ala n’isi nwa ha nwanyị, na-enyeghachizikwa di na nwunye ahụ otu ọkara nke ụgwọ ahụ ka ha were mee ndokwa maka ụbọchị agbamakwụkwọ ha.
Ihe nlereanya ọzọ e nwere n’otu mba ahụ metụtara otu Onyeàmà na-eto eto aha ya bụ Itongo. Na mbụ, ezinụlọ ya sịrị ka a kwụọ ụgwọ isi nwanyị ezi uche dị na ya. Ma ndị ikwu kwuru ka e tinyekwuo ihe n’ego ahụ. Okwu biiri ọkụ, ya eyiekwa ka ndị ikwu a hà ga-enweta ihe ha na-achọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-enweghị anyaike, Itongo guzoro ọtọ ma jiri nkwanye ùgwù kwuo na ya ekpebisiwo ike ịlụ onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi aha ya bụ́ Sanze, dị ka ihe e dokwaworo si dị. Mgbe ahụ, o ji obi ike kwuo, sị: “Mbi ke” (nke pụtara, “Okwu ebiela”) wee nọdụ ala. Nne ya bụ́ onye Kraịst, bụ́ Sambeko dụnyeere ya úkwù. E kwughịzi okwu ahụ ọzọ, mmadụ abụọ ahụ lụkwara dị ka e meburu atụmatụ ya.
E nwere ihe ndị na-echegbu nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-ahụ n’anya karịa nnọọ uru onwe onye nke ụgwọ isi nwanyị. Otu onye bụ́ di bi na Cameroon na-akọwa, sị: “Nne nwunye m na-agwa m mgbe nile na ihe ọ bụla m chọrọ inye ya dị ka ụgwọ isi nwanyị, ka m were ya lekọta mkpa nwa ya nwanyị.” Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-enwekwa nchegbu banyere ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ha. Dị ka ihe atụ, tụlee Farai na Rudo, bụ́ ndị bi na Zimbabwe ma na-etinye oge dị ukwuu n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ọ bụ ezie na ha adịghị anata ụgwọ ọnwa, ha kere ụmụ ha ndị inyom abụọ di na-anara ihe dị nnọọ ala karịa ihe a na-asịkarị ka a kwụọ. Gịnị mere ha ji mee otú ahụ? Ha chọrọ ka ụmụ ha ndị inyom rite uru site n’ịlụ ndị ikom hụrụ Jehova anya n’ezie. “Ihe anyị weere dị ka ihe ka mkpa bụ ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụ anyị ndị inyom na di ụmụ anyị,” ka ha kọwara. Lee otú o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ! Ndị ọgọ na-egosi nchegbu ịhụnanya maka ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ụmụ ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịbụ ndị a jara mma nke ukwuu.
Uru nke Inwe Ezi Uche
A gọziri Joseph na Mae bụ́ ndị bi na Solomon Islands n’ihi ụzọ mmesapụ aka na nlezianya ha ji hụ banyere alụmdi ụmụ ha ndị inyom. N’ihi ya, di ụmụ ha ekoghị ụgwọ. Kama nke ahụ, di na nwunye abụọ ahụ enwewo ike itinye ọtụtụ afọ n’ọrụ oge nile nke ịgbasa ozi Alaeze ahụ. N’ileghachi anya azụ, Joseph na-asị: “Mkpebi ndị mụ na ezinụlọ m meworo arụpụtawo ngọzi dị ukwuu. N’ezie, mgbe ụfọdụ e nwere nrụgide dị ukwuu site n’aka ndị na-aghọtaghị, ma enwere m akọ na uche dị mma na afọ ojuju ka m na-ahụ ụmụ m ka ha ji ọrụ n’aka ma sie ike n’ozi Jehova. Ha nwekwara obi ụtọ, mụ na nwunye m nwekwara ezigbo obi ụtọ.”
Uru ọzọ abụwo mmekọrịta dị mma n’etiti ndị ọgọ. Dị ka ihe atụ, Zondai na Sibusiso so nwunye ha, ndị bụ́ ụmụnne, na-eje ozi dị ka ndị ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Zimbabwe. Nna nwunye ha, bụ́, Dakarai, bụ onye na-ezisa ozi ọma oge nile, ọ naghịkwa anata ụgwọ ọnwa. Mgbe a na-ekwu okwu ụgwọ isi nwanyị, o kwuru na ya ga-anara ihe ọ bụla ha pụrụ ịkwụli. “Anyị hụrụ nna nwunye anyị n’anya nke ukwuu,” ka Zondai na Sibusiso na-ekwu, “anyị ga-emekwa ihe nile anyị pụrụ ime iji nyere ya aka ma ọ nọrọ ná mkpa.”
Ee, inwe ezi uche n’ikwu okwu ụgwọ isi nwanyị na-atụnye ụtụ n’obi ụtọ ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ndị ahụ ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ agaghị abanye n’ụgwọ, na-eme ka ọ dịrị ha mfe karị idozi ndụ ha ikwekọ ná ndụ alụmdi na nwunye. Nke a enyeworo ọtụtụ ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ aka ịchụso ngọzi ime mmụọ, dị ka ije ozi oge nile n’ozi ahụ dị ngwa nke ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. N’aka nke ya, nke a na-ewetara Onye Mmalite na-ahụ n’anya nke alụmdi na nwunye, bụ́ Jehova Chineke, otuto.—Matiu 24:14; 28:19, 20.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ọdịbendị ụfọdụ, a na-asọgharị ọnọdụ ahụ isi. Ndị ọgọ na-atụ anya n’aka nne na nna nke nwanyị ịkwụ ụgwọ isi nwoke.
b E ji aha nnọchianya mee ihe n’isiokwu a.
[Igbe dị na peeji nke 27]
HA WEGHACHIRI ỤGWỌ ISI NWANYỊ
N’ógbè ụfọdụ, a na-eleda nwa agbọghọ a na-alụ ọhụrụ na nne na nna ya anya ma ọ bụrụ na ụgwọ isi nwanyị adị ala. N’ihi ya, nganga na ọchịchọ igosipụta ùgwù nke ezinụlọ na-abụ mgbe ụfọdụ ebumnobi e ji asị ka a kwụọ ụgwọ dị elu. Otu ezinụlọ nọ na Lagos, Nigeria, nyere ọdịiche na-akpali akpali. Di nwa ha, bụ́ Dele, na-akọwa, sị:
“Ezinụlọ nwunye m kwụụrụ m ụgwọ ọtụtụ mmefu ndị ha na ememe ọdịnala ụgwọ isi nwanyị na-agakọ, dị ka ịzụta ụdị ákwà dị iche iche ndị dị oké ọnụ. Ọbụna mgbe ezinụlọ m nyere ha ụgwọ isi nwanyị, onye na-ekwuchitere ha okwu jụrụ, sị: ‘Unu chọrọ iwere nwa agbọghọ a dị ka nwunye ka ọ̀ bụ dị ka nwa nwanyị?’ Ezinụlọ m zaghachiri n’otu olu, sị: ‘Anyị chọrọ iwere ya dị ka nwa nwanyị.’ Mgbe nke ahụ gasịrị, e weghachiiri anyị ụgwọ isi nwanyị ahụ n’otu envelopu ahụ.
“Ruo taa, enwere m ekele n’otú ndị ọgọ m si hụ maka agbamakwụkwọ anyị. O mere ka m na-akwanyere ha ùgwù dị ukwuu. Echiche ime mmụọ ha magburu onwe ya na-eme ka m na-ewere ha dị ka ezi ndị ikwu m. O metụtakwara otú m si ele nwunye m anya n’ụzọ dị ukwuu. Azụlitewo m ekele miri emi n’ebe ọ nọ n’ihi ụzọ ezinụlọ ya si mesoo m. Mgbe anyị nwere nghọtahie, adịghị m ekwe ka ọ ghọọ nsogbu. Ozugbo m chetara ezinụlọ o si na ya, nghọtahie ahụ na-ebelata.
“E kekọtawo ezinụlọ m na nke ya n’ọbụbụenyi. Ọbụna ugbu a, afọ abụọ anyị gbasịrị akwụkwọ, nna m ka na-ezigara ezinụlọ nwunye m onyinye na ihe oriri.”